“Aga m aga
n’ihu ịbụ onye na-akwado ntuliaka ziri ezi, kwụrụ ọtọ ma nwee udo. Ekwuola m ya
ọtụtụ oge na esemokwu dapụtara na ntuliaka kwesịrị ka e mezie ya site n’ụlọikpe,
na-abụghị iji tigbuo zọgbuo.
Igbo ndị ọma anyị ekelee unu
Anyị na-asị unu ọnwa Nọvemba ọma ooo!
Bịa n'ọnyere anyị n'ọgbakọ nke taa.
Ọkụ agbagbuola mmadụ 11 n’ụzọ Four-Corner Enugu
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Ozi dị mkpa: Marakwa na ọ bụghị n'akụkụ Four-Corner ka e sere foto a
Nnukwu ihe ịkwa
akwa mere n'Enugwu steeti na abalị Sọnde n’ebe akụkụ okporoụzọ Four-Corner dịka
akụkọ na-ekwu na ọkụ gbagburu mmadụ iri na otu na-eme njem ebe
ahụ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugu steeti bụ Daniel Ndukwa gbara ama nke a ma kwuo na ụgbọala ahụ bu mmadụ 12. O kwukwara na ha amalite ọrụ nnyocha n'okwu ihe ọdachị a mere ebe ahụ.
Mkpa mkpa a
na-ekwu kpara metụtara ụgbọala bọọsụ bu mmadụ 12 si Owerre na-agafe Enugwu, mere dịka ndị ahụ zubere isi ebe ahụ malite njem ha gawa Kano steeti.
Dịka ndị nọ
ebe ahụ si kwuo, ngwa ngwa ha rutere n’akụkụ Four-Corner ahụ ka ya bụ ụgbọala gbabara
n’okpuru nnukwu ụgbọala ‘trailer’ kwụ n'akụkụ Akegbe-Ugwu ma nwuru ọkụ.
E kwuru na ọ
bụ naani otu onye ji ndụ ya pụta n’ihe ọdachị ahụ ebe mmadụ iri na atọ gbara ọkụ
kpam kpam.
Otu nwoke
bi ebe ahụ gwara BBC Igbo na nwoke ahụ dị ndụ nọ n’ụlọọgwụ UNTH nke Enugu ugbua
dịka ọ dị nso ebe ahụ.
Aga m achụ onye ọrụ nchekwa m ọbụla mekpara mmadụ ahụ - Ibezim
Osote Gọvanọ Anambra Steetị bụ Onyekachukwu Ibezim ekwuola na ọ bụghị eziokwu na ndị ọrụ nchekwa ya gbochiri ndị mmadụ ịbanye n'ọdọahịa 'SPAR' dị n'Enugwu n'oge ọ gara izụ ihe ebe ahụ.
Ibezim gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na ọ gara ebe ahụ kama na ndị mana o gbughi oge ọbụla n'ebe ahụ, na o nweghi mgbe ndị ọrụ nchekwa ya jiri chụpụ ndị bịara ịzụta ihe n'ebe ahụ.
N'okwu ya "Nke ahụ abụghị eziokwu, agara m ebe ahụ ịzụta ihe, egbughi m oge ọbụla m wee pụta".
"O nweghi onye ọbụla ndị ọrụ nchekwa m gbochiri ịbata bịa zụọ ihe."
Ibezim gara n'ihu kwuo na ọ bụrụ na o nwere onye ndị nchekwa ya mekpara ahụ, na ọ ga-arịọ onye ahụ mgbaghara ma taa onye ọrụ nchekwa ahụ ahụhụ ruru ya.
"Ọ bụrụgodi na o nwere onye ndị ọrụ nchekwa m mekpara ahụ, aga m arịọ mgbaghara ma taa onye ọrụ nchekwa ahụ ahụhụ ruru ya".
Nke a na-abịa dịka onye ntaakụkọ anyị hụrụ mgbe ndị nchekwa na-eso osote Gọvanọ mgbochiri ndị mmadụ ịbata bịa zụọ ihe n'ọdọahịa 'SPAR'.
Onyekachukwu Ibezim ji ọtụtụ ụgbọala karịrị iri n'ọnụọgụ wee gbachie ụzọ ebe ọdụahịa ahụ mgbe ọ bịara ịzụ ihe.
