Ebe ka anyị ga-apịachi ọgbakọ a
Akụkọ banyere ntuliaka ọkwa gọvanọ anyị na-ewetere gị ka a kụrụ ọnụ ebe a.
Mana anyị ka kwụ chịm maka akụkọ metụtara ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa ihe ndị ọzọ.
Imeela ka ị nọnyere anyị n'ọgbakọ a.
N'ụbọchị 29 na 30 ka e nyere ndị meriri ntuliaka ọkwa gọvanọ Abia, Ebonyi nakwa Enugwu Steeti asambodo mmeri ha dịka iwu Inec siri dị
Chigozie Ohaka, Chukwunaeme Obiejesi and Uche Akolisa
Akụkọ banyere ntuliaka ọkwa gọvanọ anyị na-ewetere gị ka a kụrụ ọnụ ebe a.
Mana anyị ka kwụ chịm maka akụkọ metụtara ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa ihe ndị ọzọ.
Imeela ka ị nọnyere anyị n'ọgbakọ a.

Peter Mbah nke Peoples Democratic Party (PDP) meriri n'ọkwa Gọvanọ Enugwu Steeti anatala asambodo ikike ịbụ gọvanọ site n'aka ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (Inec).
Nke a mere n'ụbọchị Tọzde 30 Maachị 2023 n'isi obodo Enugwu bụ ebe e nyere Mbah na osote ya Ifeanyi Ossai asambodo a.
N'otu aka ahụ, ụlọọrụ Inec nyekwara ndị niile meriri n'ọkwa ụlọomeiwu Enugwu steeti asambodo nke ha iji malite ọrụ.
A ga-edu Mba na osote ya n'iyi ọrụ n'ụbọchị 29 nke ọnwa Mee afọ 2023 iji malite ọrụ ya n'uju.


Ebe foto si, Alex Otti/Facebook
Ngalabz Inec enyela Alex Otti onye a kpọpụtara dịka onye meriri ntuliaka gọvanọ Abia Steeti na osote ya asambodo mmeri ntuliaka gọvanọ steeti ahụ taa bụ ụbọchị 29 nke ọnwa Maachị afọ 2023.
Otti ji ohere kwee ndị Abia Steti nkwa sị, " Agaghị m emechu unu ihu, agaghị m agbahapụ ntụkwasị obi unu nwere n'ebe m nọ".
O kwuru maka ndị zuuru ego gọọmentị Abia steeti were sị, " E nweghị m oge m ji achụgharị ndị zuuru ego Abia Steeti. A na m akpọ ndị a ka ha weghachi ego ha zuuru na-egbughị oge. Anyị agaghị ekwe ka e were ego gọọmentị Abia maka ọdịmma otu onye".

Ebe foto si, Alex Otti/Facebook
O ji kwa ohere a kwa Gọvanọ Abia Steeti bụ Okezie Ikpeazu ka ọ kwụsị inye ọrụ ngo n'ihi na ọdabaghị ma ọlị".
Otti kelekwara Inec ma sịkwa na enweghị ihe jịkọrọ ya na onye na-anọchite anya Inec n'Abia Steeti bụ Nnenna Otti.
Otti kelere ndị otu ọzọ ha na ya soro zọọ ọkwa a maka ozi ekele ha zitere ya.

Ebe foto si, Alex Otti/Facebook

Ebe foto si, Alex Otti/Facebook

Ngalaba Independent National Electoral Commission(INEC) enyela Francis Nwifuru onye akpọpụtara dịka onye meriri ntuliaka gọvanọ steeti ahụ na ndị omeiwu mmadụ iri na asaa asambodo mmeri dịka iwu siri dị.
Onyekachi Paulin Ugochi bụ onye na-anọchite Inec n'Ebonyi steeti nyere ha asambodo a ma kọwaa na enyeghị mpaghara ise asambodo mmeri n'ihi ekpebibeghị ntuliaka emere ebe ahụ, ebe mpaghara abụọ ọzọ nwere nsogbu.
O kwuru sị, "Obi dị m ụtọ ị gwa unu na Inec ga-eme ntuliaka ọzọ maka mpaghara ndị a nwere nsogbu n'ụbọchị 15 nke ọnwa Aprel afọ 2023".
O kwukwara na ndị omeiwu atọ na mmadụ ise bụ ndị omeiwu nta si Ebonyi steeti sọ na ndị e nyere asambodo mmeri.



