Poopu Francis esila ụlọọgwọ ọ nọ pụta ma kwuo okwu na ọ ka dị ndụ.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Uche Akolisa and Chukwunaeme Obiejesi
Ihe mere anyị jiri chụpụ nwoke a n'ụgbọelu anyị - Ibom Air
Ebe foto si, screengrab
Ụlọọrụ Ibom Air ekwuola ihe kpatara ha jiri chụpụ otu nwoke n'ike n'ụgbọala ha.
Cheta na e nwere ihe onyonyo nke na-efeghjarị na soshal midịa
nke gosiri otu nwoke na-eti mkpu sị, " Agaghị edu Tinubu n'iyi ọrụ dịka
onyeisiala Naịjirịa".
Ibom Air depụtara n'akwụkwọ ozi ha zipụịrụ na Twitter were sị na
agwa nwoke ahụ ezighị ezi ma na-eme kwa ka ndị nọ n'ụgbọelu hara ịnwe obi ụme
ala.
Ha dere sị, " Mgbe ọ chọghị ịkwụsị ihe ọ na-ekwu maọbụ jiri
nwayọ si n'ụgbọelu ahụ pụọ, ndị nchekwa anyị jiri ike kpụpụ ya".
Ha ji ohere rịọ ndị mmadụ mgbaghara ma sị na ha dị nikere ịhụ na
ndị mmadụ mere njem n'udo enweghị nsogbu ọbụla.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Ndị agha Naịjirịa egbuola ndị omekome ise na Kaduna Steeti
Ebe foto si, Nigerian army/Twitter
Ndị agha Naịjirịa nke One Mechanised Division egbuopla ndị omekome ise na mpaghara okpuruọchịchị Chikun nke dị na Kaduna Steeti.
Ọ bụ onye na-arụ dịka ọnụ na-ekwuchitere ndị agha bụ Musa Yahaya kwuru nke a n'ụbọchị frịde.
O kwuru na ndị agha napụtara ndị omekome a egbe Ak-47 anọ, mgbọ egbe isii ya na mgbọ egbe 24 nke 7.62mm, ọgbatumtum atọ, otu mma, ekwentị abụọ na ọgwụ.
Mba Rọshịa abụrụla onyeisi nzụkọ nchekwa ngalaba UN
Ebe foto si, Reuters
Mba Rọshịa abụrụla onyeisi nzụkọ na-ahụ maka nchekwa nke ngalaba United Nations.
Dịka iwu siri dị, mba ọbụla so na ngalaba a ga-abụ onyeisi nzụkọ nchekwa a kwa ọnwa 15 ọbụla.
Nke a pụtara na onyeisi nzụko a ugbua, bụ onye a na-achọ achọ maka arụ ọ kpara.
Yukren gbara mbọ ka Rọshịa hapụ ịnweta ọchịchị a kama ọ mịtaghị mkpụrụ.
Ọ bụ agha ha na Rọshịa na-alụ kamgbe Rọshịa wakporo mba ha butere nke a.
Ụlọikpe adaala ndị uweojii nha nde naịra 75 maka ọnwụ Chima Ikwunado
Ebe foto si, FACEBOOK/CHIMA IKWUNADO
Ụlọikpe ukwu nọ na Pọta Kọọtụ Rịvas steeti enyela iwu ka ndị uweojii kwụọ ezinaụlọ otu
nwaamadị aha ya bụ Chima Ikwunado maka etu ha siri megide ikike dịrị ya dịka
mmadụ ma gbuo ya.
Ezinaụlọ Ikwunada
bugara okwu ya ụlọikpe ma gbaa ndị uweojii akwụkwọ maka etu ya bụ nwaamadị onye
na-arụzị ụgbọala siri nwụọ n’aka ha.
Ikpe a dakwasịrị onyeisi
ndị uweojii Naịjirịa bụ Usman Alkali-Baba, Kọmịshọna ndị uweojii na
Rivas steeti, Onye bụbu ọchịagha ngabala uweojii ‘E-Crack’, onye uweojii Benson
Adetuyu nakwa mmadụ anọ ndị ọzọ achụrụla n’ọrụ uweojii.
Ọkaikpe S. I MARK kpere ikpe a nyere iwu a ma kwenye ihe ndị ọkaiwu ezinaụlọ a rịọrọ.
Ọkaiwu Princess
Lawrence nakwa ezinaụlọ nwaamadị a kwuru na obi dị ha ezigbo mma
maka mkpebi ụlọikpe mere n’okwu a.