Ndị nchekwa so ya gụnyere ndị DSS na ndị uweojii karịrị ọgụ n'ise ma buruchaa egbe na-achụpụ ụfọdụ ndị n'ụzọ.
Otu Nwaanyi nọ ebe ahụ kwuru na akparamagwa ndị nchekwa a maka otu onye bụ ihe jọgburu udele ma sigbuo nkapi.
Lee ihe ndị mmadụ na-agabiga dịka ndị Bọsụ na-agba abụbọ ọrụ na Legọs Steeti
Nkọwa foto, Nke a bụ Iyana Oworo
Ndị na-eme njem ejirila anya hụ ntị ha taa na Legọs steeti dịka ndị ọkwọọ ụgbọala ọkachasị ndị Bọsụ eji Danfo mara na-agba abụbọ ọrụ maka ego ha sịrị ndị ọrụ NURTW na ngalaba ndị ọzọ na-ahazị njem na-ana ha.
Nkọwa foto, Nke a bụ Iyana Oworo
Ndị ụlọorụ a nke nọ n'okpuru Joint Drivers Welfare Association kpọpụtara ihe ha sị bụ iwe ha. Ya bụ ihe gụnyere :
1) Na ha akwadoghị ndị agboro ị na ha ego n'ụzọ na-ezịghị ezi
2) Ka mmekpa ahụ na iyi egwu nke gụnyere iji mma, egbe na ihe ndị ọzọ ha na-enweta n'aka ndị LASTMA, ndị 'Task Force' na ndị RRS>
3) Ka gọọmentị Legọs steeti rụọ ebe ụgbọala Bọsụ na-akwụsị ebu ndị mmadụ nke bụ 'Bus Stop', n'ihi na ndị LASTMA na-enye ha nsogbu dịka ha na-ebu ndị mmadụ n'ebe ndị mmadụ chere bụ bus Stop.
Nkọwa foto, Lee ọnọdụ Berger na Legọs
Nkọwa foto, Ọnọdụ Berger na Legọs
Nkọwa foto, Lee ka ụgbọala Bọsụ niile si kwuru n'Oshodi
Dịka ọ dị ugbua, mpaghara gụnyere Berger, Iyanoworo, Iyanoba na Orille bụ ebe abụbọ ọrụ a metụtara.
Ndị agha egbuola mmadụ asaa echere bụ ndị otu oyiegwu na Kaduna Steeti
Ebe foto si, Nigerian Army/Facebook
Nkọwa foto, Nke a bụ Foto ọzọ ebe ndị agha nọ n'ihu ọrụ
Ndị agha Naijirịa egbuola mmadụ asaa a na-eche bụ ndị otu oyiegwu na Kaduna Steeti.
Onye na-ahụ maka mgbasaozi ndị agha Naijirịa bụ Onyema Nwachukwu kwuru na ndị agha gburu mmadụ anọ n'ime ndị a na mpaghara Maidaro, Kagi Hill, Kusharki na Anguwan Madaki nke dị na okpuruọchịchị Birnin Gwari dị na steeti ahụ.
Ebe o kwuru na otu ndị agha ọzọ gburu mmadụ atọ n'ime ndị a ebe ha na-agba ọsọ n'ụgwụ Kagi.
Nwachukwu kwuru na anapụtara ndị a egbe AK-47 abụọ, mgbọ egbe, egbe Pump action, egbe ntụ, na-egbe ọka ndị obere.
Onye bụbu odeakwụkwọ gọọmentị Enugwu Steeti na ụmụakwụkwọ UNN atọọrọ enwerela onwe ya
Onye bụbu onye odeakwụkwọ gọọmentị Enugwu steeti bụ Dan Shere, ụmụ akwụkwọ Mahadum nke UNN na ndị ọzọ atọọrọ enwerela onwe ha n’aka ndị ntọ.
A tọọrọ ha n’ụtụtụ Tọzde n’okporoụzọ Nsukka/Opi kama ha mechara nwere onwe ha n’ụbọchị satọde.
Enwebeghị onye ma ma e nwere ụgwọ akwụrụ n’isi ha ka ha nwere onwe ha.
Kama ọṅụ dara na mahadum nke Naijirịa dị na Nsukka dịka ụfọdụ ndị a nwere onwe ha bụ ụmụakwụkwọ.
Ebe onye ọchịagha 82 Division bụ Umar Musa kwuru na ọ bụ ndị ntọ ka ndị ahụ bụ ma kwee ọha mmadụ nkwa na ha ga-ejide ndị ntọ ahụ niile ma taa ha ahụhụ.