Ebe foto si, FUTO
Obi aṅụrị, ịgba eze, na egwu ọṅụ ka ndụ ụlọakwụkwọ Mahadumm Tekịnụzụ nke Owerrii (FUTO) ji nabata onyeisi ha bụ ọkammụta Nnenna Oti dịka ọ rụchara ọrụ onyeisi ngụkọ mpụtara ntuliaka n'Abia Steeti.
Cheta na ọ bụ Nnenna Oti kpọpụtara aha Alex Otti nke Labour Party dịka onye meriri ntuliaka ọkwa gọvanọ e mere n'Abia steeti n'ụbọchị 18 nke ọnwa Maachị 2023.
Ụbọchị Tuzde bụ nke mbụ ọ na-amalitekwa ọrụ ya dịka onyeisi ụlọakwụkwọ Futo kamgbe ọ rụchara ọrụ ntuliaka n'Abia Steeti, nke mere ụmụakwụkwọ, ndị nkuzi na ndị ọrụ ndị ọzọ ji nuputa n'igwe ịnabata ya ma na-akpọ ya "dike nke ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjirịa".
Kamgbe Naịjirịa lọghachịrị n'usoro ọchịchị onye kwuo uche ya n'afọ 1999, nke a bụ nke mbụ otu ndọrọndọrọ ọzọ na-abụghị Peoples Democratic Party (PDP) ga-emeri ọkwa gọvanọ n'Abia Steeti.
Ọgbaaghara chọrọ ịdapụta n'oge ngụkọ mpụtara ntuliaka ahụ, mana ọkammụta Oti gbara mbọ chịkọta ihe niile ọnụ ruo oge ọ kpọpụtara onye meriri ya bụ ntuliaka.
N'emume nnabata ya nke e mere n'ụlọakwụkwọ Futo n'ụbọchị Tuzde, Ọkammụta Nnenna Oti kọrọ etu ya si merie ọnwụnwa niile ndị ndọrọndọrọ ọchịchị nwara ya, ma gaa n'ihu kpọpụta nke bụ ezi mpụtara ntuliaka ahụ.
"Ha jie ego ha bịa (ịnwa m ọnwụnwa), ha ji iyi egwu bịa, ha ji mmaja bịa, mana abụ m Agụ," ka Nnenna Oti kwuru.
Otu nwata akwụkwọ aha ya bụ Joy gwara onye ntaakụkọ BBC na ọrụ ọkammụta Oti rụrụ na ntuliaka Abia Steeti nke 2023 bụ ihe agaghị echefu echefu n'akụkọ ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjirịa.
"Ebe ọtụtụ ọkammụta gara ma daa, otu ọkammụta bụ nwaanyị gara ebe ahụ ma turu ugo," Joy kwuru.
"Dịka nwata akwụkwọ n'ụlọakwụkwọ a, ọ bụ ihe nkwanye ugwu nye m na onyeisi ụlọakwụkwọ m gosipụtara onwe ya n'ụzọ pụrụ iche otu a dịka aha ya na-ewu ma na Naịjirịa ma na mba ofesi."
"Ọzọkwa bụ na dịka nwaanyị m bụ, ọ bụ ihe ime ọnụ na ọ bụ nwaanyị, bụrụ nne, mere ihe dị otu a iji gosi na ọ bụghị ndị Naịjirịa niile na-etinye aka na nrụrụaka."
Cheta na ụfọdụ ndị PDP boro ebubo n ọkammụta Nnenna Oti na Alex Otti bụ ụmụnne, ma kpọọ oku ka Inec wepụ ya dịka onyeisi ngụkọ mpụtara ntuliaka Abia Steeti.
Mana nnyocha BBC Igbo mere gosiri na ebubo a abụghị eziokwu.
Ụnụ eteela ụra.
Taa bụ Wenezde, bụrụkwa ahịa Eke.
Daalụ maka isonyere anyị.