Cheta na akụkọ nwoke
a pụtara na 2019 mgbe ndị uweojii nke ngalaba ‘Eagle-Crack Special Police Unit’
mekpara ya na ndị ọzọ na-arụ ụgbọala ahụ nke mere o jiri nwụọ.
Akụkọ a wuru ewu nke ọtụ
ji malite ịkpọ ya bụ akụkọ ‘Ikoku-4’.
A nwụchiri Chima oge
ahụ maka ebubo iji egbe gaa ohi mana atara ya ahụhụ ike ukwu nke mere o jiri nwụọ
n’aka ha.
Nnyocha ime ahụ ndị
uweojii mere n’ahụ ya kwuru na ọ bụ oke Shuga n’ime ahụ ya gburu ya mana ezinaụlọ
ya gbara isi akwara n’okwu ma jụ ikwenye nke a.
Nwa nwanne nne Chima
bụ Obinna Ezirim gara zute ya mgbe ọ no n’aka ndị uweojii oge ahụ gwara
BBC na ọ hụrụ ọtụtụ ọnya nakwa apa n’akụkụ ụkwụ ya dịka ọ rịọrọ ya ka o mee ihe
niile hụ na ọ pụtara n’aka ndị uweojii n’ihi na a taala ya oke ahụhụ.
Chetakwa na n’afọ 2021,
ụlọikpe ukwu a nyere iwu ka a kwụọ ezinaụlọ Ifeanyi Onyekwere bụkwa onye
ọzọ nwụrụ n’aka ndị uweojii a na 2019 n’okwu izu ohi a, ụgwọ iti aka n’obi ruru
nde naịra 50.
Akụkọ ọnwụ mmadụ anọ a
bụ Ifeanyi Onyekwere, Victor Ogbonna, Osaze Friday na Ifeanyi Osuji, nke
mere ọtụtụ jiri katọọ ndị uweojii Naịjirịa ma kwụpụta iwe ha na soshal midia
nke isi okwu ya bịara bụrụ ‘Ikoku-4’.
E boro ndị a ebubo
izu otu ụgbọala mana onye nwe ya bụ ụgbọala mechara zipụta ozi na ya bụ akụkọ bụ
ụgha dịka o kwuru na enweghi mgbe o jiri zipụta ozi na e zuuru ụgbọala ya.
E mechara chụọ mmadụ
anọ ndị uweojii bụ Ayogu Fidelis, Eke Chibuzor, Egbunefu Felix nakwa Rose
Georgewill, n’ọrụ maka okwu dịka a kpụpụrụ ha ụlọikpe.
Ya bụ okwu ka na-aga
n’ihu n’ụlọikoe ukwu nke Pọta Kọọtụ ugbua.
Gọọmentị agbachiela ụlọọgbakọ a nọ nye Peter Mbah ‘Cerfiticate of Return’
Nkọwa foto, Emume nyefe akwụkwọ mmeri
Ụlọọrụ na-ahụ maka ọrụ mwulite na mmepe
obodo n’Enugu bụ Enugu Capital Territory
Development Authority (ECTDA) agbachiela otu ụlọ ọgbakọ dị n’ime ụlọ
ndịna nọ n’Enugu bụ ebe ụlọọrụ Inec nọ mee emume nyefe Peter Mbah nakwa ndị
ụlọọmeiwu steeti ahụ akwụkwọ asamobodo mmeri nke ntuliaka 2023 na Tọọzde.
Cheta na n’ụbọchị e mere emume a na ndị
nọ ebe ahụ nụrụ ihe dara ka ogbunigwe nke mere ọsọ jiri tasuo ebe ahụ.
Mana ndị uweojii gbara mbọ mee ka ọha
nọrọ jụụ dịka ngalaba ha gbasara ihe metụtara ogbunigwe gara mee nyocha ebe ahụ
ma gbaa ama na ọ bụghị ogbunigwe.
Ha zipụtara ozi ma kwuo na ha na-eche na
ya bụ ụlọ mara jijiji nke mere ha ga-eji ziga ozi ka ndị ọrụ banyere ụlọ
lebanya n’ime ihe a mere.
Ụlọọrụ ECTADA ezipụtala ozi banyere ụlọọgbakọ
ahụ ma kwuo na ha nyochapụtara ihe dị aṅaa n’usoro e jiri rụo ya bụ ụlọọgbakọ
nke mere ha jiri agbachi ya iji hụ na ndị nwee ya bụ ụlọ mere ihe ha kwesịrị
ime iji hụ na o kwudosiriike.
