Subsidy Removal: Gọọmentị na NLC ga-agba izu taa maka mwepu ya
Gọọmentị etiti na Nigeria Labour Congress (NLC) ga-ezukọ maka mwepu 'subsidy'
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Ousmane Sonko: Ọgbaghara ataala isi mmadụ itoolu
Ebe foto si, Getty Images
E gbuola o pekata mpe mmadụ itoolu n'ọghaghara dapụtara na mba Dakar isiobodo Senegal nakwa n'obodo Ziguinchor dịka ụlọikpe tụrụ otu onye ndụ pati anọghị n'ọchịchị mkpọrọ ụbọchị Tọzde maka ebubo imebi ndị na-eto eto.
Ousmane Sonko bụ isi a hụrụ kwawa okpu na ndị pati anọghị na gọọmentị abịaghị ụlọikpe oge a mara ya ikpe mana mịnịsta na-ahụ maka ikpe na mba kwuru na a ga-akpụga ya n'ụlọmkpọrọ mgbe abụla mgbe.
Ndị uweojii gbara ụlọ Sonko gburu gburu dịka ngwangwa a mara ya ikpe, ebe ndị na-akwado ya wujuru ama malite ngaghariiwe, bụ ebe ha na ndị uweojii kwatara nke taara isi ụfọdụ ndị mmadụ.
Ọgbaghara adaala dịka a tụrụ Ousmane Sonko mkpọrọ afọ abụọ
Ebe foto si, Ousmane Sonko/Instagram
Ọgbaghara adapụtala na Dakar, isiobodo Senegal dịka ụlọikpe tụrụ onye ndu pati anọghị n'ọ ọchịchị mkpọrọ n'ụbọchị Tọzde.
A tụrụ Ousmane Sonko gbara afọ 48 mkpọrọ afọ abụọ maka ebubo iwakpo nwaanyị n'ike n'afọ 2021 nke a na-eche nwere ike mebetụta ohere o nwere ịzọ ọkwa onyeisiala n'afọ na-abịa.
Ebubo ahụ na-ekwu na ọ dịnara nwaanyị dị afọ 20 n'ike ma zigakwara ya ozi mmaja na ọ ga-egbu ya mana Sonko agọọla n'ebubo e boro ya sị na ebubo ndị a ịbụ metụtara ndọrọndọrọ ọchịchị.
Ikpe Sonko butere ngagharịiwe na Senegal kemgbe afọ 2021.
Ndị nkwado ya na-akatọ ikpe ahụ sị ọ bụ ụzọ aghụghọ iji gbochie ya isonye zọọ ọkwa ọchịchị na ntuliaka a ga-eme n'afọ na-bịa.
Mana gọọmentị mba agọọla na nke ahụ abụghị eziokwu.
Otti ahọpụtala ndị ọrụ ya
Ebe foto si, Alex Otti/Facebook
Aka na-achị Abia steeti bụ Alex Otti ahọpụtala Njum Onyemenam dịka Odekọego Ukwu(Accountant-General nke steeti ahụ.
Ndị ọzọ ọhọpụtara dịka ozi nke onye enyemaka pụrụ iche n'okwu mgbasaozi bụ Ferdinard Ekeoma binyere aka ma wepụta ụbọchị Wenesday siri kwuo , gụnyere Ọkammụta Kenneth Kalu bụ onye e nyere ọkwa Odeakwụkwọ nke Steeti; Pastọ Caleb Ajagba, dịka Onyeisi Nchịkọta ndị ọrụ.(Chief of Staff).
Ndị ọzọ bụ Dr. Ngozi Okoronkwo, onye enyemaka pụrụ iche n'okwu ahụike; Kazie Uko, Odeakwụkwọ Mgbasaozi nke Gọvanọ na Ogbonnia Okereke bụ onyeisi otu pụrụ iche maka mkpocha na nzacha Aba na Umuahia.