Ebe foto si, Emeka Ihedioha/Facebook
Aka chibụrụ Imo steeti bụ Emeka Ihedioha ezipụla ozi na o sepụla aka n’atụmatụ ịzọrọ Peoples Democratic Party (PDP) ọkwa gọvanọ n’Imo steeti.
N’ozi a pụtara n’abalị Mọnde a, Iheadioha kwuru na o mere mkpebi a site na ihe otu kọmịtịị na-arụrụ pati ahụ ọrụ kpebiri nke kwuru ka e jịkọọ aka ọnụ họpụta naanị otu onye ga-azọrọ pati ahụ ọkwa na nuliaka ime ụlọ ha na-abịa abịa.
O kwuru na mkpebi esepụ aka a abụghị ihe dịịrị ya mfe, mana iji kwado ọganihu nakwa ịdịnaotu pati ahụ, na ọ bụ ya mere o jiri were onwe ya chụọ aja nye pati ahụ ma zepụ aka ka e nweeike họpụ naanị otu onye.
Ọ gara n’ihu kelee ndị nkwado ya niile ma rịọ ndị mkpebi a ga-akụnda mmụọ ha ka ha nabata ya ma gaa n’ihu na-enye ya nkwado.
Nke a na-abịa dịka ntulila ime ụlọ pati a ga-ahọpụta onye ga-azọrọ ha ọkwa gọvanọ Imo nke Nọvemba 2023 ji ọsọ abịa nso.
Ihedioha chibụrụ Imo steeti dịka gọvanọ ruo ọnwa asaa, malite na Mee 2019 ruo Jenụwarị 2020, tupu ụlọikpe e mee mkpebi na ọ bụ Hope Uzodinma nke APC ga-achị pati ahụ n’afọ 2020.

Ebe foto si, Umar Damagum/Facebook/Iyorchia Ayu/Facebook
Odeakwụkwọ Peoples Democratic Party (PDP) na ngalaba mgbasaozi ha bụ Debo Ologunagba zipụtara ozi na Tuzde nke kwuru na ha ahọpụtala onyeisioche ọhụrụ nke nchere oge.
Ozi ya kwuru:
“Otu cọmịtịị na-arụ ọrụ pati a bụ ‘The National Working Committee (NWC)’ kwuru na ka anyị mechapụrụ ọgbakọ gbatagbata n’ụbọchị Tuzde a, anyị nabatara iwu ụlọikpe iwu Benue steeti nyere n’ụbọchị 27 nke ọnwa Maachị banyere ọkwa onyeisioche pati anyị.”
“Dịka anyị nyochacha iwu a, iji soro akụkụ akara Section 45 (2) iwu pati anyị, otu NWC ekpebiela na osote pati anyị bụ Umar Ililya Damagum (si mpaghara ugwu) ga-anọzị n’ọkwa onyeisioche pati anyị nke chere oge malite taa bụ Tuzde, abalị 28 nke ọnwa Maachị 2023.”
Nke a pụtara na ọ ga-anọchite Iyorchia Ayu onye wọọdụ ya na Bemue steeti kwụsịrị ọrụ nwa mgbe nta maka ‘ịkpa agwa megidere pati ahụ’.
Ụlọikpe nyere iwu ka ọ ghara ị na-ebugharị onwe na-akpagharị dịka onyeisi oche pati ahụ ruo mgbe e mechara mkpebi n’okwu ikpe ya nke eyigharịrị gaa ụbọchị 17 nke ọnwa Eprel 2023.
Cheta na Terhide Utaan nke akụkụ PDP na Benue steeti bugara ọkaikpe W. I Kpochi mkpesa banyere Ayu nke mere e ji kwụsị ya ọrụ nwa mgbe nta,
Nke a sokwa ọtụtụ okwu banyere Ayu ịnọ n’ọkwa ahụ nke mere tupu oge ntuliaka 2023 mgbe otu gọvanọ ụfọdụ na pati ahụ kpọrọ onwe ha otu G5 kwuru ugboro ugboro na ha chọrọ ka Ayu gbaa arụkwaghịm n’ọkwa ahụ n’ihi na n’uche ha o zighi ezi onye a họpụtara ịzọrọ pati ahụ ọkwa onyeisiala (Atiku Abubukar) nakwa onyeisioche pati ahụ bụ Ayu isi otu mpaghara nke bụ mpaghara ugwu Naịjirịa.
Otu a nke Nyesom Wike bụ onyendu ha kwuru na otu n’ime ọkwa a kwesịrị ịgara ndị ndịda Naịjirịa iji gosi nakwa kwado ụkpụrụ ‘e tinyere ndị ebe a, e tinyere ndị ebe a’ na pati ahụ.
PDP enwetaghi mmeri na ntuliaka 2023 a dịka APC zọtara ọkwa onyeisiala Naịjirịa na ya bụ ntuliaka.