Lula da Silva alọghachitela azụ dịka onyeisiala Brazil
Ebe foto si, Reuters
Igbo sị na ogoli lụọ di abụọ ọ mara nke ka ya mma.
Brazil ekwuola na onye chiburu ha mbụ ha chụdara n'ọchịchị kazị ha mma ugbua.
Ya mere ha ji kpọghachita onye chiburu ha mbụ bụ Luiz Inácio Lula da Silva ka ọ bịa chịa ha afọ anọ ọzọ na-abia.
Da Silva ji vootu dị pasentị iri ise na ụma itoolu (50.9) merie ogbo ya bụ Jair Bolsonaro na ndọrọndọrọ ọchị onyenisiala mba ahụ nke e mere ụnyaahụ bụ Sọnde.
Mana ịkpa oke ya bụ ndọrọndọrọ butere agaghị eji ọsọ laa n'obodo ahụ.
Mmerị Lula bụ ihe ịtụnaanya ma icheta otu o siri gaa mkpọrọ bụ nke ghara ya isonye na ndọrọndọrọ onyeisiala mba ahụ na 2018.
Lula gara mkpọrọ maka ịna ngarị n'aka onye ọrụ ngo iji nye ya ọrụ .
Lula nọrọ 580 na mkpọrọ tupu agbaghara ya nke nyere ya ohere ịbata na ndọrọndọrọ ọchịchị.
N'okwu ụkaọchị na okwu o jiri nabata mmeri ya, Lula sị, " ha chọbụrụ ili m na ndụ mana lee m ebe".
Ihe ise ikwesiri ịma maka Lula Da Silva
Lula Da Silava gbara afọ iri asaa na asaa.
O so n'otu ndị akaekpe na ndọrọndọrọ ọchịchị Brazil.
Ọ chiburu Brazil n'afọ 2003 ruo 2010.
A tụrụ ya mkpọrọ n'afọ 2018 bụ nke ha m,echara gbaghara ya.
Afa ndị nchọpụta gbara kwuburu na Lula ga-emeri, mana mgbe ha mere ntuilaka nke mbụ, onụọgụ o jiri gaa Bolsonaro ebughị ibu, ndị mmadụ gbanwere obi ha.
Ndị nsonso Bolsonaro ka na-akpọ Da Silva "onye ohi" agbenyeghị na-agbagharala Da Silva.
Ha sị na ihe ejiri gbaghara ya bụ na ekpeghị ya bụ ikpe nke ọma.
Ọ bụ eziokwu na e meriri Bolsonaro mana ọtụtụ ndị pati ya meriri ya bụ ọchịchị nke bụ na ọ gaghị adịrị Lula nfe n'ọchịchị ya.
Agbanyeghị, Lula abụghịzị ụmụazị na ndọrọndọrọ ọchịchị.
Ihe anyị ma gbasara ọgbakọ gbatagbata Muhammadu Buhari kpọrọ n'Abuja ụbọchị Mọnde
Ebe foto si, Nigeria Presidency
Onyeisiala Muhammadu Buhari akpọọla ọgbakọ ndị isi ọrụ nchekwa niile na Naịjirịa n'Abuja taa bụ Mọnde.
Ya bụ ozi dị n'ọba nzikọrịta ozi Twitter ụlọọrụ onyeisiala, ya bụ ọgbakọ ga-akpa maka ụzọ a ga-esi gbanye ọrụ nchekwa aja n'ukwu na Naịjirịa.
Nke a na-abịa dịka mba dị icheiche gbara afa na ndị omekome nwereike ịwakpo Abuja na Lagọs mgbe adịghị anya.
Ya bụ ozi ekwughị ka ọ bụ maka ya bụ afa ndị mba ofesi gbara butere ya bụ nzụkọ.
Mba Amerịka na UK gwara ndị be ha bi na Naịjirịa ka ha were ọsọ were ije gbapụ n'obodo a tupu ya bụ mwakpo abịa.
Ndị isi ọrụ nchekwa Naịjria sị ndị mmadụ atụla egwu na nsogbu adịghị n'obodo.
Ọ teela ọnọdụ nchekwa mebiri na Naịjirịa bụ ebe ohi na ntọ ka njọ ugbua.