Timothy Adegoke's death: A maala onye nwe ụlọndina, nwa ọrụ ya abuọ ikpe ọnwụ
Ebe foto si, Others
Ụlọikpe Ukwu dị n'Ọsụn steeti amaala otu nwe ụlọ ebe ndịna a ma ama ,Hilton Honours Hotel, dị n'Ile-Ife bụ Ramon Adedoyin nakwa ndị ọrụ ya abụọ; Adeniyi Aderogba na Oyetunde Kazeem ikpe ọnwụ site na iji ụdọ kwụgbuo ha, maka ogbugbu nwa akwụkwọ nwa akụkwọ mahadum Obafemi Awolowo University,(OAU) Ile-Ife.
E gburu Timothy Adegoke bụ onye na-agụ 'Masters' n'OAU n'agbata abalị ise na asaa nke ọnwa Novemba afọ 2021 dịka ọ gara hie n'ụlọndina ahụ iji maka ile ule na mahadum ya.
Ọkaikpe kpere ya bụ ikpe bụ Adepele Ojo tụkwara onye ọrụ ya bụ ịnabata ndị ọbịa n'ụlọọrụ(receptionist) ahụ a kpọrọ Adesola Adedeji mkpọrọ afọ abụọ maka izochi ihe akaebe na nwa amadi ahụ e gburu n'ụlọndịna ahụ ehiri n'ụlọndịna ha.
Otu jikọrọ ndị ọrịụ Naijirịa bụ Nigerian Labour Congress(NLC)
zipụtara ozi n’ụbọchị Wenezde ma gbarụọ ihu maka ozi ụlọọrụ mmepụta mmanụ
ụgbọala Naijirịa bụ Nigerian National Petrol Company (NNPC) zipụtara n’otu ụbọchị
ahụ na-ekwu na ha ahazigharịala ọnụego mmanụ ụgbọala ha mana ozi ha ekwughi
kpọm kwem ego ole ọnụ mmanụ a ga-ada.
Nke a na-abịa dịka ozi pụtaburu na Gọọmentị etiti na NLC
ga-ezukọ taa ma ọ kụọ elekere abụọ nke ehihie maka mwepu a ga-akwụ maka mbubata
mmanụ agbidi.
Mana ozi nhazigharị a NNPC zipụtara bụzi nzụkọ a e zubere ime
pụta n'ọha.
Ozi NLC nke onyeisi ha bụ Joe Ajaero binyere aka sị:
“Anyị ekwegharị nke a, anyị na-akatọ ya nke ukwuu. Inwe
mkparịtaụka zuruoke bụ isi ihe iji nweta nkwekọrịta. Ihe gọọmentị mere dị ka
ijide egbe n'isi ụmụafọ Naijiria ma na-ebute nsogbu na-ekwesịghị ekwesị nye ndị
isi ọrụ dịka nke ga-emetụta atụmatụ mkparịtaụka”
“Anyị na-akpọku gọọmentị etiti ka ọ gwa ndị NNPC ozugbo ka ha
wepụ usoro ọnụego mmanụ ụgbọala ha tinyere iji mee ka ndị otu chọrọ inwe
mkparịtụka mee ya n’usoro dị siriri werere. Ndị Naijiria agaghị anabata ụdị
aghụghọ ọbụla sitere n'aka ndị otu ọbụla karịsịa site n'aka ndị nnọchianya
Gọọmenti.”
Cheta na okwu malitere dịka Onyeisiala ọhụrụ Naijiria bụ Bola
Tinubu kwupụtara n'okwu mbụ ya nye ụmụafọ Naịjrịa na a ga-ewepụ ego mbelata
mmanụ ụgbọala (Fuel subsidy) na Naịjirịa.
Ọ kọwara na bọjeetị Naịjirịa ugbua enyeghi ohere ịga n'ihu
na-ewepụ ego mbelata a.
N'okwu ya, ọ sị:
"Ọ (ịkwụ ego mbelata a) na-akwado naanị ndị ọgaranya ọ
naghị enye ndị ogbenye nkwado ọbụla, ihe a bụzị ihe dị oke ọnụ ịga n'ihu
na-eme."
