Azọgbuola ihe ruru mmadụ 174 n'ọgbọ egwuregwu n'Indonesia

Ọtụtụ mmadụ nwụrụ ebe ụfọdụ meruru ahụ n'ama egwuregwu dị n'Indonesia.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. North Korea atụọla Ogbunigwe fefere mba Japan

    North Korea

    Ebe foto si, Getty Images

    Mba North Korea atụọla ogbunigwe ‘missile’ fefere na mba Japan, dịka ọtụtụ na-ekwu na ha kpacha anya mee nke a iji kpasuo mba Japan na mba Amerịka iwe.

    Ogbunigwe ‘ballistic missile’ a gara njem ihe karịrị kilomita 4,5000 tupu ọ daa n’ime oke osimiri Pacific - Ọ bụrụ na ọ gara ụzọ ọzọ, ọ gaara eru mpaghara Guam nke mba Amerịka nwe.

    Nke a bụ ogbunigwe mbụ North Korea na-atụ na-agafe mba Japan kamgbe afọ 2017.

    Nke a mere ka ndị ọrụ nchekwa na mba Japan zipu ozi na-agwa ụfọdụ ndị mba ha ka ha kee nkwụcha.

    People in the north of Japan, including Hokkaido island and Aomori city, reportedly woke up to the noise of sirens and text alerts which read: "North Korea appears to have launched a missile. Please evacuate into buildings or underground."

    Otu mba ụwa bụ United Nations machiri North Korea ịtụ ogbunigwe ballistic na ogbunigwe nuclear.

    Ịtụ ogbunigwe ka ọ gafee mba ọzọ bụkwa ihe a machiri amachi n'ihi na ọ bụ ichọ okwu.

  2. Lula da Silva na Bolsonaro ga-achịpụ ya n'agba nke abụọ nke ntuliaka mba Brazil

    Brazil election

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Bolsonaro bụ onye na-achị mba Brazil ugbua, ebe Lula da Silva bụ onbye chịburu Brazil n'oge mbụ

    Ntuliaka ọkwa Onyeisiala na mba Brtazil ga-abanye agba nke abụọ dịka onweghị onye nwetazuru ole vootu iwu kwuru iji merie ya bụ ntuliaka n’agba nke mbụ.

    Ndọrọndọrọ a ga-adị n’etiti aka chịburu mba ahụ bụ Luiz Lula da Silva na onye na-achị ugbua bụ Jair Bolsonaro n’izuụka anọ na-abịa abịa.

    N'agba nke mbụ nke ntuliaka a, Lula nwetara vootu 48% ebe Bolosonaro nwetara 43%, mana iwu Brazil kwuru na mmadụ kwesịrị inweta ihe gafere 50% iji merie n'agba nke mbụ.

  3. "Wike, Ortom, Makinde, na dị ọzọ obi adịghị mma na Pati anyị ga-eso anyị rụọ ọrụ" - Ifeanyi Okowa

    Ifeanyi Okowa na ndị BoT

    Ebe foto si, Ifeanyi Okowa/Twitter

    Dịka a na-ejikere ntuliaka na Naịjiria n'afọ 2023, Gọvanọ Ifeanyi Okowa nke Delta Steeti bụkwa Osote Atiku Abubakar nke Peoples Democratic Party (PDP) na ntụlịaka onyeisiala nke 2023 ekwuola na ndị otu ha niile obi ọjọọ ji maka otu ihe maọbụ abụọ na pati ha ga-eso ha rụọ ọrụ na ya bụ ntuliaka.

    Ụfọdụ ndị obi adịghị mma maka amaghịeme ndị PDP bụ Gọvanọ River Steeti bụ Nyesom Wike, nke Oyo steeti bụ Seyi Makinde; Nke Benue bụ Samuel Ortom; Nke Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu; Nke Enugu bụ Ifeanyi Ugwuanyi; Ọkammụta Jerry Gana; Bode George na ndị ọzọ.