Ebe foto si, Obafemi Hamzat/Facebook/MC Oluomo/Facebook
Osote gọvanọ Legọs steeti bụ Obafemi Hamzat ekwuola na Musiliu Akinsanya nke ọha dị MC Oluomo mara nke bụkwa onye nkwado APC na Bola Tinubu, ga-anata ntaramahụhụ ma achọpụta na ọ dara iwu n’oge ntuliaka a emechapụrụ na Naịjirịa.
Hamzat kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ụlọ ntaakụkọ Channels TV nwere n’ụtụtụ Tuzde a oge ọ nọ na-aza ajụjụ banyere tigbuo zọgbuo nakwa ebubo nrụrụaka a sị dapụtara na Legọs steeti n’oge ntuliaka 2023.
Agbenyeghi na o kwuru na ọ naghị akpọ oku ka a nwụchịe onye ọbụla, o kwuru na ọ ga-adị mma ka enyocha ihe ndị mmadụ na-ekwu maka MC Oluomo, “Ọ bụrụ na a hụ na ọ dara iwu, ọ ga-anatarịrị ntaramahụhụ dịịrị ya.”
O ji okwu a saa ajụjụ metụtara ihe onyonyo fegharịrị n’oge ntuliaka ọkwagọvanọ Legọs steeti nke mkpatara ọtụtụ okwu, ebe MC Oluomo onye bụ onyeisioche otu jịkọrọ ndị njem ụgbọala Legọs kwuru okwu mmaja nyuue ndị Igbo.
Hamzat kwuru :
“Maka okwu MC Oluomo a, ọ pụtala kwuo na ọ bụ otu nwaanyị ka ọ na-agwa okwu n’ihe onyonyo ahụ, nke nwaanyị a pụtakwara n’ihe onyonyo kwuo na oteela kemgbe o ji mara MC Oluomo, ma gbaa aka ebe na ọ bụ ya ka ọ nọ na-agwa okwu, nke bụ eziokwu na amaghị nke bụ nke mana ka ọha nyochaa okwu a, ọ bụrụ na ọ dara iwu, ọ ga-akwụrịrị ụgwọ ihe ọ mere.”
“Ihe m na-ekwu bụ na anyị na-emetụta mba anyị n’ụzọ ọjọọ ma anyị na-akwanye ọkụ n’obere ihe ọbụla mere. Anyị mepụrụ ntuliaka nke ọtụtụ ọgbọ ntuliaka sonyere, e nwee ihe na-erughi otu pasentị ebe nsogbu dara, anyị a na-etizi mkpụ ka ọ ya bụ otu pasentị a ka pasentị 99 dị mkpa.”
“Ọ dị m ka ihe ịtụnaya na anyị na-eme mba anyị ka nkịrịnka akwa site n’ikwu na ntuliaka agaghị nke ọma. Ntuliaka gara nke ọma. Eh, e nwere ihe ndị dị aṅaa mere, ndị tinyere aka n’ihe ndị a ga-akwụ ụgwọ ihe ọjọọ ha mere.”
Ọ gara n’ihu tinye ọnụ n’okwu ịkpaoke agbụrụ nakwa nkewa na-adapụta na steeti ahụ ma kowa na Legọs steeti gọọmentị bụ steeti na-anabata ndị agbụrụ nakwa okpukperechi niile, ma kwuo na Legọs bụ naanị steetie be ndị agbụrụ niile nọ n’otu ndị ụlọomeiwu ha
Igbo ndị ọma ụtụtụ ọma o.
Taa bụ Tuzde, ahịa Nkwọ.
Ka ụbọchị taa maara onye ọbụla mma o.