Unu asaala chi e! Ya diri onye ọbụla mma taa bụ Nkwo
Ndị okenye
mpaghara Ugwu Naịjirịa bụ Northern Elders Forum, akpọkuola ndị Naịjirịa ka ha jụọ
ndị niile chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala ajụjụ etu ha ga-esi gboo nsogbu cheere Naịjirịa
n’ihu.
Ọnụ
na-ekwuru otu a bụ Baba Hakeem-Ahmed kwuru nke a mgbe ọ na-aza ajụjụ na
Channels TV n’ụbọchị Sọnde.
Nke a na-abịa
dịka ndị ndu mpaghara Ugwu hazichara ọgbakọ ebe ha kpọkuru ndị na-azọ ọkwa onyeisiala
ka ha bịa kwuo ihe ha ga-emere ndị Naịjirịa ọkachasị mpaghara Ugwu.
N'okwu ya “Naịjirịa
kwesịrị ịjụ ndị a na-azọ ọkwa ajụjụ, Anyị kwesịrị ịchọpụta onye e kwesiri ịtụkwasị
obi n’ime ndị a,”
“Ndị a
niile bụ ndị nwere ahụmihe banyere ọchịchi, ọtụtụ n’ime ha bụ ndị chịrịla ọchịchị
na mbụ. Ha niile bụ ndị nwere ego iji azọ ọkwa kama e kwesịrị ileba anya n’ụdị
mmadụ ha bụ.”
Hakeem-Ahmed gara n'ihu kwuo na ọ ga-adị mma ka mpaghara Naịjirịa ndị ọzọ hazie ụdịrị ọgbakọ ahụ ha haziri na mpaghara Ugwu.
Igbo ndị ọma anya na-ekele unu
Obi ọma ka anyị ji anabata unu n'ọgbakọ anyị nke taa.
Buru oche gị bịa n'ọnyere anyị.
Ihe otu ndị Gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa kwuru n’ọgbakọ ha maka ESN, idemmiri, nchekwa...
Ebe foto si, Louis Amoke
Otu jịkọrọ
ndị gọvanọ Ọwụwa anyanwụ Naijirịa etiela mkpu maka ọnọdụ enweghị ezi nchekwa na-aga
n’ihu na mpaghara ahụ dịka ha na-akpa nkata ịjịkọ aka ọnụ buso ọnọdụ a agha.
Nke so na mkpebi ha mere n’ọgbakọ otu ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ
Naịjirịa e mere n’Enugu steeti n’ụbọchị Sọnde.
Akwụkwọ ozi si n’aka banyere ọgbakọ a dere:
‘Anyị na-etipụ mkpu maka ọnọdụ enweghị ezi nchekwa na
mpaghara anyị. Ihe a na-emetụta akụnụba anyị n’ụzọ ọjọọ dịka a na-atọ ma na-egbu
ndị mmadụ aghara agahara”
“Anyị na-akpọku gọọmentị etiti ka ha gbatara anyị ọsọ
enyemaka n’okwu a dịka oge ntuliaka ji ọsọ abịa”
“Anyị ekwekọrịtala n’atụmatụ ịjịkọ aka ọnụ hibe otu nchekwa
ga na-arụ ọrụ ngagharị n’akụkụ mpaghara anyị malite n’ụtụtụ ruo abalị kwa ụbọchị
ọkachasị n’akụkụ okporoụzọ dị iche cihe n’oge emume ekeresimesi a”
Otu jịkọkwara aka ọnụ kwuo na enweghị ihe jịkọrọ ha na otu
nchekwa nke Eastern Security Network (ESN), bụ otu nchekwa otu Indigenous
People of Biafra (Ipob) hibere.
Akwụkwọ ozi
ha dere “Ebubeagu nakwa Forestr Guards bụ ihe anyị jịkọrọ aka ọnụ hibe, nke a bụ
iji hụ na-enweghị onye ọbụla ma-ụma maọbụ ghara ịma ụma na-ekwu na anyị hibere
ESN”
N’okwu
banyere Nnamdi Kanu bụ onyendu otu Ipob, otu ndị gọvanọ dere “Anyị atụọla ntị n’ala
n’okwu a.”
“Anyị
kwetere na isi n’ụzọ mkparịtaụka nweta ntọhapụ Kanu ka bụ ihe kwere omume”
Ha
tinyekwara ọnụ n’ọnọdụ idemmiri na-akpa ike na Naịjirịa nke metụtakwara mpaghara
ahụ n’Anambra, Imo nakwa ebe ndị ọzọ.