    Ka ha mechere ọgbakọ ndị BoT ha mere n'Abuja, Okowa sị na "ndị a kpọrọ aha agaghị emebi pati anyị, kama ha ga-eso anyịrụọ ọrụ".

    Ọ sị na ha na-akpakọrịta nkata n'ime onwe ha. "Ama m na anyị ka nwere ọtụtụ ihe anyị ka ga-eme, mana anyị emeela ọtụtụ ihe. Ọ ka fọrọ nwe ihe anyị ka ga-akpakwụ aka ka ihe niile dịzịa mma. Ọ bụ ya ka i jiri hụ ọtụtụ ebe a".

    "Anyị kpara ọtụtụ ihe gbasara ihe anyị ga-eme na ihe anyị ga-eme gawa n'ihu. Izu gara aga, anyị gara ọkpakọ n'Enugu, nwanne anyị nwoke nabatara aba anyị nke ọma. Anyị kpara ọtụtụ ihe gbasara ọdimma ndị ọnwụnwa anyanwụ".

    "Ama kwa m na i chetere na anyị gakwara ndịda anyanwu ebe nwanne anyị Seyi Makinde nabatara anyị nke ọma. E ji m aka na anyị ga-emezi ihe ndị fọrọ afọ ka udo chia".

    Onyeisi ndị BoT ha bụ Adol­phus Wabara kwuru na ha bịara ihe Osote onyeisi ha ka ha na ya tinye ọnụ n'okwu gbasara ọdịmma pati ha.

    "Ugbua ya bụ Komitii ehiwere maka ikpe udo na Naịjirịa amatala ọtụtụ ihe, ugbua anyị ga-amapụzị njem".

    "Mgbe adịghị anya, anyị na onyeisi anyị bụ Atiku ka ahụ. Emechaa anyị na Wike ahụzịa".

    "Anyị agakwaala hụ ọtụtụ ndị mmadụ nke gụnyere Gọvernọ SamuelOrtom, Gọvernọ Seyi Ma­kinde, Gọvernọ Ahmadu Fintri, Gọvernọ Ikpeazu na Ugwuanyi nkeEnugu steeti.”

  4. Azọgbuola ihe ruru mmadụ 174 n'ọgbọ egwuregwu n'Indonesia

    Ndị uweojii n'Indonasia

    Ebe foto si, EPA

    Opekata mpe ihe dịka mmadụ otu narị iri asaa na anọ (174) anwụọla na ọsọndụ ndị mmadụ gbara mgbe ọgbara dapụtara na asọmpi ndị Arema FC na Persebaya n'Indonesia.

    Akụkọ na-akọ na ndị na-agba ọsọ zọgburu ibe ha mgbe ndị uweojii gbara anwụrụ anya mmiri iji kwụsị ọgbaghara dapụtara na-etiti ndị nkwado otu egwubọọlụ abụọ a.

    Ihe ruru mmadụ otu narị na iri asatọ mekwụkwara ahụ na ya bụ ọgbaghara dapụtara n'etiti otu egwubọọlọ abụọ ahụ hụrụ onwe ha hụkpọọ anya.

    Akụkọ na-ekwụkwa na ama otu egwubọọlụ abụọ a dịka ndị na-ekwosa onwe ha ekworo.

    Ndị Persebaya meriri Arema FC na be ha na ya bụ bọọlụ ha gbara ụbọchị Satọde na Malang,dị na ọwụwa nyanyụ mba Java.

    Ka ndị mmadụ hụrụ na nsogbu achọwala ịda, ọtụtụ malitere ịgbapụwa.

    Nke a mere ịzọ jiri chie. ndị mmadụ malite iri ibe ha elu.

    Otu onye nọ ebe ahụ mgbe ihe a mere aha ya bụ DWI gwara ndị ntaakụkọ na ya "hụrụ ebe a na-erị ọtụtụ mmadụ elụ".

    Oge mbụ akụkọ na-ekwubu na ndị nwụrụ na ya bụ ọdachi dị 130 mana emechere hụ na o ruru 174 ebe mmadụ 11 ọzọ meruru ezigbo ahụ.