Naịjirịa weputara ijeri dọla 7.5 maka ịkwụ ụgwọ enyemaka mbelata
mmanụ ụgbọala site n'ọnwa Jenụwarị ruo etiti afọ 2023 mgbe ọchịchị onyeisiala
Muhammadu Buhari onye nyere Tinubu ọchịchị.
Buhari wepụtara atụmatụ iwepụ
ego mbelata mmanụ ụgbọala a mana o meghị nke a tupu o nyefee ọchịchị ya n'aka
ọchịchị ọhụrụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
Mba Saụt Afrịka chọrọ ịgbanwe iwu ha nke ga-enye ha ohere ikpebi ma a ga-anwụ onye ndu mba mere mpụ ma agaghị anwụchi ha.
Osote minista bụ Obed Bapela kwuru nke a dịka a na-ajụ ajụjụ ma onyeisiala mba Russia bụ Putin ọ ga-aga abịa na mba ha n’ọnwa Ọgọstụ.
Ụlọikpe mbaụwa International Criminal Court (ICC) nyere iwu sị ka anwụchie Putin maka ọgụ na-ada na mba Ukraine.
South Afrika kpọrọ Putin oku ka ọ bịara ha ọgbakọ ndị ndu ‘Brics leaders’
Mana Russia ekwubeghi ma Putin ọ ga-abịa ọgbakọ ahụ.
Mba ndị so na 'Brics' gụnyere Brazil, Russia, India, China na Saụt Africa bụ nke e hiwere iji njikọ ndị nọ n'otu a.
Ego mmanụ ụgbọala arịala elu n’ụlọọrụ NNPC
Nkọwa foto, NNPC na-erezi mmanụ ụgbọala ego ya riri elu
Okwu iri
elu mmanụ ụgbọala n’akụkụ Naịjirịa dị iche iche bụ okwu a kpụ n’ọnụ ugbua dịka
onyeisiala ọhụrụ Naịjirịa machara ọkwa n’okwu mbụ ya nye ụmụafọ Naịjirịa na a ga-ewepụ
ego mbelata mmanụ ụgbọala bụ ‘fuel subsidy’.
Agbanyeghi
na otu mgbasaozi Tinubu gwara ụmụafọ Naịjirịa ka ha ghara iji ụjọ malite iwụga ọdọ
ụgbọ mmanụ ụgbọala maka ịzụ ma zube mmanụ ụgbọala ma kwuo na ọ bụ n’ọnw Juun ka
a ga-ewepụ ya bụ ego mbeleta dịka gọọmentị gara aga siri hibe ya, ndị mmadụ awụjuola
n’ọtụtụ ọdọ mmanụ ụgbọala dịka ọnụ ego ya bụ ihe riri elu ebe ụfọdụ ọdọ ụgbọ
mmanụ ụgbọala anaghị eri ya ma ncha.
BBC hụrụ na
ọdọ mmadụ ụgbọala nke ụlọọrụ mmepụta mmanụ ụgbọala bụ Nigerian National
Petroleum Corporation (NNPC) n’akụkụ Naịjirịa dị iche iche etinyela ego riri
elu maka ya bụ ihe.
N’Abuja ụfọdụ
ụlọọrụ NNPC na-ere 537 ebe ndị ọzọ na-ere N488 ruo N500 na Legọs.
Cheta na a na-erebu ya N184 n'akuku dị iche iche.
Naịjirịa wepụtara
ijeri dọla 7.5 maka ịkwụ ụgwọ enyemaka mbelata mmanụ ụgbọala site n'ọnwa Jenụwarị
ruo etiti afọ 2023 mgbe ọchịchị onyeisiala Muhammadu Buhari onye nyere Tinubu ọchịchị.
Naijiria bụ mba nke
abụọ na-emepụta mmanụ n'Afrịka dịka ha na-esote mba Angola mana Naịjirịa
na-ebubata ihe karịrị pasentị 90 mmanụ ya n'ihi enweghị ike ịmepụta mmanụ nke
ya n'ụlọọrụ mmepụta mmanụ agbidi anọ nọ n'ọnọdụ ọjọọ n'akụkụ Naịjirịa dị iche
iche.
