Otu jikọrọ ndị ọrịụ Naijirịa bụ Nigerian Labour Congress(NLC)
zipụtara ozi n’ụbọchị Wenezde ma gbarụọ ihu maka ozi ụlọọrụ mmepụta mmanụ
ụgbọala Naijirịa bụ Nigerian National Petrol Company (NNPC) zipụtara n’otu ụbọchị
ahụ na-ekwu na ha ahazigharịala ọnụego mmanụ ụgbọala ha mana ozi ha ekwughi
kpọm kwem ego ole ọnụ mmanụ a ga-ada.
Nke a na-abịa dịka ozi pụtaburu na Gọọmentị etiti na NLC
ga-ezukọ taa ma ọ kụọ elekere abụọ nke ehihie maka mwepu a ga-akwụ maka mbubata
mmanụ agbidi.
Mana ozi nhazigharị a NNPC zipụtara bụzi nzụkọ a e zubere ime
pụta n'ọha.
Ozi NLC nke onyeisi ha bụ Joe Ajaero binyere aka sị:
“Anyị ekwegharị nke a, anyị na-akatọ ya nke ukwuu. Inwe
mkparịtaụka zuruoke bụ isi ihe iji nweta nkwekọrịta. Ihe gọọmentị mere dị ka
ijide egbe n'isi ụmụafọ Naijiria ma na-ebute nsogbu na-ekwesịghị ekwesị nye ndị
isi ọrụ dịka nke ga-emetụta atụmatụ mkparịtaụka”
“Anyị na-akpọku gọọmentị etiti ka ọ gwa ndị NNPC ozugbo ka ha
wepụ usoro ọnụego mmanụ ụgbọala ha tinyere iji mee ka ndị otu chọrọ inwe
mkparịtụka mee ya n’usoro dị siriri werere. Ndị Naijiria agaghị anabata ụdị
aghụghọ ọbụla sitere n'aka ndị otu ọbụla karịsịa site n'aka ndị nnọchianya
Gọọmenti.”
Cheta na okwu malitere dịka Onyeisiala ọhụrụ Naijiria bụ Bola
Tinubu kwupụtara n'okwu mbụ ya nye ụmụafọ Naịjrịa na a ga-ewepụ ego mbelata
mmanụ ụgbọala (Fuel subsidy) na Naịjirịa.
Ọ kọwara na bọjeetị Naịjirịa ugbua enyeghi ohere ịga n'ihu
na-ewepụ ego mbelata a.
"Ọ (ịkwụ ego mbelata a) na-akwado naanị ndị ọgaranya ọ
naghị enye ndị ogbenye nkwado ọbụla, ihe a bụzị ihe dị oke ọnụ ịga n'ihu
na-eme."
Naịjirịa weputara ijeri dọla 7.5 maka ịkwụ ụgwọ enyemaka mbelata
mmanụ ụgbọala site n'ọnwa Jenụwarị ruo etiti afọ 2023 mgbe ọchịchị onyeisiala
Muhammadu Buhari onye nyere Tinubu ọchịchị.
Buhari wepụtara atụmatụ iwepụ
ego mbelata mmanụ ụgbọala a mana o meghị nke a tupu o nyefee ọchịchị ya n'aka
ọchịchị ọhụrụ.