    Onyeisiala mba Indonesia bụ Joko Widodo enyela iwu ka akwụsị ịgba egwuregwu bọọlụ na mba ahụ rụọ mgbe amatara ihe butere ọgbatauhie ụdịrị nke ụwa ahụbeghị.

    Otu na-achịkọta egwuregwubọọlụ n'ụwa bụ Fifa adọbuola aka na ntị ka aghara iji anwụrụ anyammiri gbooọgụ maọbụ kwusi ọgbaghara n'ama egwuregwu.

    Mana ihe onyonyo si ebe ahụ pụta gosiri ka ndị mmadụ si gbabata n'ama egwuregwu mgbe e gbubiri bọọlụ ahụ nakwa ka ndị uweojii si agba anwụrụ anyammiiri mgbe ndị Persebaya ji ọkpụ atọ asatara abụọ merie ndị Arema na be ha.

  5. Amerịka na Venezuela agbaweela ndị nga ha ji eji

    Ndị nga a gbanwere

    Ebe foto si, Reuters

    Mba Amerịka na Venezuela agbaweela ndị nga ha ji eji.

    Amerịka tọhapụrụ ndị nga asaa maka abụọ ndị Venezuela nke bụ ụmụnwaane nwunye onyeisiala ha bụ Nicolas Maduro.

    Amerịka tụrụ ndị ahụ mkpọrọ ọnwa iri na asatọ maka ịzụ ahịa ogwụike.

    Mana ndị Venezuela kwara ndị mmadụ na ndị ahapụrụ bụ ndị ndị aka ha dị ọcha ndị Amerịka ji na mkpọrọ.

    Ha kwukara na ha tọhapụrụ ndị Amerịka ha ji "maka obi ebere".

    Ndị Amerịka ha hapụrụ bụ mmadụ ise na-arụ ọrụ n'ụlọọrụ na-emepụta mmanụ agbidi.

    Ndị Amerịka ahụ bụ Tomeu Vadell, Jose Luis Zambrano, Alirio Zambrano, Jorge Toledo na Jose Pereira.

    A tụrụ ndị a nga afọ ise dịka e jidere ha na ebe a kpọrọ ha oku maka ọgbakọ, bo ha ebubo inyindụ egwụ.

    Onyeisiala Joe Biden sị na "mgbe adịghị anya, ndị Amerịka ahụ eboro ebubo ụgha ga-agakwuru ezinaụlọ ha".

  6. Amerika agbarụọla ihu dịka Putin akpakọrọla mpaghara Yukren anọ

    Vladmir Putin

    Ebe foto si, Getty Images

    Vladmir Putin anatala nkatọ n'aka Amerịka gbasara ala ndị Yukren ọ kpakọọrọ na nsonso a.

    Putin kpakọọrọ obodo anọ dị Ukraine na-ekwu na 'referadum ntuliaka ha mere gosiri na ndị ahụ chọziri iso na Rọshịa.

    Onyeisiala Amerịka bụ Joe Biden kwuru sị, "Amerịka agaghị anabatalata ụkwụ Rọshịa manyere n'ala Yukren."

    N'otu aka ahụ, Onyeisi otu United Nations bụ António Guterres katọkwara ihe Putin mere ma kwuo na ịkpara alal Yukren ekweghị iwu kwadoro ya kama na o kwesịrị ka onye ọbụla katọọ ya.

  7. Ndịagha eweghara ọchịchị n'ike ọzọ na Burkina Faso

    Ndiagha oge ha na-agba ozi n'ikuku na mba ahụ

    Ebe foto si, RADIO TÉLÉVISION DU BURKINA

    Onyeagha bụ Kaptin na mba Burkina Faso ekwuputala n'ihe onyonyo TV mba ahụ na ya achudaala onyeisial onye agha mba ahụ bụ Lt Col Paul-Henri Damiba.

    Ibrahim Traore kwuru na nke a bu n'ihi na Damiba akwụsịlighị nsogbu ndị agha nnupuisi Islam na-enye nsogbu na mba ahụ.'

