Igbo sị na ogoli lụọ di abụọ ọ mara nke ka ya mma.
Brazil ekwuola na onye chiburu ha mbụ ha chụdara n'ọchịchị kazị ha mma ugbua.
Ya mere ha ji kpọghachita onye chiburu ha mbụ bụ Luiz Inácio Lula da Silva ka ọ bịa chịa ha afọ anọ ọzọ na-abia.
Da Silva ji vootu dị pasentị iri ise na ụma itoolu (50.9) merie ogbo ya bụ Jair Bolsonaro na ndọrọndọrọ ọchị onyenisiala mba ahụ nke e mere ụnyaahụ bụ Sọnde.
Mana ịkpa oke ya bụ ndọrọndọrọ butere agaghị eji ọsọ laa n'obodo ahụ.
Mmerị Lula bụ ihe ịtụnaanya ma icheta otu o siri gaa mkpọrọ bụ nke ghara ya isonye na ndọrọndọrọ onyeisiala mba ahụ na 2018.
Lula gara mkpọrọ maka ịna ngarị n'aka onye ọrụ ngo iji nye ya ọrụ .
Lula nọrọ 580 na mkpọrọ tupu agbaghara ya nke nyere ya ohere ịbata na ndọrọndọrọ ọchịchị.
N'okwu ụkaọchị na okwu o jiri nabata mmeri ya, Lula sị, " ha chọbụrụ ili m na ndụ mana lee m ebe".
Ihe ise ikwesiri ịma maka Lula Da Silva
- Lula Da Silava gbara afọ iri asaa na asaa.
- O so n'otu ndị akaekpe na ndọrọndọrọ ọchịchị Brazil.
- Ọ chiburu Brazil n'afọ 2003 ruo 2010.
- A tụrụ ya mkpọrọ n'afọ 2018 bụ nke ha m,echara gbaghara ya.
Afa ndị nchọpụta gbara kwuburu na Lula ga-emeri, mana mgbe ha mere ntuilaka nke mbụ, onụọgụ o jiri gaa Bolsonaro ebughị ibu, ndị mmadụ gbanwere obi ha.
Ndị nsonso Bolsonaro ka na-akpọ Da Silva "onye ohi" agbenyeghị na-agbagharala Da Silva.
Ha sị na ihe ejiri gbaghara ya bụ na ekpeghị ya bụ ikpe nke ọma.
Ọ bụ eziokwu na e meriri Bolsonaro mana ọtụtụ ndị pati ya meriri ya bụ ọchịchị nke bụ na ọ gaghị adịrị Lula nfe n'ọchịchị ya.
Agbanyeghị, Lula abụghịzị ụmụazị na ndọrọndọrọ ọchịchị.