Ndị ọkaibe n'okwu akụanụba na-ekwu mwepụ 'fuel subsidy ga-ebute ihe ịda oke ọnụahịa mana ahapụ ya n'ihe ga-adịkwa mma dịka gọọmentị enwe ike ịchekwa ego a kara imefu n'ikwụ ụgwọ 'subsidy tinye ya n'ọrụ.
Mana ha na-ekwukwa na ego ahụ gọọmentị na-akwụbu maka ihe ga-agazị n'ọrụ ndị ọzọ dịka ọrụ ịrụ okporoụzọ, ụlọọgwụ, ụlọakwụkwọ nakwa ihe ndị ọzọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Ozi si n’aka ụlọọrụ a nke onyeisi mgbasaozi ha bụ Garba Deen Muhammed mara ọkwa na Wenezde na ha ahazigharịala ọnụ ego mmanụ ụgbọala mana ozi ahụ ebughị ọnụ ego ọbụla.
Gọọmentị na NLC ga-agba izu taa maka mwepu ‘fuel subsidy’ mmanụ ụgbọala
Gọọmentị etiti
na otu jikọtara ndị ọrụ Bekee bụ Nigeria Labour Congress (NLC) ga-ezukọ taa ma ọ
kụọ elekere abụọ nke ehihie maka mwepu a ga-akwụ maka mbubata mmanụ agbidi.
Onyeisi otu a bụ
Joe Ajaero kwuru nke a na mkparịtaụka ya ndị mgbasaozi Channels TV nwere.
“Ọ dịka gọomenti
o gosila mmasị n’ịkparịtaụka. Ha kpọtụụrụ anyị n’abalị anyị enwee nkwekọrịta
izuta n’elekere abụọ nke ehihie taa (Wenezde).
“A ga-eleba anya
n’ọtụtụ ihe, ị gaghị ewepu ‘subsidy’ ebe ị naghị arụpụta mmanụ, e nweghi ihe i
hiwere iji chekwaa ọnụahịa ihe nwereike ịda n’ahịa, onye na-erebu ihe N10 ga-achọ
irewezi ya N100.
O kwuru na
ebumnobi Onyeisiala Tinubu dị mma kama a ga-achọ usoro ọzọ a ga-eji mee ya.
Onyeisiala
Buhari kwesiri ịjụ ajụjụ ọfụma ma chọpụta etu ọ ga-esi emetụta ndị mmadụ tupu o
wepu ya bụ ‘subsidy’.
Ajaero kwuru na
ihe gọọmentị kwesịrị ime gụnyere; ịrụzi ọdọ ebe a na-esi mmanụ agbidi na Naịjirịa,
ịrọpụta ọtụtụ ụzọ ọzọ ndị mmadụ ga-esi na-eme njem.
Lee ndị ga-amalite ụgbọ njem Gọvanọ Alex Otti n'Abia steeti
Ebe foto si, Alex Otti
Gọvanọ Abia
steeti bụ Alex Otti ahọpụtala ụfọdụ ndị ga-eso ya rụọ ọrụ dịka ọ banyere n’ọchịchị.
Nke a dị n’akwụkwọ
ozi Onye ndụmọdụ na mgbasaozi ya bụ Ferdinand Okeoma wepụtara.