    Nke a bụ nke ugboro abụọ a na-eweghara ọchịchị n'ike na mba ahụ dịka Damiba mere nke ya n'ọnwa Jenụwarị afọ a(2022).

    Damiba kwuru na ọ bụ maka nsogbu ndị agha islam mana ọ kwụsịlighị nsogbu ahụ.

    N'ụbọchị Monde, e gburu ndị agha 11 dịka ha na-edu ụgbọala ndị nkịtị na mpaghara ugwu mba ahụ.

    Traore kwuru na e mechiela oke ala mba ahụ na mba ndị gbara ya okirikiri ma kwụsịkwa ihe ndọrọndọrọ ọchịchị nile were rue mgbe a ga-ekwurugharị ya.

  8. Unu asaala Chi e. Ụbọchị taa bụ Orie ga-anwara anyị oji. Ndụ nwoke na ndụ nwaanyị.

  9. Etu e si chọta ozu otiegwu Chopboi na ndị enyi ya atọ n'Abuja, ChopBoii, onye otiegwu ezigbo aha ya bụ Anpe Pankyes Samson, ka a hụrụ ozu ya na ndị ọzọ n'Abụja

    Anpe Pankyes Samson, bụ otiegwu e jiri aha ChopBoii mara, tupu ọ ọnwụ ya

    Ebe foto si, ChopBoii/Instagram

    Akụkọ ọhụrụ apụtala maka ọnwụ Anpe Pankyes Samson, bụ otiegwu a ma dịka Chop Boii na Naịjiria, onye a hụrụ ozu ya na ndị enyi ya atọ n'ime ụlọ na Gwarimpa dị n'Abuja nso nso a.

    A chọtara ozu Chop Boii bụ onye si Plateau steeti, onye mmepụta egwu ya a ma dịka Beerollings, enyi nwaanyị Beerollings na otu nwoke ọzọ, n'ime ụlọ ahụ n'ụbọchị 26 nke ọnwa Septemba 2022.

  10. Hurricane Ian: Mmadụ iri anwụọla dịka ọchịchịrị gbara ebe niile

    Ndị ya bụ oke ifufe mmiri metụtara

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị ọrụ gbatagbata ekwuola na ihe ruru mmadụ iri anwụola na oke ifufe mmiri nke akpọrọ Ian na-awakpo mpaghara Florida dị na mba Amerịka.

    Dịka ọ dị ugbua, a ka na-achọ na-azọpụta ndị mmadụ tọrọ n'ime ulọ ha nakwa n'ime ụgbọala ha.

    Onyeisiala Joe Biden adọọla aka na ntị na oke ifufe mmiri a nwereike ịbụ nke kachasị njọ kemgbe Florida malitere ma kwukwa na o nwereike ịta isi ọtụtụ mmadụ.

    Ndị agha mba ahụ na-aga n'ụzọ n'ụzọ ndị mmadụ na-akụ aka na-achọpụta ma nakwa azọpụta ndị tọrọ n'ime ụlọ ha.

    Oke ifufe mmiri a awakpobuola otu akụkụ mba Cuba ebe o mebiri ọkụ latrik, gbuo ndị mmadụ ma chụpụ ọtụtụ ndị mmadụ be ha.

  11. Ịbọọla chi ụmụ Igbo?

    Nnọọnụ na peeji anyị taa.

    Ihe anyị ga-ewetara gị bụ akụkọ dị ọkụ ka o si dị ọkụ na-ewu na mpaghara Naịjirịa nakwa Afrịka niile.

    Gba mbọ sonye anyị.

  12. Félicien Kabuga: Onye a na-ebo ebubo ọchụ agaala ụlọikpe mbaụwa na Hague

    Felicien Kabuga

    Ebe foto si, AFP

    Otu n'ime ndị a na-ebo ebubo mkpochapụ agbụrụ na Rwanda n'afọ 1994 ga-aga zara ọnụ ya na ụlọikpe ukwu mbaụwa dị na Hague.

    A na-ebo Félicien Kabuga na ọ gwadoro ndị gburu mmadụ ma jirikwa radio gbasaa okwu asị butere akpọmasị n'isi ndị Tutsi.