“Anyị
ekpebiela ịtụkọta ego ọnụ zigara ndị ihe ọdachị a metụtara ihe enyemaka.”
Ha kpọkukwara
Gọọmentị etiti ka a gbatara ha ọsọ enyemaka ha hibe ụzọ mgbapụta n’okwu idemmiri
a.
Ebe foto si, Louis Amoke
Bola Tinubu anatala ekpere ngọzị n’aka Pa Reuben Fasoranti nke otu Afenifere
Ebe foto si, Bola Ahmed Tinubu/Facebook
Pa Reuben
Fasoranti bụ onye bụbụ onyeisi otu jịkọrọ ndị Yoruba a na-akpọ Afenifere
ekperela Bola Ahmed Tinubu bụ onye ji ọkọlọtọ pati All Progressives Congress (APC)
azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa 2023 ekpere n’ụbọchị Sọnde a.
Ozi sikwa n’aka ndị mgbasaozi patị ahụ kwukwara na Tinubu gosiri
Fasoranti akwụkwọ depụtara atụmatụ ndị o bu n’obi imezu ma o nweta mmeri na
ntuliaka 2023.
Nke a na-abịa dịka Pa Adebanjo bụ a onyeisi otu ahụ ugburu
kwuru ugboro ugboro na nkwado ya dịịrị ndị si Ọwụwa anyanwụ Naịjriịa azọ ọkwa a
n’ihi na ọ bụ ndị Ọwụwa Anyanwụ ka ọkwa ahụ ruru ugbua.
N'okwu ya "O nweghi esemokwu ọbụla mụ na Tinubu nwere,
onye m mere Gọvanọ Legọs Steeti.
"Ntuliaka afọ 2023 abụghị maka agbụrụ kama ọ bụ maka
ileban anya na nsogbu dị n'obodo.
"Otu Afenifere ekwuola ebe ha kwụụ na ntuliaka na-abịa
ma kọwaa ihe mere ha jiri kwụrụ na ya, ọ bụrụ na ọ dịghị onye ọbụla mma, ha
leba anya n'ihe bụ isiokwu".
Akwa mmiri dara n’India ataala isi ihe ruru mmadụ 40 ugbua
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Narị kwuru narị ndị mmadụ dabanyere n'ime mmiri a dịka ya bụ akwa mmiri dara
Ihe ruru mmadụ
40 anwụọla n’akụkụ Gujarat nke mba India dịka otu akwa mmiri zere ebe ahụ.
Narị kwuru
narị ndị mmadụ banyere n’ime mmiri ebe ahụ dịka ihe onyonyo si n’ụlọntaakụkọ ndị
mba ahụ gosiri ebe ọtụtụ ji akụkụ akwa mmiri ahụ dara ada aka ma na-azọ ndụ ha.
Akụkụ
na-ekwu na ihe ruru mmadụ 400 nọ na-eme njem n’elu akwa mmiri ahụ tupu o zee.
Gọọmentị
mba ahụ ekwuola na atụmatụ mgbapụta ndị ọrụ gbata gbata na-aga n’ihu ebe ahụ ugbua.
Nke a na-abịa
dịka naanị abalị ole m ole gachara ka a gbapere akwa mmiri nke a gbachibụrụ
maka ịmezi ya.
A rụrụ akwa
mmiri a ogologo ya ruru mịta 230 mgbe Briten ka nọ na-achị mba India n’ebe oge Senchụrị
19.
Ihe onyonyo
si ebe apụta gosiri ka ndị mmadụ no nso mmiri ahụ na-agba mbọ ịgbapụta ndị danyere
na mmiri n’ihe ọdachị a dịka chị ji ike na-eji.
Ihe onyonyo
ọzọ gosikwara ebe ndị ọzọ danyere na mmiri ahụ ji ọsọ na-egwu mmiri awụfe ihe
neeti e tinyere i ji gbochie mmiri ebe ahụ.
Akwa mmiri
a a kpọrọ Julto Pool so
n’ebe nlere anya ọtụtụ ndị mmadụ na-abịa agba nkiri na mba ahụ.
Ndị ọrụ gbata gbata
si akụkụ ndị iche iche nakwa mpaghara agbataobi ebe ahụ awụchiela inyere aka n’ọrụ
mgbapụta na-aga n’ihu ebe ahụ.