Ebe foto si, Dave Umahi/Facebook
Gọvanọ Dave Umahi nke Ebonyi steeti arịọla onye a họpụtara ka ọ chịa Naịjirịa bụ Bola Tinubu ka o tinye Gọvanọ Nyesom Wike ndị ga-anọ n’ọchịchị ya.
Umahi kwuru nke a n’ụbọchị Mọnde n’emume mmepe ụlọakwụkwọ Sekọndịrị nke obodo, Okoro Nu Odo, dị n’okpuruọchịchị Obio/Akporna Rịvas steeti.
O kwuru nke a maka mbọ ndị Wike gbaara Tinubu nakwa APC n’oge ntuliaka 2023 agbanyeghi na ọ bụ onye pati na-anọghị n’ọchịchị.
O kwuru
“Chukwu ma mee nye Gọvanọ Wike ohere iwepụta onwe ya rụọ ọrụm enweghi etu APC ka esi kwuo maka ndị rụrụ ọrụ ọma na ntuliaka ma hapụ ịkpọ aha gọvanọ Wike”
“Anyị na-arịọ Asiwaju/Shettima ka ha tinye Gọvanọ Wike n’ihu gọọmentị etiti ya n’ihi na o nwere ọtụtụ orụ ọ ga-arụ maka njịkọ mba anyị.”
O gara n’ihu kwuo na n’okwu ntuliaka, ndị ma ihe ekwe na-akụ na akpachapụ okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’akụkụ ma malite ịgba mbọ ihe ga-adịrị ịdịnaotu na njịkọ obodo mma.
“Ọ bụ okwu etu a ga-esi hụ na mba anyị na-aga n’ihu, etu a ga-esi hụ na ejịkọ ndị mmadụ onụ.”
Umahi gakwara n’ihu kelee onyeisioche PDP bụ Iyorchia Ayu maka “ịrụrụ” Tinubu ọrụ na ya bụ ntuliaka.
Nke a na-abịa dịka nkewa nọ n’ime pati PDP nke mere Wike na ndị gọvanọ anọ ọzọ jiri gbaa isi akwara na Ayu ga-apụriri n’ọkwa oche ya dịka onyeisioche pati ahụ tupu ha akwado Atiku Abubukar bụ onye pati ahụ họpụtara ka ọ zọọrọ ha ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2023 gara aga.
Iwe ha bụ okwu na Atiku na Ayu si mpaghara ugwu Naịjirịa nke n’uche ha mere ọ dịzie ka ya bụ pati anaghị akwado ụkpụrụ “e menyere ndị ebe a, e menyere ndị ebe a.”
Rịvas steeti nke bụ steeti ọchịchị PDP nọ n’isi ya so na steeti ebe Tinubu nwetere mmeri na ntuliaka gara aga agbanyeghi n’akụkọ tigbuo zọgbụọ nakwa ebubo nrụrụaka ndị ọzọ si ebe ahụ pụta.