Onyeisi ụlọọrụ a bụ Josef Onoh kwuru na ndị ọru gara ebe ahụ
n’ụbọchị Fraịdee ma mee nyocha nke gosiri na ụlọ ọgbakọ enweghi akwụkwọ ikike
zuruoke.
Ozi ya kwukwara na ụlọ
ọzọ nọ n’azụ ya bụ ụlọ a na-arụ ebe ahụ enweghikwa akwụkwọ ikike zuruoke nke
mere ha jiri gbachie ya.
O kwuru “Anyị na-agbachi
ụlọ abụọ a n’ihi na ha enweghi akwụkwọ ikike”
Poopu Francis ekwuola na ‘ọ ka dị ndụ’
Ebe foto si, Reuters
Nke a na-abịa
dịka ọ mara njakiri n’okwu a ka o sị ụlọọgwụ dị na Rome ebe ọ nọrọ abalị atọ were
pụta ma kọwa na ọ ka dị ndụ.
E bugara ya
ụlọọgwụ Gemelli n’ụbọchị Wenezde n’ihi na iku ume bịara ghara ịdịrị ya mfe ime.
E mechara
nyochapụta na o nwere ọrịa ume nke a na-akpọ ‘Bronchitis’.
Ọchịchị Ụka
Katọlịk na Vatican kwuburu na a ga-akpọghachite Poopu n’ụbọchị Satọdee ma mpụtara
nnyocha ime ahụ pụta.
Poopu dị afọ 86 kwuru:
“Egwu atụghị m, a ka dị m ndụ,”
nke a bụ
ihe ọ gwara ndị ntaakụkọ nakwa ndị nso nso ya bu anyị mmiri akwa bịa n’ogige ụlọọgwụ
ahụ tupu ụgbọala ebupụ ya.
Ọ nọ na-achị ọchị dịka ọ feere ndị nọ
ebe ahụ aka.
E buuru ya gaghachiwe Vatican ugbua.
Ahụ ọkụ a mere Poopu bịa n’oge kacha
ekpo ọkụ n’emume dị nsọ n’ụka Kraịsti bụ nke ncheta ọnwụ na mbilite Kraịsti.
Ọnụ na-ekwuru Vatican bụ Matteo Bruni
kwuru na a na-atụ anya na Poopu ga-esonye n’emume ‘Palm Sunday’.
Poopu onye mere ncheta afọ 10 ọ nọrọla n’ọchịchị
isi ụka Katọlịk n’afọ a, enweghi ọtụtụ nkụda ahụike nke gụnyere ọrịa mere ewepụ
otu ngụgụ ya mgbe ọ dị afọ 21.
Nsogbu ikpere ya na-enye ya emekwala ọ
nọzịe n’oche eji anyagharị ya nke bụ na ọ naghị akwụ ọtọ.
Ihe ndị egbochi beghi ya ịrụ ọrụ ya dịka
o mere njem gaa mba the Democratic Republic of Congo nakwa South Sudan na Febrụwarị
afọ a.
Chetakwa na ọ bụ ya dọọrọ onye bụbu bụ
Poopu Benedict XVI ụka n’emuma akwamozu ya.
Ụlọikpe mba Amerịka eboola Donald Trump ebubo mpụ
Ebe foto si, Getty Images
Ndị ọtụ ikpe nke ụlọikpe New York mba Amerịka eboola Donald Trump onye bụbu onyeisiala mba Amerịka ebubo na ọ kwụrụ otu nwaanyị eji Stormy Daniels mara ego ka o mechie ọnụ maka mmekọ ha abụọ nwere.
Nke a ga-eme ya onyeislala mba Amerịka mbụ ga-aga ụlọikpe agbanyeghị na ọ na-akwado ịzọ ọkwa onyeisiala mba ahụ ọzọ.
Amatabeghị ihe a ga-eji agba ya ikpe kama ụfọdụ ụlọ ntaakụko mba Amerịka na-ekwu na ebubo e boro Trump karịrị iri abụọ na anọ.
Ihe mere ndị mmadụ ji gbaa ọsọ ndụ n'Enugwu ebe INEC na-enye "Certificate or Return"
Ndị mmadụ gbakọrọ ịgba aka ebe taa dịka INEC na-enye ndị meriri n'ọkwa Gọvanọ na ụlọomeiwu asambodo ha gbara ọsọ ndụ dịka ụlọ ha nọ na ya mara jijiji.
Ndị mmadụ karịrị otu puku kachiri ntị bata na ya bụ ụlọnzuko na-agbanyeghị na ndị ọrụ nchekwa nwara ike ha ibelata ọnụọgụgụ ndị ga-abata.