Ụfọdụ ndị a
ọ họpụtara gụnyere;
Ọkammụta
Kenneth Kalu – Odeakwụwkọ gọọmentị
Ụkọchukwu
Caleb Ajagba – Onyeisi ndị ọrụ gọvanọ
Ngozi
Okoronkwo – Onye ndụmọdụ n’okwu ahụike
Ferdinand
Ekeoma – Onye ndụmọdụ na mgbasaozi
Kazie Ukoh –
Onyeisi odeakwụkwọ mgbasaozi
Njum
Onyemenam – Onyeisi ngụkọ ego
Ogbonnia
Okereke – Onyeisi otu ọtawaike n’ịzacha na mkpochasị Aba na Umuahia
Otti nyere
iwu ka ndị a bido ọrụ ngwa ngwa na-egbughi oge.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Mmeri ntuliaka Turkey maka Erdogan na-enyekwa aka mba kewara ekewa
Nkọwa foto, Erdogan: 'Taa o nweghị onye na-emerighị'
Ndị nkwado Recep Tayyip Erdogan na-aṅụrị maka mmeri onyeisiala Tọkị kamgbe afọ iri abụọ merikwara ntuliaka n'ụbọchị Sọnde, ga-enye afọ ise ọhụrụ dịka Onyeisi mba Tọkị.
"Mba niile dị nde 85 meriri," ka o si wee gwa igwe mmadụ na-aṅụrị n'ezí nnukwu obí ya dị na mpaghara Ankara.
Mana ọkpụkpọ oku ya maka ịdị n'otu dara ụda ka ọ na-akwa onye soro ya ma aka bụ Kemal Kilicdaroglu emo - wee katọkwa onye ndu ndị Kurd a tụrụ mkpọrọ makwa ndị otu LGBT.
Onye ndu mmegide ahụ katọrọ "ntuliaka na-ezighi ezi na afọ ndị na-adịbeghị anya".
Ebe foto si, Reuters
Nkọwa foto, Kemal Kilicdaroglu onye soro onyeisiala Tọkị maa aka ọchịchị
Maazị Kilicdaroglu kwuru na otu ndọrọndọrọ ọchịchị onyeisi ala achịkọtala ụzọ niile steeti ahụ ga-esi megide ya ma ya ekwetabeghị n'ụzọ doro anya na o merighị ntuliaka.
Ndị na-ekiri ihe gbasara ntuliaka na mba ụwa kwuru n'ụbọchị Monde na, dịka agba nke mbụ e mere b'ụbọchị 14 Mee, mgbasa ozi na njedebe na ikikere ikwu okwu "mepụtara ogige egwuregwu na-enweghị isi ma nye aka na uru na-ezighị ezi" maka Mr Erdogan.
Onyeisiala Erdogan kwụsịrị na ihe karịrị pasenti 52% nke vootu ahụ, dabere na nsonaazụ na-enweghị akwụkwọ zuru oke. Ihe dịka ọkara ndị ntuliaka na mba a akwadoghị ọchịchị aka ike ya na Turkey.
N'ikpeazụ, Maazị Kilicdaroglu abụghị egwuregwu maka mkpọsa Erdogan nke ọma, ọ bụrụgodị na ọ kpọgara Onyeisiala na agba nke abụọ maka oge mbụ ebe ọ bụ na a họpụtara ọkwa ahụ ozugbo na 2014.
Mana ọ metaghị onye o so maa aka na ndọrọndọrọ ọchịchị n'agba nke mbụ, ebe ọ dara ihe karịrị nde vootu nde abụọ n'azụ.
Onye hibere AIT na Ray Power bụ Raymond Dokpesi anwụọla
Raymond Dokpesi onye hibere isi ụlọọrụ Daar Communications; nke nwe ụlọọrụ AIT na Ray Power FM alaala mmụọ.
Di ọkpara ya na-azakwa Raymond Dokpesi, n'ozi o zipụtarala ndị nta akụkọ, kwuru na nna ya nwụrụ n'ụbọchị Mee 29, 2023.
Ọ sị na ọnwụ nna ya bụ ihe nnukwu mwute nye ezinụlọ ha nakwa ụlọọrụ ha.
Ebe foto si, Raymond Dokpesi
Nkọwa foto, Onye hibere AIT na Ray Power anwụọla
Ihe Peter Obi gwara ndị nkwado ya dịka a ga-edu Tinubu n’iyi ọrụ
Ebe foto si, Peter Obi
Peter Obi
ji aha Labour Pati zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na Febụwarị agwala ndị nkwado ya
ka ha dere jụụ ma rubeisi n’iwu dịka a na-aga idu Bola Tinubu n’iyi ọrụ dịka
Onyeisiala Naịjirịa.