Ụlọọrụ nhazị ntuliaka Naịjirịa Independent National Electoral Commission (Inec) ehibela Satọdee ụbọchị 15 nke ọnwa Eprel dịka ụbọchị a ga-eme ntulika mgbankwụnye nke ọkwa gọvanọ na nke ndị ụlọomeiwu Naịjirịa nakwa nke ndị ụlọomeiwu steeti n’ebe ndị ha kwuru emezughi ntuliaka n’isi.
Nke a dị n’ozi ha wepụtara n’akara Twitter ha n’ụbọchị Mọnde nke kwuru:
“Site na mkpebi anyị mere n’ọgbakọ anyị taa, Independent National Electoral ekwekọrịtala na ụbọchị ntuliaka ọkwa gọvanọ, ndị ụlọomeiwu Naịjirịa nakwa ndị ụlọomeiwu steeti emetọpụbeghi ga-abụ na n’ụbọchị Satọde, 15 nke ọnwa Eprel, 2023... Anyị ga-ewepụta ozi zuruoke n’oge adịghị anya”
Nke a na-abịa dịka Inec kwuru n’abalị olemole gara aga na ntuliaka ọkwa gọvannọ Kebbi na Adamawa steeti akapịghị ọnụ.
Na Mọnde, Inec kwuru na ntuliaka e mere na Kebbi akapịghị ọnụ n’ihi na ụfọdụ ihe ndị mere ebe ahụ megidere iwu ntuliaka Naịjirịa nke mere e ji kagbuo ntuliaka e mere n’ọgbọ ntuliaka 20 n’ime okpuruọchịchị 21 na steeti ahụ.
Onyeisi ngụkọ vootu Inec na steeti ahụ bụ Yusuf Sa’idu kwuru na tigbuo zọgbụọ, mbibi ihe ndị e ji mee ntuliaka, mwakpo ọgbọ ntuliaka na ngụkọ vootu na-edoghi anya mere ka Inec kwupụta na ya bụ ntuliaka akapịghị ọnụ.
Tupu e kwuo na ya bụ ntuliaka akapịghị ọn u, APC no na-enweta vootu kachasị ebe PDP nọ na-eso ha n’azụ.
N’Adamawa, onye na-azọrọ APC ọkwa gọvanọ bụ Aishatu Dahiru nọ na-enweta vootu kachasị dịka gọvanọ nọ n’ọkwa ugbua bụ nke PDP nọ na-eso ya n’azụ mgbe Inec kwuru na ya bụ ntuliaka akapịghị ọnụ n’ihi na etu vootu onye nọ n’ihu siri gafee onye so ya n’azụ edoghi anya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post

Ebe foto si, Peter Mba/Francis Nwifuru/Alex Otti/Facebook
Ụlọọrụ nhazi ntuliaka bụ 'Independent National Electoral Commission' (Inec) ekwuola na ndị gọvanọ ahọpụtara ọhụrụ ga-anata asambodo mmeri ha - a na-akpọ 'certificate of return na bekee - bido n'ụbọchị Wenezde, bụ ụbọchị 29, ruo ụbọchị Fraịde bụ ụbọchị 31 nke ọnwa Maachị 2023.
N'akwụkwọ ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru Inec bụ Festus Okoye, ọ kọwara na dịka iwu si dị, ndị meriri ntuliaka kwesịrị inweta asambodo mmeri ha n'ime ụbọchị 14 ha ji merie ntuliaka.
Emume inye asambodo a ga-adị n'isi ụlọọrụ Inec na steeti dị icheiche, dịka a ga-enyekwa ndị niile meriri ọkwa omeiwu steeti asambodo mmeri ha n'ime ụbọchị atọ ndị a bụ 29 ruo 31 nke ọnwa Maachị.
Ka ọ dị ugbua, a kpọpụtala mpụtara ntuliaka na steeti 26 n'ime steeti 28 ebe e nwere ntuliaka maka ọkwa gọvanọ.
Pati 'All Progressives Congress (APC) nwetara mmeri na steeti 15, otu 'Peoples Democratic Party' nwetara mmeri na steeti itoolu, ebe Labour Party na 'New Nigeria Peoples Party' (NNPP) nwetara mmeri n'otu steeti - Abia na Kano - n'otu n'otu.
Ọ fọdụrụ steeti abụọ, Adamawa na Kebbi, ebe Inec kwuru na ntuliaka ebe ahụ akapịbeghị ọnụ.

Ụlọikpe mkpesa enyela Peter Obi onye jị ọkọlọtọ otu Labour Party zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa ikike ịgba akwụkwọ n'ụlọikpe nke megidere mmerị Bola Ahmed Tinubu dịka onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka nke e mere n'ụbọchị 25 ọnwa febụwarị afọ 2023.
Obi kwuru na ya anabataghị mkpọpụta ngalaba Inec kpọpụtara Tinubu dịka onye meriri ntuliaka ọkwa gọvanọ.
Ọkaikpe ukwu nke Labour Party bụ Ikechukwu Ezechukwu kwuru na enweghị ike inye Tinubu na osote ya bụ Kashim akwụkwọ ya bụ ikpe agbara ha n'ihi etu ndị nchekwa siri gbaa ha gburu gburu, nke mere ha ji agwa ụloikpe ka e site ụzọ ọzọ gbaa ha ya bụ akwụkwọ maka ikpe a.

