E duola Lucky Aiyedatiwa bụbụ Osote Gọvanọ iyi ọrụ dika Gọvanọ ọhụrụ Ondo Steetị n'ụlọ gọọmentị ha dị n' Alagbaka, Akure, na mgbede Wednezde.
Akeredolu bụbụ Gọvanọ steeti ahụ nwụrụ n'ụzọ ụtụtụ taa ka ọ rịachara Kansa ogologo oge.
N' ọkwu ya, Govanọ Lucky Aiyedatiwa kwuru na, “ọnwu Gọvanọ Akeredolu bụ ihe na-agbawa obi."
"Nke a bụ nnukwu ihe mgbu."
Cheta na n'abalị 12 nke ọnwa Disemba afọ 2023, Aiyedatiwa malitere ịrụ ọrụ dịka gọvanọ dịka Gọvanọ ya bụ Rotimi Akeredolu gawara ileta ahụike ya.
Aiyedatiwa arụbuola dịka Gọvanọ malite n'ọnwa Juun rue ọnwa Septemba afọ 2023 oge Akeredolu gaburu ileta ahụike ya.
Ihe ndị i kwesịrị ị ma maka Aiyedatiwa
*Onye Obe-Nla dị n'Okpuru Ọchịchị Ilaje n'Ondo steeti a mụrụ ya n'afọ 1965.
*Ọ gara akwụkwọ Pramarị n'obodo ya ma gụọ Sekọdịrị na Ikosi High School, Ketu,Legọs.
*Ọ gara kọlege maka ọzụzụ ndị nkuzi(Lagos State College of Education (nke a na-akpọ 'Adeniran Ogunsanya College of Education' ugbua) ma kuzikwa nkuzi n'ụlọakwụkwọ Reliance International Schools, Ijokodo.
*O mechara gaa mahadum University of Ibadan ebe o nwetara asambodo 'Advanced Diploma' na 'Business Administration' n'afọ 2001.
* Ọ gụrụ 'Master's Degree' na 'Business Administration (MBA) na mahadum University of Liverpool, dị na mba Briten.
Ọ bara ndọrọndọrọ Ọchịchị n'afọ 2011 dịka ọ banyere otu Action Congress of Nigeria(ACN nke mechara bụrụ APC.
N'abalị 11nke ọnwa Oktoba afọ 2020, Inec kpọpụtara ya na Akeredolu dịka Gọvanọ na osote ya.