Ya bụ ihe mgbagwoju anya maliteziri ka Mazi Peter Mbah na osote ya bụ Ifeanyị Ossai natachara"certificate of return" , ala ya bụ ụlọ mailtere maa jijiji ugboro abụọ nke kpatara ndị mmadụ ji gbawa ọsọ.
Ma ndị INEC, ma ndị uwe ojii, ndị pati gbapụrụ iro.
Commissioner Uweojii Enugwu bụ Ahmed Ammani nọkwa ebe ahụ oge ya bụ ihe mere.
Ndị nyocha uweojii bịakwara nyochaa ụlọ ahụ nke oma. Ka ọgachara 30mins, ndị INEC laghachiri azụ ga kpọchapụ ndị one iwu fọrọ afọ.
Dịka onye na ekwuchitere ndị uweojii n'Enugwu bụ Daniel Ndukwe siri kwuo onwebeghị onye maara ihe kpatara ya bụ ihe.
Ndị INEC Enugwu kwuru na ọ bụ ijignochie ọdachị ọbụla mere ha jiri chụpụsịa ndị mmadụ ezi ma kpọghachi nani ndị nta akụkọ wee mechazị ya mmemme.
Gọvanọ Okezie Ikpeazụ achụọla ndị enyemaka ya n’ọrụ
Ebe foto si, Ururu Aja/Facebook
Gọvanọ Abia
Steeti bụ Okezie Ikpeazu achụọla ndị niile o nyere ọrụ ndọrọndọrọ ọchịchị a kpọrọ
‘political appointees’ na steeti ahụ.
Nke a dị n’akwụkwọ
ozi nke odeakwụkwọ gọọmentị Abia Steeti bụ Chris Ezem wepụtara n’ụbọchị Tọzde 30
Maachị 2023.
Ndị nke a
metụtara bụ ndị ndụmọdụ ya pụrụiche nakwa ndị enyemaka ya pụrụiche, tinyere ndị
ọzọ.
Ikpeazu
nyere iwu sị ka onye ngụkọ ego Abia Steeti kwụọ ndị a ụgwọ ọnwa ha nke Maachị
2023.
O kelekwara
ha niile maka ọrụ ha rụụrụ steeti ma sị ha gaa nke ọma n’ebe ọzọ ha na-aga.
Nke a
ga-eme ka ọnụọgụgụ ndị ọ chụrụla n’ọrụ na nso nso oge ntuliaka aka rịa elu.
Aka anyị adịghị na nkata ibute ọgbaghara ọbụla na Naịjirịa – Labour Pati
Ebe foto si, Labour Party
Otu ndọrọndọrọ
ọchịchị Labour Pati ekwuola na aka ha adịghị na nkata ọbụla ga-ebute ọgbaghara
na Naịjirịa dịka Yunusa Tanko na-ekwuru si kwuo.
Nke a na-abịa
dịka ndị uweojii nzuzo nke Naịjirịa bụ Department of State Services (DSS) gbara
ama na o nwere ndị na-achọ itinye ọchịchị nchereoge bụ ‘interim government’ na
Naịjirịa.
Ọnụ
na-ekwuru bụ Peter Afunanya ṅụrụ iyi na ga ga-agba mbọ ịhụ na atụmatụ ndị a kụrụ
afọ n’ala. Ọ gakwara n’ihu kwuo na ha ma ndị na-akpa nkata a.
Na nzaghachị,
ọnụ na-ekwuru Labour Pati sị na onweghi nkata ọbụla ha na-akpa, ma sị na atụmatụ
a megidere ọchịchị gọọmentị.
“Anyị
esoghi na ndị na-akpa nkata ọbụla,” ka ọ gwara ndị ntaakụkọ Channels TV n’ụbọchị
Tọzde.
“Mana ihe m
na-ekwu bụ na anyị ga-echekwa ikike ndị Naịjirịa, ọ bụrụ na ihe na-eme ha adịghị
mma, anyị ga-eji ụzọ iwu kwadoro mee ngagharịiwe bụ nke ndị ọrụ nchekwa ga-echekwa
anyị. Ọ bụ ihe anyị ga-eme na-abụghị imegide iwu Naịjirịa.”
Ọ katọkwara
ndị ọrụ nchekwa maka echekwaghị ndị mmadụ n’oge ntuliaka, ma sị na e kweghi ụfọdụ
ndị nkwado ha tụọ vootu n’ụfọdụ ebe na Naịjirịa.