    Ndị Tutsi ruru 800,000 na ndị Hutus ụfọdụ nwụrụ na ya bụ agha.

    Agbanyeghị na onye ọkaiwụ Kabuga sị na ịkpe amaghị ya, Kabuga abịa ikpe ụbọchị mbụ ekpere ya bụ ikpe.

  13. Gọọmentị Anambra steeti amachiela otu ndị Keke nakwa nke ndị bọsụ na-agba steeti ahụ

    Charles Soludo

    Ebe foto si, Charles Soludo

    Gọọmentị Anambra steeti depụtara akwụkwọ maka mmachị ha machịrị ndị otu keke nakwa ndị nke bọọsụ na steetị ahụ.

    Ya bụ akwụkwọ ozi nke Kọmishọna mgbasa ozi bụ Paul Nwosu tinyere aka, kọwara na ihe kpatara ya bụ mmachi bụ maka etu ụfọdụ ndị otu a si azọ ọkwa onyeisioche ga-anakọta ego n'ọgbọ (park) ha.

    Maka nke a ka gọọmentị steetị ahụ jiri machie ndị otu a ọnwa isii ruo mgbe gbọọmentị ga-enyochacha ihe butere nsogbu n'etiti ha.

    Ha kwukwara na ndị otu a na-ebute ọgbaaghara n'obodo.

    Mmechi a ga-enyere ndị otu ahụ aka ịhazigharị onwe ha, họpụta ndị isi bụ nke gọomentị ga-amata dịka ndị isi ha.

    Gọọmentị na ndị otu a kwekọrịtaburu na ha ga-amailte ịna ụtụisi dị icheiche ma hiwekwa ụsọrọ enyemaka ga-nyere ndị ọkwọụgbọala aka, ọkachasị n'ahụike ha.

    Na ya bụ nkwekọrịta, ndị keke ga-amalịte ịkwụ N4,000 n'izuụka maọbụ N15,000 n'ọnwa.

    Ndị Keke nọ n'okpuruọchịchị asatọ ebe e nwere ọnọdụ onye apụla ezi n'abalị, ga-akwụ N3000 n'izụụka maọbụ N12,000 n'ọnwa.

    Ndị dị etu a ga-amalitekwa ịkwụ N4000 kwa izuụka nakwa N15,000 kwa ọnwa mgbe e wepuru ọnọdụ onye apụla ezi n'ogbe ha.

    Ndị bọọsụ ga-akwụwa N5000 kwa izu na N20,000 kwa ọnwa. Ndị bọọsụ ASUU ga-akwụwa N2500 kwa izu maọbụ N10,000 kwa ọnwa rụọ mgbe e mepere ụlọakwụkwọ, bụ mgbe ha ga-amalite ịkwụ N5,000 nakwa N20,000.

    Gọomentị sị na ibusa mmadụ n'ọdọ ụgbọala ndị gọọm̀entị bụzị n'efụ ugbua.

    Ha kwukwara na ndị draịva niile na-ebu ndị mmadụ ga-enwetazi ọgwụgwọ na-efu malite ugbua n'ụlọọgwụ gọọmentị niile ma ha nwee nsogbu ahụike.

    Gọomentị jikwa ohere chetere ndị mmadụ na ha ka machikwara ndị agboro nakwa ndị otu nzụzọ na-eji akaike ana ndị mmadụ ụtụisi ma sị na ọ bụ naanị ndị gọomentị họpụtara ga-anata ụtụisi obula.

    Ha dọrọ aka na ntị ka onye ọbụla chọrọ ịkwụ ụtụisi gaa kwụọ ya n'ụlọakụ maọbụ n'ụlọọrụ Anambra State Internal Revenue.

    DỊka ha mere na mbụ ha wepụtakwa akara ekwentị maka onye ọbụla hụrụ ndị agboro na-enye nsogbu ebe ọbụla.