Obi kwuru
nke a mgbe ọ gara mmemme na Kaduna steeti ma sị na ọ bụ naanị ụlọikpe ga-ekpebi
onye meriri na ntuliaka ahụ n’ezie.
Obi gara n’ihu
kwuo na ịdị n’otu, udo nakwa nchekwa obodo bụ ihe kachasị mkpa karịa ọchịchọ
mmadụ ọbụla, n’ihi nke ahụ na ọ na-akpọku mmadụ niile ka ha rubeisi n’iwu ma rụọ
ọrụ iji wulite Naịjirịa.
“Anyị ga-aga
aga n’ihu ibi n’udo, ịdị n’otu nke okpukpere, ịdị n’otu nke agbụrụ, ibikọta ọnụ,
ọ bụ ya kachasị mkpa ugbua.
“Ka anyị nwee
Naịjirịa dị n’udo ma daa jụụ ebe gọọmentị ga-elekwasị anya n’ibelata ahụhụ ndị
mmadụ na-ata.” Ka Obi kwuru.
Onye so ya
gaa mmemme ahụ bụ osote ya bụ Datti Baba-Ahmed.
Ana m ahapụ Naịjirịa n’ọnọdụ ọma karịa etu ọ dibụ n’afọ 2015 – Muhammadu Buhari
Onyeisiala
Muhammadu Buhari ezipụtarala ụmụafọ Naịjirịa ozi ikpeazụ ya dịka onye
Onyeisiala. O mere nke a n’ụbọchị Sọnde abalị 28 nke ọnwa Mee, 2023.
N’ozi a, Buhari
kwetere na e nwere ọtụtụ ihe ndị chere ya na ọchịchị ya aka mgba dịka kwa akwa
maka ụmụaka ndị a tọrọ n’oge ọchịchịnakwa ndị nwụrụ site enweghi ezi nchekwa.
O kwuru:
“Dịka m na-aghagachi
Daura, Katshina, afọ juru m n’ihi na m malitere usoro mmụgharị Naịjirịa site n’itinye
usoro ndị dị mkpa”
“Ama m na a
na m ahapụ Naịjirịa n’ọnọdụ ọma karịa etu ọ dibụ n’afọ 2015.”
O rụrụ aka
n’ọrụ ya ndị metụtara ikwalite akụnụba Naịjrịa, ihazị usoro ntuliaka nakwa ihe
ndị ọzọ.
Buhariga-ahapụ
oche ọchịchị ya n’ụbọchị Mọnde abalị 29 nke ọnwa Mee dịka ọ ga-enyefe onye a họpụtara
ịchị Naijirịa ọhụrụ bụ Bola Tinubu nke APC ọchịchị.
Kirie ihe
onyonyo a ka ị nụrụ ihe ndị o kwuru n’uju.
Igbo ndị ọma, n'ebe a ka anyị ga-eweta mgbasaozi nke taa n'isi njedebe.
Sonyere BBC News Igbo na Facebook, n'elekere asaa nke ụtụtụ echi dịka anyị ga-ewetara gị mgbasaozi ikpeazụ nke Muhammadu Buhari dịka onyeisiala Naịjirịa.
Larụnụ jụụ.
US,Mexico etigarala WHO mkpu n'ihi nje a na-ekesa site n'ịwa ahụ maka ịchọ mma
Ebe foto si, Getty Images
Ndị okwu ahụike dị n'aka na mba Amerịka na Mexico etigarala otu ahụike mba ụwa bụ 'World Health Organization' (WHO) mkpu sị ka ha ka kpọpụta ọrịa ịba ọkpọnụburu (fungal meningitis) a na-ebute site ịwa ahụ maka ịchọ, nke daara na mba Mexico dịka nsogbu ahụ ike ọha.
Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa n' Amerịka bụ 'Centers for Disease Control and Prevention (CDC) kwuru na mmadụ abụọ wara ahụ bụ ndị agbara ọgwụ a kpọrọ 'epidural anaesthesia' nwụrụ site ọrịa ahụ.