Ebe foto si, Bola Tinubu/Facebook/Nigeria Presidency
N’ozi pụtara n’abalị Tọọzde, ọnụ na-ekwuru pati APC bụ Bayo Onanuga kwuru na akụkọ na-efegharị na onyeisi ndị ikpe bụ Olukayode Ariwoola ‘zooro onwe’ ga zute Bola Tinubu bụ onye a họpụtara ka ọ chịa Naịjirịa bụ akụkọ ụgha.
Onanugu kwuru na Tinubu nọ n’isiobodo France bụ Paris dịka o kwuru na ọ nọghị na UK dịka akụkọ a si ekwu.
O gara n’ihu kwuo na ndị na-ekesa akụkọ chọrọ ịkụpụ ntụkwasị obi ndị mmadụ nwere na ntuliaka họpụtara Tinubu dịka onye ga-achị Naịjirịa.
“Anyị na-akụchapụsiike akụkọ niile na-ekwu na onye a họpụtara ịchị Naịjriịa na onyeisi ndị ọkaikpe na Naịjirịa zutere n’ebe ọbụla. Nke a bu ezigbote akụkọ ụgha na achịtaghị aja ọbụla.”
“Ihe m mma bụ na onye a họpụtara ịchị Naịjirịa nke mere njem n’ụbọchị Tuzde agabeghi Lọndọn. Ọ nọ na France ugbua na-ezuike dịrị ya dịka e mechapụrụ achụmnta vootu malitere na Jenụwarị 2022. Ọ ga-aga Lọndọn ma e mechee tupu ọ gazie Mecca maka njem ndị nsọ ụlọ alakụba.”
Nke a na-abịa dịka ọtụtụ kwuru na soshal midia na Tọọzde na Tinubu na Ariwoola gara izute onwe ha iji hụ na ọ nwetere mmeri n’ikpe ntuliaka ndị nọ n’isi ya.
Cheta na Labour Party, onye zọọrọ ha ọkwa onyeisiala na ntuliaka bụPeter Obi, Peoples Democratic Party (PDP), onye zọọrọ ha okwa onyeisiala na ntuliaka bụ Atiku Abubakar na ndị ọzọ buru mkpesa gaa ụlọikpe banyere usoro ntuliaka họpụtara Bola Tinubu dịka onye ga-achị Naịjirịa nakwa mkpesa ndị ọzọ.
Ikpe ndị a nọ n’ụlọikpe ugbua.

Ebe foto si, Festus Keyamo
Festus Keyamo bụ ọnụ na-ekwuru ndị APC edegerela ụlọọrụ Directorate of State for Security nke a kpọrọ DSS akwụkwọ mkpesa maka Peter Obi onye bụbu gọvanọ Anambra steeti, bụkwa onye jirila otu pati Labour zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa.
N'edemede ya nye ndị DSS, Keyamo si na Obi na osote ya bụ Datti Baba-Ahmed na-ekwu ihe nwereike ime ka ndị mmadụ nupuisi maọbụ nwereike ibute ọgbaghara nye gọọment Naịjirịa nakwa Bola Ahmed TInubu bụ onye Inec kpọpụtara dịka onye meriri ntuliaka ọkwa Onyeisiala
Keyamo si na ọ "na-ede ya bụ akwụkwọ n'ibu n'uche na e kwesịrị na-ekpee ikpe udo". Ọ sị na akwụkwọ ya dere so nzọmụkwụ Bola Tinubu dere maka ikpe udo n'obodo ka ndị mmadụ ghara ịdị mwute.