    Akwụkwọ ntaakụkọ

    Ebe foto si, Akwụkwọ ntaakụkọ

    Akwụkwọ ntaakụkọ

    Ebe foto si, Akwụkwọ ntaakụkọ

  14. Ademola Adeleke enwetala mmeri n'ụlọikpe ukwu maka ntulịaka imeụlọ PDP n'Osun Steeti

    Adeleke_PDP

    Ebe foto si, Adeleke_PDP

    Nke na-akpọtụ taa bụ Tọzde bụ na Gọvanọ Osun steeti bụ Ademola Adeleke enwetala mmerị n'ụlọikpe ukwu nke dị n'Abuja maka akwụkwọ onye ya na ya zọrọ ọkwa ntuliaka imeụlọ Gọvanọ na PDP gbara ya.

    Onye ya na Adeleke zọrọ ya bụ ọkwa na PDP bụ Dotun Babayemi gbara ya akwụkwọ n'ụlọikpe na-ekwu na Adeleke emeriri ya na ya bụ ntuliaka PDP mere n'ụbọchị iri na isii nke ọnwa Julaị.

    Ya bụ ikpe nke ndị ọkaikpe ise kwadoro Adeleke sị na onye gbara ya bụ akwụkwọ agbaghị ya n'oge.

    Okaikpe ukwu kpebiri ya bụ ikpe bụ Amina Augie sị na ọ bụ n'ime abalị iri na anọ emechere ntuliaka ka mmadụ nwereike ịga ụlọikpe ma ọ bụrụ na ọ chọọ.

    Mbọ niile onye ọkaikpe, Dotun Babayemi, gbara bụ Adebayo Adelodun gbara ịhụ na e gere ha ntị n'okwu ndị ọzọ ha ji lara n'iyi.

    Ọ bụghị taa ka Adeleke na Babayemi malitere ịzọ ọkwa gọvanọ nke Osun Steeti mana ndị ọchịchị PDP na ndị Inec enyebeghị Babyemi ohere.

    Adeleke wụkwara Babyemi n'ala n'ụlọikpe nke nta, nke etiti na nke ukwu.

  15. Ihe mberede ọkụ 'tanker' egbuola ọtụtụ mmadụ na Kogi

    Kogi

    Ebe foto si, Other

    Ụgbọala 'tanker' bu mmanụ ụgbọala nwere ihe mberde okporo ụzọ ma gbuo ọtụtụ mmadụ na Kogi steeti n'ụbọchị Wenezde.

    Ọdachi a mere n'elu akwammiri osimiri Maboro dị n'okpuru ọchịchị Ankpa.

    Akụkọ kwuru na ndị mmadụ nọ n'ime osimiri ahụ na-arụ ọrụ ha dị icheiche oge ya bụ ihe mberede mere.

    Dịka ndị bi na mpaghara ahụ si kwuo, ụgbọala 'tanker' ahụ na ụgbọala ọzọ takọrọ isi o wee daa ma nwuru ọkụ.

    "Ihe ruru mmadụ 20 gbapịara n'ọkụ ahụ, ụfọdụ n'ime ha ka ọkụ gbara nnukwu nke bụ na agaghị amatanwu ndị ha bụ," otu onye achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru.

    Ndị ọrụ nchekwa okporoụzọ na Kogi steeti kwuru na ọdachi a mere eme n'eziokwu, "mana anyị amatabeghị kpọmkwem mmadụ ole nwụrụnụ," Stephen Dawulung, bụ ọnụ na-ekwuru ndị 'Federal Road Safety Corps' nke Kogi Steeti kwuru.

    "Ihe mberede ahụ metụtara otu ụgbọala tanker, otu bus, ụgbọala obere atọ nakwa ọgbatumtum atọ."

  16. Ọdụm adọgbuola ọtụtụ ndị ọgụ nnupuisi na Mozambique

    Agu

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị agha mba Mozambique na-ekwu na ha anwụchiela ndị ọgụ 'jihad' anọ bụ ndị na-akpọbanye ndị ntorobịa n'otu ndị ọgụ nnupuisi ha.