Mba Amerịka na Mexico na-enyochakwa ihe ruru mmadụ 400a na-enyo na ha nwere ya bụ nsogbu.
CDC kwuru na na ha ahụla mmadụ 25 nwere nje 'meningitis' e butere site na nje ahụ.
Ebe foto si, Abraham PineDa
Ka ọ dị ugbua, e mechiela ụlọọgwụ abụọ na-awa ahụ maka ịchọ mma n'obodo Matamoros dị na Mexico n'ihi nsogbu a.
Ndị ọ dị n'aka n' Amerịka nakwa Mexico akpokuola ndị gara waa ahụ maka ịchọ mma n'ụlọọgwụ 'River Side Surgical Center' maọbụ 'Clinica K-3' dị na Mexico malite n' ọnwa Jenuwarị ka ha bịa maka nnyocha ahụ, ọbụladị ma ọ bụrụ na o nweghị ihe gosiri na ha na-arịa ahụ.
Ọtụtụ ụmụamala Amerịka na-eme njem gaa Mexico ịga-ịmịpụ abụba dị ha n'ahụ, ime ka ara maọbụ otele ha buo ibu nke a na-agba ọgwụ n'ọkpụkụazụ iji belata ụfụ.
'Anyị na-ama imi n'ala ịchọpụta onye uweojii a na-anapụ ndị ọkwọụgbọala ego'
Ebe foto si, Screengrab
Ndị uweojii Anambara Steeti ekwuola na ha na-eme nnyocha iji chọpụta onye uweojii kwụ n'okporoụzọ na-anapụ ndị ọkwọụgbọla ego n'Onịcha Anambara steeti.
Nke a na-abịa dịka ihe onyonyo onye uweojii amaghị aha ya kwụ n'ebe e chere bụ Okporoụzọ 33 Junction,Onịcha na-anapụ ndị ọkwọụgbọala ego fegharịrị na soshal midia.
Mana Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga kwuru n'ozi o wepụtara taa bụ Satọde, abalị 27 nke ọnwa Mee afọ 2023, na ya bụ agwa ekwesịghị ekwesị.
" Agwa ahụ ekwesịghị ọrụ ya dịka onye uweojii ebe ọ na-anakọ ndị kwọ ụgbọala ego kama inyocha ụgbọala ha."
"E zigarala DPO nọ na mpaghara ahụ ihe onyonyo ahụ ka ọ kwuo onye ọrụ ya dị ihe ahụ ka a taa ya ahụhụ dịka iwu ndị uweojii si dị."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Ihe mere ndị omeiwu jiri hiwe nzụkọ ntụmadi taa
Ebe foto si, National Assembly/Twitter
Ndị ụlọomeiwu agbanweela ụbọchị iwu mgbakwụnye nke afọ 2022 kwesịrị ịkwụsị site n'ụbọchị 30 nke ọnwa Jun gaa ụbọchị 31 nke ọnwa disemba afọ 2023.
Ha dọtịrị afọ iwu a ga-adị ire site n'ụbọchị 31 nke ọnwa disemba afọ 2022 gaa 31 maachị afọ 2023.
Nke a bụ ka e nwee ike imezu ihe dị na bọjet mgbakwụnye nke e mere n'ọnwa Diwemba afọ 2022.
Ụlọ ntaakụkọ Channels dere sị na nke a bụ ka ngalaba gọọmentị dị iche iche nwee ike iji nnukwu ego e nyere ngalaba ha na Bọjet were ya rụọ ọrụ.
Nke a so na ụfọdụ ihe mere ndị omeiwu jiri gbakọọ na ntụmadị.
Buhari atọhapụghị Nnamdi Kanu, arịọ m Tinubu-Soludo
Ebe foto si, Charles Soludo/Getty Images
Aka na-achị Anambara steeti bụ Charles Soludo ekwuola na ọ bụrụ na Onyeisiala Muhammadu Buhari atọhapụghị Nnamdi Kanu tupu ọ rịtuo n'ọkwa, na ya ga-arịọ Bola Tinubu ga-abata n'ọkwa ahu ka o mee nke a.