Ebe foto si, Festus Keyamo

Ebe foto si, Festus Keyamo

Ebe foto si, Fayose/Anyim Twitter/Facebook
N'ozi otu pati Peoples Democratic Party bụ PDP depụtara n'ụbọchị Tọzde, edemede a na-ekwu na akwụsịtula mmadụ ise ịbụ ndị otu patị ahụ. Ndị a bụ
1. Ayodele Fayose (Ekiti steeti)
2. Ibrahim Shema (Katsina steeti)
3. Sinetọ Pius Anyim (Ebonyi steeti)
4. Ọkammụta. Dennis Ityavyar (Benue steeti)
5. Dkt Aslam Aliyu (Zamfara steeti)
N'ozi ha wepụtara n'ọbaozi ha na Facebook, si n'aka ọnụ na-ekwuru PDP bụ Debo Ologunagba, n'ụbọchị Tozde, ọ si na otu pati PDP enyobachaala ọdịmma otu patị ha ebe iwu pati ha (nke atụgharịrị n'afọ 2017). N'aka nke ọzọ, otu pati PDP asịla na ha enyefeela Gọvanọ nke Benue steeti Samuel Ortom n'aka ndị kọmitee na-enyobanye mmeghie maka etu o si tinye aka n'ihe megidere ọdịmma pati ha na ntuliaka nke gara aga.
Ndị ọzọ emeela ngaghariiwe n'Abuja taa maka etu ntuliaka e mere na Naijiria na nso nso a siri gaa.
Ndị a na-eme ngaghariiwe ji akwụkwọ na-egosi iwe ha chọrọ ka Ọchịchị Buhari tinye ọchịchị nwa mgbe nta tupu ọ rituo n'ọchịchị n'abalị 29 nke ọnwa Mee afọ 2023.
Ha na-akpọkwa oku ka a nwuchieMahmood Yakubu bụ onyeisi ngalaba na-ahazi ntuliaka bụ 'Independent National Electoral Commission (INEC).
Ndị a na-eme ngagharịiwe kpọrọ onwe ha otu "National Youth League for the Defence of Democracy (NYLDD) gwara ndị ntaakụkọ okwu n'ogige unity Foundtain' dị n'Abuja n'ehihie taa bụ Wenezde.
Naijiria mere ntuliaka onyeisiala na Ụlọomeiwu steeti n'abalị 25 nke ọnwa Febuwari afọ 2023 ma mekwa nke ọkwa gọvanọ na ụlọomeiwu steeti n'abalị 18 nke ọnwa Maachi afọ 2023.
Ọtụtụ ndị nwere agba akatọọla usoro e si mee ya bụ ntuliaka dịka e nwere akụkọ tigbuo-zogbuo, mwakpo ndị chọrọ ịtụ vootu nakwa wurwuru ndị ọzọ.
Ka ọ dị ugbua, Peter Obi nke otu 'Labour Party nakwa Atiku Abubakar bụ ndị so zọọ ọkwa onyeisiala ahụ nke Inec nyere Bola Tinubu nke APC mmeri agaala ụlọikpe ịgbagha mpụtara ntuliaka ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2

Ebe foto si, Screengrab
Mba Briten akatọọla tigbuo-zogbuo na mkpachi ndị chọrọ ịtụ voootu mere na steeti ụfọdụ na ntuliaka gọvanọ e mere n'abalị 18 nke ọnwa Maachi afọ 2023.
Briten kwuru na ha na-achịkọta ozi maka ịta ndị aka ha dị na ya bụ mkpamkpa site na ịmachi ha ịbata mba ha.
Naijiria mere ntuliaka ọkwa gọvanọ na ụlọomeiwu nke steeti nke e nwetara akụkọ tigbuo-zogbuo na steeti ụfọdụ dịka Legos, Enugwu, Kano,Rivas steeti dgz.
N'ozi nke ụlọnnochiteanya Briten na Naijiria wepụtara nke ọnye mgbasaozi ha bụ Atinuke Akande-Alegbe binyere aka,kwuru na na-agbanyeghị na ha hụrụ na Inec gbalirị site n'ịmalite ntuliaka n'oge na'ọtụtụ ebe, ha gbarụụ ihu maka tigbuo zogbuo mere n'ụfọdụ ebe.
Ozi ahụ kwuru sị, "Minista mba Briten na-ahụ maka mmepe nakwa Afrika bụ Andrew Mitchell MP,kwuru n'abalị 21 nke ọnwa Febụwarị na Briten dị njikere ikulite megide ndị sonyere maọbụ ndị kpalitere tigbuo-zogbuo na ntuliaka site igbochi ha ịnata akwụkwọ ikike ịbata Briten maọbụ ntaramahụhụ ndị ọzọ dịka ọ dị n'iwu ikike dịịrị onye dịka ọ dị n'iwu anyị .
"Anyị na-achịkọta ozi banyere iji taa ndị a ahụhụ."
Nwaafọ,ndewoo!
Ụbọchị taa mara gị mma, nwanne!