    Bernardino Rafael bụ onyeisi ndị uweojii mba ahụ kwukwara na mmadụ iri na isii so n'otu ndị ọgụ 'jihad' ahụ alaala mmụọ.

    O kwuru nke a n'ọgbakọ ya na ndị obodo nwere n'obodo Quissanga nke dị na mpaghara Cabo Delgado.

    "Ndị ọgụ nnupuisi a nwụrụ site na mgbọ ndị agha, ebe ndị ọzọ nwụrụ n'aka ụmụ anụmanụ dịka Ọdụm na Agụiyi," Rafael kwuru.

    "Ụfọdụ n'ime ha bụ ndị nwụrụ oge anyị na ha kwakọrịtara mgbọ... mana ọ dịka ụmụ anụmanụ na-enyekwara anyị aka egbu ndị ọgụ nnupuisi alakụba ndị a."

    Agha ka na-aga n'ihu na mba Mozambique ugbua, ọ kachasị na mpaghara Cabo Delgado ebe e nwere ihe akụ ọnatarachi dị icheiche dịka ọlaedo, gas, rubies, na graphite.

    Ya bụ agha malitere n'afọ 2017 dika ndị ntorobịa na mpaghara a kpọrọ Mocimboa da Praia wakporo ụlọọrụ ndị agha na ndị uweojii ma bukọrọ ngwa ọgụ ha.

    Kamgbe ahụ, ihe karịrị mmadụ puku anọ anwụọla ebe mmadụ puku narị asatọ agbaala ọsọ ndụ pụọ n'ụlọ ha.

  17. Ụtụtụ ọma

    Igbo ndị ọma, daalụnụ maka isonyere anyị na mgbasaozi nke taa.

    Ka anyị gbapụ ya ọso.

  18. Ihe ụlọikpe kwuru maka 'Peter Obi' rally a chọrọ ime na Legọs

    Peter Obi

    Ebe foto si, Labour Party

    Nkọwa foto, Peter Obi, onye na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na Labour Pati malitere ịchụnta vootu ya taa na Jos, Plateau steeti

    Ụlọikpe ukwu dị na Legọs enyela iwu ka ndị 'Labour Party' na ndị nkwado ha gaa n'ihu na ngagharị nkwado nke ha kwuru na ha ga-enwe na Legọs n'ụbọchị Ọkụtoba 1.

    Mana ọkaikpe Daniel Osiagor kpebiri ikpe ahụ nyere iwu ka ha ghara ịkwụsị na Lekki Toll Gate dịka ha na-eme ngagharị ahụ, kama ha nwereike isi ebe ahụ gafee.

    Ọkaikpe ahụ nyekwara onyeisi ndị uweojii Legọs steeti bụ Abiodun Alabi iwu ka ọ hụ na ndị ahụ na-eme ngagharị nkwado rubere isi n'iwu ya.

    Mkpebi a na-abịa dịka ụfọdụ mmadụ tinyere akwụkwọ n'ụlọikpe na-arịọ ka e gbochie ndị Labour Party, na onye na-azọ ọkwa onyeisiala na pati ahụ bụ Peter Obi, na osote ya bụ Datti Baba-Ahmed, na otu nwoke ọzọ aha ya bụ Julius Abure, na ndị nkwado ha, ime ngagharị nkwado.

    Ndị gbara akwụkwọ a n'ụlọikpe na-ekwu na ngagharị a ga-adị ka ngagharịiwe 'EndSARS' nke e mere n'afọ 2020, bụ nke butere nnukwu ọgbaaghara nakwa nkwafu ọbara na steeti ahụ.

  19. Ụlọikpe ekwuola na Ahmed Lawan agaghị azọ ọkwa Sineti na 2023

    Ahmad Lawan

    Ebe foto si, Ahmad Lawan

    Nkọwa foto, Ahmad Lawan malitere ịbụ onye omeiwu kamgbe 1999

    Ụlọikpe ukwu dị na Yobe steeti ekpebiela na ọ bụ Bashir Machina ga-anọchite anya ndị ‘All Progressives Congress’ (APC) na ntuliaka sịnetọ Yobe North na 2023, ọ bụghị Ahmad Lawan bụ onyeisi ụlọ omeiwu Sineti ugbua.