Tanko sị na
Labour Pati agaghị emegide iwu na-achị Naịjirịa kama ha ga-eso usoro iwu n’igosipụta
iwe ha.
Pope Francis na ha agbake site n'ute ọrịa - Vatican
Ebe foto si, Reuters
Onyeisi ụka
Katọlik bụ Pope Francis na ha agbake site n’ute ọrịa dịka a kpọgachara n’ụlọọgwụ
dịka o nwere nsogbu iku ume dịka ụlọụka Vatican si kwuo.
E bugaara
ya n’ụlọọgwụ Gemelli n’ụbọchị Wenesde maka inyocha ya ahụ.
Ọnụ
na-ekwuru ụlọụka Vatican bụ Matteo Bruni kwuru na a ga-aga n’ihu na-enye Pope dị
afọ 86 ọgwụgwọ.
“Pope
Francis ezuola ike ọfụma n’abalị.
“N’ụtụtụ a
dịka o richaara nri, ọ gụrụ akwụkwọ ntaakụkọ ma malite ọrụ ya.”
O kwuru na
Pope gakwara n’ụlọụka dị n’ime ụlọọgwụ ahụ bụ ebe ọ gara kpee ekpere.
Bruni ekwughi
kpọmkwem mgbe Pope ga-esi n’ụlọọgwụ pụta, ha kwuru na a na-atụ anya na ọ ga-anọ
ụbọchị ole na ole.
Ndị ọrụ ya
na ndị enyemaka ya pụrụiche so ya nọrọ n’ụlọọgwụ ahụ.
Nke a bụ
oge dị oke mkpa nye Pope dịka o nwere ọtụtụ ọrụ ndị oji n’aka tupu emume Easter
eruo.
Police enyela 'Portable' awa 72 ịbịa ụlọọrụ ha ma ọbụghị ya...
Ebe foto si, portablebaeby/Instagram
Ndị uweojii Ogun steeti enyela Habeeb Okikiola e ji Portable mara iwu na ọ nwere awa iri asaa na abụọ ka ọ bịa zara ọnụ ya n'ụlọọrụ ha ma ọbụghị ya ha anwuchie ya.
Ọ bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii steeti a bụ Abimbola Oyeyemi kwuru nke a dịka ihe onyony na-efegharị ebe Portable na-ekwu na otu onye ji ịntaneti ezu ohi eji 'Yahoo' mara zitere ndị uweojii nọ n'ihe onyonyo ahụ ka ha bịa nwuchie ya.
Kama Oyeyemi kwuru na ndị uweojii gara ịnwuchi Portable maka mkpesa otu onye kpesara nke kwuru na portable na ndị so ya tiri ya ihe.
Oyeyemi kwukwara na ezigarala ya ozi ihe ruru ugboro ise ka ọ bịa ụlọọrụ bịa zara ọnụ ya maka ya bụ mkpesa.
Maka ihe onyonyo a, Oyeyemi kwuru sị, "Ndị uweoji achọghị ka ọgbaaghara dapụta n'ụbọchị Tuzde. nke mere ka ọ gaa n'ihu mee ihe onyonyo ahụ ọ mere. Anyị edegarala ya akwụkwọ ugboro ise ka ọ bịa ụlọọrụ anyị, anyị ezigarala ya akwụkwọ ọzọkwa site n'aka Nna ya. Agbanyeghị na nna ya na-arịọ anyị biko, site taa ruo ụbọchị Frịde, anyị ga-anwuchi ya".
Gọọmentị ga-ebulite ụgwọ ọnwa ndị ọrụ - Chris Ngige
Ebe foto si, Federal Ministry of Labour/Twitter
Mịnista na-ahu maka ọrụ bụ Chris Ngige ekwuola n'ụbọchị wenezde na gọọmentị Naijirịa ekwetela iwelite ụgwọ ọnwa ndị ọrụ gọọmentị.
Ngige kwuru nke a mgbe ya na ndị ntaakụkọ Channels nwere mkparịtaụka ma sị na ya bụ ego mgbakwunye bụ iji nyere aka maka etu ọnụ ahịa nri na ihe ndị ọzọ si arị elu.
O kwuru sị,"Anyị agwala onyeisiala Passentị ole a ga-etinye, a na-atụ anya na ọ ga-ebido n'ọnwa Jenụwarị afọ 2023".
Ngige kwuru na mmachi ego ochie CBN mere gbochiri ndị omekome iji ego zụta vootu oge ntuliaka ma welata ọnọdụ enweghị nchekwa na Naịjirịa.