Praịm minista mba ahụ
bụ Narendra Modi onye sikwa na mpaghara Gujarat emeela njem mgbarụ ebe ahụ ma kwuo na
ihe na “ihe ọdachị a mere na-ewute m nke ukwuu”
Modi
ekwuola na aga enye ndị ihe ọdachị a metụtara nakwa ndị ezinaụlọ ha onyinye
enyemaka iji tie ha aka n’obi.
Ngosị iwe: Ụgbọala bọọsụ agaghị agba na Legọs ruo abalị asaa – Otu jịkọrọ ndị ọkwọ ụgbọala
Ebe foto si, Reuters
Otu jịkọrọ
ndị ọkwọ ụgbọala bọọsụ na Legọs
steeti ezipụtala ozi na malịte n’ụbọchị Mọnde ha
agaghị ebu ndị mmadụ ruo abalị asaa na steeti ahụ iji gosi iwe ha.
Nke a bụ maka ebubo na ndị na-ahụ maka nlekọta ọrụ ha gụnyere
ndị na-elekọta ebe ha na-eburu ndị mmadụ na-ana ha ọtụtụ ego ụtụ isi aghara
aghara.
Onyeisi otu jịkọrọ ndị ọkwọ ụgbọala na Naịjirịa bụ Joint
Drivers' Welfare Association of Nigeria (JDWAN) kwuru nke a n’akwụkwọ ozi
o zipụtara na ngwụcha izu a.
O dere “Ọ bụ ihe mwute nye anyị na agbanyeghị na anyị dị
uchu n’ọrụ anyị, e ji ụtụ isi emekpa anyị ahụ aghara aghara.”
Akintade Abiodun gara n’ihu kwuo na ọ bụ ego ndị a na-ana
ha mere ọnụ ego nrị na ihe ndị ọzọ jiri ria elu na Legọs karịa steeti ndị ọzọ ma
kwukwa na ndị otu na-emefu ihe karịrị ọkara ego na-enweta n’ọrụ ha n’aka ndị
na-ana ụtụ isi na steeti ahụ.
Ebe foto si, Getty Images
Kedụ ihe ndị otu a chọrọ?
Ka a kwụsị ịna ha ego ụtụ isi ibu mmadụ atọ a kpọrọ ‘three passengers money’ dịka ha chọrọ ịkwụ ego naanị otu onye
Ha chọrọ ka naanị ndị ọrụ gọọmentị Legọs steeti na-ana ha ego akwụkwọ ikike ịgba bụ ‘Ticket’ na Bekee
Ha chọrọ ka gọọmentị kwụsị ndị agbaro ọrụ na steeti dịka ọ bụ ha na-ana ha ego aghara aghara n’akụkụ steeti ahụ niile ma hibe usoro ziri ezi maka ịna ego nke ga-esi n’aka naanị ha
Ha chọrọ ka gọọmentị tinyeanya ma kwụsị nakwa gbochie atụmatụ mmekpa ahụ ọbụla nke ha kwuru na ndị ọrụ nchekwa okporoụzọ dị iche iche ji anyụ ha ịkpakwụ
Ha chọrọ na gọọmentị Legọs steeti wepụta ụgbọala ha chọrọ ka na-agba n’akụkụ steeti ahụ niile dịka ọ bụ ihe a so akpata nwụchị na mmekpa ahụ ndị otu a
Otu JDWAN kwuru na ọ bụrụ na gọọmentị steeti ahụ egeghị ha ntị na ha ga-eme ọtụtụ ngagharịiwe nakwa ihe ngosị iwe ndị ọzọ.
Kọmịshọna mgbasozi steeti ahụ bụ Gbenga Omotosho ekwuola na ha na otu a amalitela mkparịtaụka iji leba anya n’okwu ihe ndị ha chọrọ.
Legọs steeti bụ akụkụ Naịjirịa ebe ndị mmadụ kacha nọrọ nakwa biri nke bụ na ihe a ga-emetụta ọtụtụ ndị mmadụ n’ụzọ ọjọọ malite n’ụbọchị mmadụ.
Ọha ndị mmadụ na-atụ anya na kpachị kpachị ụzọ ga-ejupụta ebe niile dịka ego ime njem nakwa ego ihe ndị ọzọ ga-arị elu n’izu a na-abịa abịa.