    Ọkaikpe Fadimatu Murtala kpebiri ikpe a taa bụ Wenezde, iji weta ndọrọndọrọ a nọrọla ọtụtụ ọnwa n’isi njedebe.

    Cheta na Ahmad Lawan so zọọ ntuliaka imeụlọ APC maka ọkwa Onyeisiala Naịjirịa, mana o merighi.

    N’oge ahụ kwa, Bashir Machina zọrọ ntuliaka imeụlọ maka ọkwa sineti nke Yobe North ma merie, mana Ahmad chọrọ ka Machina rituoro ya, kama Machina ekweghi.

    Ndọrọndọrọ a mere na ngalaba na-ahazi ntuliaka bụ ‘Independent National Electoral Commission’ (Inec) etinyeghị aha Lawan maọbụ Machina n’akwụkwọ ndị ga-eso zọọ ọchịchị, mana dịka e kpebirila ikpe a taa, a na-atụ anya na Inec ga-etinyezi aha Machina

    Onwebeghị onye ma ma Ahmad Lawan ọ ga-agbagha ikpe a n'ụlọikpe mkpesa.

    Ọ bụrụ na Lawan esoghị zọọ ntuliaka na 2023, ọ ga-eweta n’isi njedebe afọ 23 ọ nọrọla n’ụlọ omeiwu Naịjirịa, dịka ọ malitere ịbụ onye omeiwu kamgbe 1999.

  20. Ejichiela aka chịbụrụ mba Guinea dịka a na-akwado ikpe ya ikpe

    onye bụbu Onyeisiala mba Gini bụ Moussa Dadis Camara a na-ebo ebubo maka ogbugbu ọrụrụ mmadụ na ọdọ egwuregwu dị na Konakri, Gini

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, onye bụbu Onyeisiala mba Gini bụ Moussa Dadis Camara a na-ebo ebubo maka ogbugbu ọrụrụ mmadụ na ọdọ egwuregwu dị na Konakri, Gini

    Ndị ọkaiwu onye bụbu Onyeisiala mba Gini bụ Moussa Dadis Camara, si na e zigarala ya gaa ụlọ mkpọrọ tupu ikpe ya amalite. Cheta na a na-ekpe Camara ikpe maka ogbugbu ndị mmadụ na ọdọegwuregwu afọ 13 gara aga.

    Ihe a bụ foto e sere mgbe igwe mmadụ na-abazi ọdọ egwurewgu tupu ndị ọrụ agha agbawa egbe gburu igwe mmadụ na September 28, 2009

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Ihe a bụ foto e sere mgbe igwe mmadụ na-abazi ọdọ egwurewgu tupu ndị ọrụ agha agbawa egbe gburu igwe mmadụ na September 28, 2009

    A ga-amachị ndị ọzọ e bokwara ebubo ya a ruo mgbe a ga-ekpebi ikpe ha ga-ebido na Wenezde 28 September 2009.

    Ndị nnyocha si mba ụwa ndị ọzọ chọpụtara na dị e gburu n'ụbọchị ahụ ruru mmadụ 156 ma merụọkwa puku koworo puku mmadụ na ngagharị iwe n'ụbọchị ahụ. Ha sịkwa na a wakporo ihe kariri ụmụnwaanyị narị n'ike.

    Ihe karịrị mmadụ 150 ka e gburu na ngaghari iwe maka ọchịchị ndị agha e mere na Septemba 2009

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Ihe karịrị mmadụ 150 ka e gburu na ngaghari iwe maka ọchịchị ndị agha e mere na Septemba 2009

    Ndị hụrụ ihe mere n'ụbọchị ahụ sị na ndị ọrụ nchekwa mechiri ụzọ ee si aga ọdọ egwuregwu ma gbaakwa puku kworo puku mmadụ ma jikwa mma gbuokwa ọtụtụ.

    Maazị Camara gọnariri ebubo ndị a.