Kama o kwuru na-etu e siri hazie adịchaghị mma.
Unu abọọla chi
Soro anyị taa maka akụkọ niile ga-amasị gị
Mba Amerịka akpachiela ego dị $53.1m site n'aka Diezani na ndị ọzọ
Ebe foto si, Getty Images
Ngalaba
ikpe ziri ezi n’Amerịka ekwupụtala mkpebi ha nke sị na ha ga-akpachi ego ndị ọrụ
gọọmentị mba ọzọ si n’ụzọ mpụ bubata na mba ha.
Akwụkwọ sị
n’ụlọọrụ a pụta metụtara onye bụbu minista mmanụ agbidi na Naịjirịa bụ Diezani
Alison-Madueke na mmadụ abụọ ọzọ gụnyere Kolawole Akanni na Olajide Omokore.
Mkpebi a bụ
nke e mere na Mọnde sị ha ha kpachiri ọkpụrụkpụ ego dị nde dọla iri ise na atọ
($53.1m) nakwa ego mgbakwụnye dị nde dọla iri na isii ($16m).
Akwụkwọ ụlọikpe
gosiri na site n’afọ 2011 ruo 2015, na ndị ojiegoachụntaego Aluko na Omokore kwuru
Diezani ego aka azụ mgbe ọ bụ onyeisi ụlọọrụ mmadụ agbidi.
Nke a mere
ka Diezani nye ụlọọrụ ha ohere inwete ọrụngo metụtara mmanụ agbidi nke ego ha
buru ibu.
Ngalaba a sị
na ego aka azụ ndị a kwụrụ iji nwete ọrụngo a karịrị nde otu narị dọla bụ nke e
si na mba Amerịka bupụ bụ nke e ji zụọ ngwa ụlọ na California na New York nakwa
Galactica Star, ụgbọmmiri Yacht.
Ndị kwụpụtara
mkpachi ego a gụnyere;
Osote ọkaiwu gọọmentị Kenneth A. Onye ọrụ na ngalaba
ikpeziriezi n’okwu mpụ bụ Polite, Jr. Osote onyeisi nyocha n’ụlọọrụ nchekwa FBI bụ
Luis Quesada, Osote onyeisi nchekwa FBI ngalaba Washinton bụ David Sundberg nakwa
Jim Lee, onyeisi ngala nyocha mpụ.
N’afọ 2015, ngalaba FBI hiwere atụmatụ a kpọrọ ‘International Corruption
Squads’ na-eleba anya n’okwu mpụ metụtara mba ha na nke ndị ọzọ.
Ụtụtụ ọma
Ụnụ eteela ụra.
Taa bụ Wenezde, bụrụkwa ahịa Eke.
Daalụ maka isonyere anyị.
Ụfọdụ ndị nne n'Uganda na-arịọ onyeisiala ha ka ọ ghara ibinye aka n'iwu megidere ndị na-edịna okike ibe ha
Ebe foto si, Getty Images
Ụfọdụ otu ndị
nne n’Uganda bụ ndị ụmụ ha na-edịna ndị okike ibe ha ezigarala Onyeisiala mba
ahụ bụ Yoweri Museveni akwụkwọ ozi na-arịọ ya ka ọ ghara ibinyeaka n’iwu ọhụrụ
ga-atụ ndị a chọpụta na-edịna ndị ikike ibe ha nga ogologo oge.
N’akwụkwọ
ozi a nke ụfọdụ ụlọ ntaakụkọ mba ahụ kesara, ndị nne a kwuru ha chi obi n’aka
na-ele etu ndị ha cheere bụ ‘ndị ọkụ okpukperechi na-anụ n’obi, ndị ọchịchị
nakwa ndị na-achọghị iji anya hụ ndị na-edịna okike ibe ha’ si na-agba mbọ ịhụ
na a tara ụmụ ha akụkụ ma mee ha ka ndị na-abụghị mmadụ.
Iwu mba
Uganda megidere ndị mmadụ ịdịna okike ibe ha mana iwu ọhụrụ a na-eche ka
onyeisiala ha binyere chọrọ itinye ntarahụhụ ọhụrụ n’elu okwu a nke gụnyere ime
ka onye na-ekwupụtaghị maọbụ na-agbagharị gọọmentị ama maka onye ọbụla a
na-eche na-anyị onye okike ibe ya bụrụ onye dara iwu ma bụrụ onye ga-anata ntaramahụhụ.