Somalia Mogadishu bombings: Etu ogbunigwe abụọ si gbaa na Somalia ma gbuo mmadụ 100
Ebe foto si, AFP
Ogbunigwe
abụọ gbara n’akụkụ otu okporoụzọ ọtụtụ ndị mmadụ na-agba na Mogadishu nke mba
Somalia ma gbuo ihe karịarị mmadụ 100 dịka
onyeisiala ha bụ Sheikh Mohamud siri kwuo.
Ụlọntaakụkọ AFP News kwuru
na onyeisisala Mohamud gbara ama na “Ụfọdụ ndị nwụrụ n’ihe ọdachị a gụnyere ndị
nna nakwa ụmụ ha ka ku n’aka”
Ọ gara n’ihu rịọ ndị mba
ndị ọzọ ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka n’izitere ha ihe enyemaka maka ahụike mmadụ
300 merụrụ ahụ.
Onyeisiala mba a kwukwara
na ọ bụ otu al-Shabab bụ ndị agha nnupuisi bụ ihe mere mwakpo ahụ dịka ya bụ mwakpo zubere imetụta ụlọọrụ
ministri agụmakwụkwọ mba ahụ.
Website mgbasozi
na-akwado otu al-Shabab bụ Somali Memo agbaala ama na ọ bụ ha mere
ya bụ mwakpo n’ezie.
Gọọmentị mba a na otu al-Shabab
bụ otu gbadoro ụkwụ na nzụmụkwụ otu nnupụisi ọzọ bụ al-Qaeda, na-ebuso onwe ha
agha kemgbe afọ ole m ole ugbua.
Dịka ọnwe ise gachara
mgbe onyeisiala Mohamud malịtere ọchịchị ya, ọ ṅụrụ iyi ibusosi ndị agha nnupụisi
a agha n’ụzọ pụrụiche dịka ha wakporo otu ụlọ ndịda ana Mogadisu ma gbuo ihe
karịrị mmadụ 21 n’ọnwa Ọgọọst.
Ihe ọdachị ogbunigwe a
mere n’ụbọchị Satọdee so onwe ha n’azụ nke bụ na dịka otu gbachara nkeji ole m
ole bịara gaa nke ọzọ agbapukwa ma kụsa ọtụtụ ụlọ nakwa ụgbọala nọ ebe ahụ.
Ụlọ ntaakụkọ Reuters
kwuru na nke mbụ metụtara ụlọọrụ ministri agụmakwụkwọ ha ebe nke ọzọ gbapuru mgbe
ndị ọrụ ahụike nke gbatagbata wụchiri ebe ahụ na nkeji ole m ole.
Cheta na e nweela mgbe
otu nnukwuu ụgbọala gbapuru ka ogbunigwe n’otu ebe ahụ n’afọ ise gara aga nke
gburu ihe karịrị mmadụ 500.
Kwupụta ebe unu si nwete ego unu ji azọ ọkwa Onyeisiala - SERAP
Ebe foto si, Twitter
Otu kpọrọ onwe ha Socio-Economic Rights and Accountability Project
(SERAP) agwala ndị niile na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa ka ha kwupụta ebe ha si
enwete ego ha ji azọ ọkwa ọchịchị.
Nke a dị n’akwụkwọ ozi otu a degara ndị niile
na-azọ ọkwa onyeisiala n’ụbọchị Satọde 29 Ọktọba 2022 nke osote onyeisi ha bụ
Kolawole Oluwadare wepụtara.
Ha sị na ọ bụrụ ndị Naịjirịa mara ebe ndị si enwete
ego na ọ ga-enye aka inyocha ha ọfụma ma jide ha ma ọ bụrụ ha emeghi ọfụma.
Akwụkwọ ozi a sị na SERAP ga-eji usoro jichie
onye ọbụla na-azọ ọkwa Onyeisiala nke dara iwu banyere iji ego achụmnta vootu.
Ha kọwara na imefu ọtụtụ ego n’oge achụmnta
vootu nwereike ịmetọ usoro ntuliaka ma mee ka ọ bụrụ naanị ndị ji ego ga-azọ ọkwa
ọchịchị.
SERAP gwara ndị a ka ha kpokuo ndị ụlọọrụ na-ebuagha
megide mpụ na nrụrụaka ego dịka EFCC na ICPC ka gbaa ama etu ha si emefu ego n’oge
ntuliaka.