Ndị omeiwu ukwu na-anọchite anya steeti dị icheiche na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ etiela mkpu maka oke ogbugbu mmadụ na-aga n'ihu na mpaghara ahụ ugbua.
Ndị otu a ruru mmadụ iri na ise tinyere aka n'akwụkwọ ozi ha biputara ụbọchị ụka bụ nke na-ekwu ka ogbugbu mmadụ si arị ibe ya elu n'ala Igbo amabu dịka ebe udo.
Ha kwuru na ha ji ike na ohere ha nwere dịka ndị omeiwu ịme ka gọomenti etiti mata mmegbu na mkpagbu dị n'ala Igbo.
"Anyị nwere olileanya na ha ga anụ maka ọdịmma na ịdị n'otu Naịjirịa", dịka ha dere.
Ha sị na obi adịghị ha mma maka oke nsogbu na mkpa mkpa dị n'ala Igbo ugbua bụ nke butere ọgbaaghara n'ebe ahụ.
Ha sị na Ihe e ji mara ndị Igbo abụghị Igbu mmadụ maọbụ ịkwafụ ọbara.
Ha kwukwere na uche ha dị na mkpu ndị mmadụ na-eti gbasara ịhazigharị mba Naịjirịa nakwa nke ndị mnwereonwe na-eti bụ nke oke mmegbu na mkpagbu butere.
"Anyi na-ekwu na usoro niile ndị mmadụ ga-eso n'ịnwete ihe ndị a ga-abụ ụzọ nke udo nke iwu kwadoro nke agaghị ebute ọgbaghara n'obodo.
Ha jikwa otu aka ahụ eti ndị ya bụ ọgbaghara metutere n'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ ka ha kara obi maka ọnwụ ndị nke ha ma na-ekpe ekpere na Naịjria na-agabiga ọnwụnwa a.
Ha na-akatọkwa ajọ agwa niile nakwa ogbugbu mmadụ n'ụzọ ọbụla ma na-ekwusi ike na ha agaghị anabata ụdị agwa a, ụzọ ọbụla.
Ha na-arịọ onyeisi ndị uweojii ka ọ gbaa mbọ chọpụta ndị bụ ndị "unknown Gummen" a na-akpa ike n'ala Igbo.
Ha na-ekwu na ọ dị mkpa ịme ya bụ nchọpụta maka ọtụtụ mwakpo awakporola n'ala Igbo nso nso a.
Ha na-arịọkwa ndị ọrụ nchekwa ka ha welata aka ka ha sị awakpo ndị mmadụ n'ọnọdụ ịweghachite udo n'ala Igbo.
Ha cheta na ndị Igbo achọghị ọgụ maọbụ mmekpe ahụ ọbụla n'ọnọdụ iweta udo n'ala a.
Ndị tinyere aka na ya bụ akwụkwọ bụ:
Sen. Ike Ekweremadu Enugu Steeti
Sen. Enyinnaya Abaribe Abia Steeti
Sen. Orji Uzor Kalu
Abia Steeti
Sen. Sam Egwu
Ebonyi Steeti
Sen. Theodore A. Orji
Abia Steeti
Sen. Onyewuchi Ezenwa
Imo Steeti
Sen. Rochas A. Okorocha
Imo Steeti
Sen. Frank Ibezim
Imo Steeti
Sen. Stella Odua
Anambra Steeti
Sen. Uche Ekwunife
Anambra Steeti
Sen. Ifeanyi Uba Anambra Steeti
Sen. Chimaroke Nnamani
Enugu Steeti
Sen. Chukwuka Utazi
Enugu Steeti
Sen. Obinna Ogba
Ebonyi Steeti
Sen Micheal Nnachi
Ebonyi Steeti