Cheta na
izu gara aga, ndị omeiwu mba a wepụtara akwụkwọ iwu ga-amachi ụmụnwoke maọbụ ụmụnwaanyị
na-edịna okike ibe ha. Ndị mmadụ na mba a nwereike ịga mkpọrọ ogologo oge maọbụrụ
na Onyeisiala Yoweri Museveni bịanye aka n’iwu ugbua.
Mba 30
n‘Afrịka machịrị ndị mmadụ ịdịna okike ibe ha nke gụnyere Naịjirịa, Kenya,
Ghana na ndị ọzọ.
Onyeisiala Ghana ekwuola na e megharịla akụkụ ụfọdụ n'iwu megịdere ndị na-edịna okike ibe ha
Ebe foto si, AFP
Onyeisiala mba Ghana bụ Nana Akufo-Addo kwuru na Mọnde na iwu megidere ụmụnwoke na-edịna ụmụnwoke ibe ha nakwa ụmụnwaanyị na-edịna ụmụnwaanyị ibe ha nke ndị ụlọomeiwu mba ahụ na-arụrụitaụka maka ya, abụrụla ihe ‘emegharịrị’ site n’aka gọọmentị ya.
O kwuru nke a n’ọgbakọ izinye ndị ntaakụkọ ozi nke ya na osote onyeisiala mba Amerịka bụ Kamala Harris mere n’ụbọchị ahụ.
O kwupụtara na iwu a na-ewu abụghị atụmatụ gọọmentị kama na ọ bụ ihe ụfọdụ ndị nkiti wetaara ụlọomeiwu ha.
O kwuru na ọkaikpe gọọmentị ya zigaara ndị kọmịtịị ụlọomeiwu ihe iwu mba ha kwuru nakwa ihe iwu akwadoghi banyere mkpesa a ndị mmadụ na-eme n’okwu ndị na-edịna ndị okike ibe ha.
“Ihe ma ghọtara bụ na akụkụ gbara ọkpụrụkpụ n’iwu abụrụla ihe agbanwere site n’ozi ọkaikpe gọọmentị wetere” mana ọ kwụghị ihe ọzọ n’uju banyere okwu a.”
Onyeisiala Akufo-Addo ekweghị kwuo ihe ọ ga-eme ma ndị ụlọomeiwu binyeaka n’iwu a ga-emegide ndị na-edịna ndị okike ibe ha na Ghana dịka o kwuru na ọ ga-achọ ka ha tule ihe iwu nwereike isi metụta ikike dịrị ndị mmadụ.
Nwaada Harris kwuru na o gwaala Onyeisiala Akufo-Addo okwu maka ya bụ iwu ma kwuo na mba Amerịka na-eche n’iwu bụ metụtara ikike dịrị ndị mmadụ.
Ọ bụrụ na iwu a kpọrọ “Promotion of Proper Human Sexual Rights and Ghanaian Family Value Bill” dị ire, a ga-amalịte ịtụ ndị na-edịna ndị okike ibe ha nga dịka ikwado ikike dịrị ha ga-abụzị ihe megidere iwu na mba ahụ.
Ndị ụlọomeiwu mba Ghana mere okwu nrụrịtaụka n’ihu ọha banyere atụmatụ iwu a na 2021. O dobeghi anya mgbe ha ga-eme ntuliaka banyere inabata maọbụ ikagbu ya bụ iwu.
Ka ọ dị ugbua, mmadụ ejidere na-edịna onye okike ibe ya na Ghana na-aga nga ruo afo atọ ebe ọtụtụ ndị mmadụ anaghị akwado ụdịrị echiche a ma ncha mana iwu a dị ire, a ga-amalịte ịtụ ndị a nga ogologo afo karịa.
Akufo-Addo ekwubuola okwu n’oge gara aga megide ụmụnwoke ịlụ onwe ha nakwa ụmụnwaanyị ịlụ onwe dịka o kwuru na iwu mba ahụ agaghị akwado atụmatụ a n’ụwa a maọbụ n’ụwa ọzọ.
Germany ezigara Ukraine ụgbọala ogbunigwe bụ ọgbaraụwa gharịị
Ebe foto si, Getty Images
Mịnịstrị nchekwa nke mba Germany ekwuola na ha ezigarala mba Ukraine ụgbọala na-atụ ogbunigwe a kpọrọ 'Leopard 2 Tank' nke ụdị ya bụ ọgbaraụwa gharịị.
Ụgbọala ndị a -dị abụọ n'ọnụọgụ - so na nkwa enyemaka Germany kwere Ukraine n'agha ha na-alụ iji chekwaa mba ha na mwakpo mba Rọshịa wakporo ha.
