Ụlọikpe ukwu nọ na Pọta Kọọtụ Rịvas steeti enyela iwu ka ndị uweojii kwụọ ezinaụlọ otu
nwaamadị aha ya bụ Chima Ikwunado maka etu ha siri megide ikike dịrị ya dịka
mmadụ ma gbuo ya.
Ezinaụlọ Ikwunada
bugara okwu ya ụlọikpe ma gbaa ndị uweojii akwụkwọ maka etu ya bụ nwaamadị onye
na-arụzị ụgbọala siri nwụọ n’aka ha.
Ikpe a dakwasịrị onyeisi
ndị uweojii Naịjirịa bụ Usman Alkali-Baba, Kọmịshọna ndị uweojii na
Rivas steeti, Onye bụbu ọchịagha ngabala uweojii ‘E-Crack’, onye uweojii Benson
Adetuyu nakwa mmadụ anọ ndị ọzọ achụrụla n’ọrụ uweojii.
Ọkaikpe S. I MARK kpere ikpe a nyere iwu a ma kwenye ihe ndị ọkaiwu ezinaụlọ a rịọrọ.
Ọkaiwu Princess
Lawrence nakwa ezinaụlọ nwaamadị a kwuru na obi dị ha ezigbo mma
maka mkpebi ụlọikpe mere n’okwu a.
Cheta na akụkọ nwoke
a pụtara na 2019 mgbe ndị uweojii nke ngalaba ‘Eagle-Crack Special Police Unit’
mekpara ya na ndị ọzọ na-arụ ụgbọala ahụ nke mere o jiri nwụọ.
Akụkọ a wuru ewu nke ọtụ
ji malite ịkpọ ya bụ akụkọ ‘Ikoku-4’.
A nwụchiri Chima oge
ahụ maka ebubo iji egbe gaa ohi mana atara ya ahụhụ ike ukwu nke mere o jiri nwụọ
n’aka ha.
Nnyocha ime ahụ ndị
uweojii mere n’ahụ ya kwuru na ọ bụ oke Shuga n’ime ahụ ya gburu ya mana ezinaụlọ
ya gbara isi akwara n’okwu ma jụ ikwenye nke a.
Nwa nwanne nne Chima
bụ Obinna Ezirim gara zute ya mgbe ọ no n’aka ndị uweojii oge ahụ gwara
BBC na ọ hụrụ ọtụtụ ọnya nakwa apa n’akụkụ ụkwụ ya dịka ọ rịọrọ ya ka o mee ihe
niile hụ na ọ pụtara n’aka ndị uweojii n’ihi na a taala ya oke ahụhụ.
Chetakwa na n’afọ 2021,
ụlọikpe ukwu a nyere iwu ka a kwụọ ezinaụlọ Ifeanyi Onyekwere bụkwa onye
ọzọ nwụrụ n’aka ndị uweojii a na 2019 n’okwu izu ohi a, ụgwọ iti aka n’obi ruru
nde naịra 50.
Akụkọ ọnwụ mmadụ anọ a
bụ Ifeanyi Onyekwere, Victor Ogbonna, Osaze Friday na Ifeanyi Osuji, nke
mere ọtụtụ jiri katọọ ndị uweojii Naịjirịa ma kwụpụta iwe ha na soshal midia
nke isi okwu ya bịara bụrụ ‘Ikoku-4’.
E boro ndị a ebubo
izu otu ụgbọala mana onye nwe ya bụ ụgbọala mechara zipụta ozi na ya bụ akụkọ bụ
ụgha dịka o kwuru na enweghi mgbe o jiri zipụta ozi na e zuuru ụgbọala ya.
E mechara chụọ mmadụ
anọ ndị uweojii bụ Ayogu Fidelis, Eke Chibuzor, Egbunefu Felix nakwa Rose
Georgewill, n’ọrụ maka okwu dịka a kpụpụrụ ha ụlọikpe.
Ya bụ okwu ka na-aga
n’ihu n’ụlọikoe ukwu nke Pọta Kọọtụ ugbua.