Soludo kwuru nke a ụbọchị Fraide,abalị 26 nke ọnwa Mee afọ 2023 na mkparịtaụka ya na ụlọọrụ mgbasaozi Channels TV nwere.
Soludo, onye gbara ama na ya degaara Buhari akwụkwọ ozi na nsonso a nke ọ kọpịnyere Tinubu, sịrị, "Ihe a bụ ihe m kwenyere na ya dịka onye na -anabata ikpemnkwumoto, I lee akwụkwọ ozi ahụ nke m degara ma kọpịnye Asiwaju Bola Ahmed Tinubu na Ọkaiwu Ukwu Gọọmentị Etiti, ọ bụrụ na Ọchịchị Muhammadu Buhari emeghị ihe o kwesịrị ime, anyị ga-achọwa otu ihe ahụ n'aka ọchịchị na-abata."
Soludo ,onye kpọrọla oku mbụ ka atọhapụ Kanu kwuru na nke a ga-eweta udo na nchekwa tọọrọ atọ nakwa ọganihu n'Ọwụwa Anyanwụ.
Ebe foto si, Charles Soludo
Cheta na Nnamdi Kanu nọ na mkpọrọ ndị uweojii nzuzo Naijiria a kpọrọ DSS kemgbe ọnwa Julai afọ 2023 bụ oge e si mba Kenya kpụlata ya ma kpụpụ ya ụlọikpe ebe a na-ekpe ya ikpe maka ebubo metụtara iyi ndụ egwu na ịkpa nkata ịkwatu gọọmentị Naijiria.
Ndị ụlọomeiwu Naịjirịa ehiwela nzụkọ ntụmadi
Ebe foto si, NGRSenate
Ndị ụlọomeiwu ukwu nke Naịjirịa ehiwela nzụkọ ntụmadị nke a na-atụghị anya ya.
Amatabeghị ihe mere ha jiri kpọọ nzụkọ a kama onyeisi ndụ ụlọomeiwu a awuchiela n'ọgbọ.
N'aka nke ọzọ ka ndị omeiwu na-abata nwayọ nwayọ.
Dịka ọ fọrọ ụbọchị olemaole ka enyefee ọchịchị, nke a na-eme ya ugboro abụọ ha na-ehiwe nzụkọ gbata gbata.
Nke mbụ bu oge ọrịa covid-19, ha hiwere nzụkọ gbata gbata iji nye ikike eji wepụta ego maka ọrịa a.
Dịka ndị ụlọ ntaakụkọ Channels siri dee, otu ihe gbara ọkpụrụkpụ ha jiri zụkọọ bụ mgbakwụnye maka bọjet 2022 na ịgbanwe iwu nke ụlọ akụ kachasị na Naịjirịa.
Akụkọ ka na-abịa
Anyị adịla njikere ịchụpụ ndị mba Roshịa n'ebe ha nọ na mba anyị - Ndi Yukren
Ebe foto si, Getty Images
Otu onyeisi nchekwa mba Yukren gwara BBC na ha adịla njikere ịchụpụ mba Rọshịa na mpaghara ha nọ na mba Yukren.
Oleksiy Danilov onye gwara BBC nke a ekweghị ikwu ụbọchị ha ga-ebido ọgụ a.
O kwuru na ndị agha Wagner na-alụrụ Rọshịa ọgụ na-apụ na mpaghara Bakhmut mana o kwuru sị, "Na na-agbakọ n'ebe ọzọ" ma sị kwa, " Nke a apụtụtaghgị na ha ga-akwụsị iluso anyị ọgụ".
Oteela aka mba Yukren ji achọ iluso mba Roshia nọ na ụfọdụ mpaghara ọgụ kama ha chọrọ oghere iji guziere ndị agha ha ụzọ ogu dị mma ma natakwa ngwa ọgụ n'aka mba ndị na-enyere ha aka.