Mịnịsta nchekwa mba Germany bụ Boris Pistorius kwuru na ha nwere olileanya na ụgbọala ndị ahụ ga-enyere Ukraine aka nke ukwuu n'ihu agha.
N'otu aka ahụ kwa, ụgbọala abụọ na-atụkwa ogbunigwe a kpọrọ 'Challenger 2' erukwaala mba Ukraine aka site na mba UK.
Ugboro ugboro ka mba Ukraiane na-akpọku mba Europe dị icheiche maka enyemaka ngwaọgụ, ego, nri na ihe ndị ọzọ n'agha mba Roshia na-ebuso ha.
Gọọmentị Ukraine ekwubeghị ma ha enwetala ụgbọala 'Leopard 2' abụọ ahụ si mba Germany, mana ha kwuru na ụgbọala 'Challenger 2' abụọ si mba UK erutela ha aka.
Mba UK kwuru na ndị agha mba Ukraine bịara nweta ọzụzụ maka etu e si anya ụgbọala 'tank' ndị ahụ alaghachila na mba ha.
Ihe anyị ma maka ọkụ gbara akụkụ ahịa 'Balogun Market' dị na Legọs steeti
Aha onyonyo, Ihe anyị ma maka ọkụ gbara n'akụkụ ahịa 'Balogun Market' dị na Legọs steeti
Ọkụ gbara akụkụotu ụlọ ebe ndị mmadụ
na-echekwa ngwaahịa ha n'ahịa 'Balogun Market' dị na Legọs n’ụtụtụ Tuzde a.
Amabeghị ihe kpatara ọkụ
a ugbua nke metụtaraụlọelu ogogo anọebe ndị mmadụ na-echekwa
ngwaahịa ha
n’ahịa a.
Ndị
ọrụ mgbanyụ ọkụ Legọs steeti mechara bịaruo ebe ahụ awa olemole ka ya bụ ọkụ malitere
ịgba.
Ọnụ
na-ekwuru ha bụ Amodu Shakiru gwara BBC Igbo n’ehihe Tuzde na ha gbara mbọ
mecha menyụọ ya bụ ọkụ dịka o kwuru na enweghi onye nwụrụ n’ihe ọdachị a
dapụtara ebe ahụ.
N’okwu
ya, ọ sị:
“Naanị
mmadụ ise merụrụ obere ahụ n’ebe ahụ ọkụ gbara mana enyela ha ọgwụgwụ ngwa
ngwa. Anyị na-eme nnyocha ịma ihe kpara ọkụ a.”
O
kwuru na ha ga-ezipụta ozi zuruoke banyere ihe a mere ebe ahụ n’oge adịghị
anya.
Ụfọdụ
ndị nọ ebe ahụ gwakwara onye ntaakụkọ BBC Igbo garụrụ ebe ahụ okwu ebubo nke
kwuru na ha ma na ọ bụ ndị mmadụ ma ụma mụnye ya bụ ọkụ iji megide otu agbụrụ
ndị na-ere ahịa ebe ahụ.
Shakiru
sara okwu a mgbe ya na BBC kwuru okwu ma kwuo:
“Ebubo
na ọ bụ ndị mmadụ munyere ọkụ a achịtaghị aja ugbua n’ihi enwebeghị ihe akaebe
gosiri nke a.”
O
kwuru na agbanyeghi nke a, na ya bụ ebubo ga-eru ndị uweojii Legọs steeti ntị
maka nnyocha zuruoke.
Ebubo olemole dapụtara na ụfọdụ ndị ma ụma mmunye ahịa ahụ ọkụ iji megide otu agbụrụ mana ndị uweojii steeti ahụ kụchapụrụ ya bụ akụkọ ma kwuo na enweghi ihe gosiri nke a dịka ha kwuru na ha na-enyocha ihe nwereike ịkpata ya bụ ọkụ.
A
na-eche na ngwaahịa ndị mmadụ e che ruru nde kwuru nde gbara ọkụ n’ebe ahụ.
Nke
a bụ maka na ọtụtụ ụlọ nọkọchara ọnụ na mpaghara ebe ahụ, ọzọkwa bụ na ọtụtụ
ndị mmadụ nke ngwaahịa ndị mmadụ nọkwa n’ime ha.
Nkọwa foto, Ụlọ ebe ọkụ bidoro gbawa na Balogun, Legọs
Nkọwa foto, Okporoụzọ ebe ọkụ na gbaa na Balogun na Legọs.