Biafra sitathome: Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka 'sit-at-home' mere na mpaghara ọwụwa anyanwu ụnyahụ
Gọvanọ Rivers steeti bụ Nyesom Wike ekwuola na otu Indigenous People of Biafra agaghị emeli iwu onye nọrọ n'ụlọ na Rivers steeti.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Ihe mere Ipob agaghị etinyeli iwu 'sit-at-home na Rivers steeti
Ebe foto si, Getty Images/Wike's social media platform
Gọvanọ Nyesom Wike nke Rivers steeti akọwaala ihe mere na atụmatụ oye apụla ezi nke ndị Ipob tinyere amịtaghị mkpụrụ na steeti ahụ.
N’okwu ọ gwara ndị channels n’abalị Mọnde, Wike kwuru na onweghi ihe jikọrọ River Steeti na Ipob maka na gọọmentị ya machiri ya bụ otu.
Cheta na otu Indigenous People of Biafra site ọnụ na-ekwuru ha bụ Emma Powerful nyere iwu ka ndị mmadụ maọbụ ụgbọala ghara ịpụta n'ụbọchị Monde(May 31st, 2021) maka ncheta afọ nke iri ise na anọ e ji kpọpụta Biafra.
Ndị mmadụ bi na mpaghara ọwụwa Naịjirịa apụtaghị chacha n'ụbọchị ahụ.
Wike kwuru na ọ naghị akatọ ihe otu Ipob na-eme mana ọ kwusi ike na otu ahụ enweghị ike iti iwu onye nọrọ n'ụlọ na steeti ya makana otu ahụ anọghị na steeti ya.
Igbo ndịọma ndewonu!
Nnọ dịka ị na-esonyere anyị njem iwetara ụnụ akụkọ kachasị mkpa n'ala Igbo nakwa mba ụwa.
A gbagbuola otu onye n'Ebonyi dịka a na-eme 'sit -at-home' n'ebe ahụ
Ndị uweojii nọ n'Ebonyi steeti agbagbuola otu onye n'Ebonyi steeti ma napụta ya ngwa agha ka udo wee chịa dịka a na-edowe iwu onye nọrọ n'ụlọ ndị otu Ipob dowere na mpaghara ọwụwa anyanwụ.
Kọmịshọna uweojii nọ n'Ebonyi steeti bụ CP Aliyu Garba kwuru na ihe a mere n'okporoụzọ Kpirikpiri/Ebebe Nnodo ebe ndị omekome chọrọ ibute ọgbaghara mana ndị uweojii enyeghị ya ohere.
Ndị uweojii nakwa ndị omekome bidoro kwatawa mgbọ nke tụtara ma gbuo otu n'ime ndị omekome ahụ.
CP Garba kwuru na ihe niile jụọla oyi ugbua n'Ebonyi steeti dịka ndị ọrụ nchekwa nọ n'ogbe ahụ eweta nchekwa.
Onye ntaakụkọ BBC kwuru na ụfọdụ ndị bi n'ogbe Ebebe/Nnodo na-achọghị ka a kpọpụta aha ha hụrụ ka e si gbaa ụfọdụ ụgbọala nakwa ọgbatumtum ọkụ makana ha edoweghị iwu onye nọrọ n'ụlọ onyeisi Indigenous People of Biafra (Ipob) hibere.
Ebe foto si, Getty Images
Mahadum Ebonyi steeti mechiri kpam kpam maka iwu onye nọrọ n'ụlọ Ipob
Foto ndị a si na mahadum Ebonyi steeti dị n'Abakiliki, ngalaba 'Faculty of Agricultural Sciences and Human Resources Management'.
Ebe niile na mahadum ahụ tọgbọrọ chakoo maka iwu onye nọrọ n'ụlọ Ipob tinyere taa dịka a hụrụ naanị ndị ọrụ nchekwa ka ha nọ n'eche gburugburu ahụ.
Ụjọ ji ndị mmadụ n'Enugu dịka o nweghị onye pụtara n'iro
O nweghị onye pụtara n'okporoụzọ Ogui Rd, Artisan, Njemanze nakwa Stadium dị n' Enugu taa maka iwu onye nọrọ n'ụlọ ndị Ipob tinyere.
Ụlọọrụ niile mechiri emechi nakwa ụlọ akwụkwọ niile dị n'Enugu.
Ụlọahịa niile dị n'Enugu dịka 'New Market/ Aria, Main Market, nakwa Artisan market
Naanị ndị uweoji na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ bụ ndị na-agagharị kwa mgbe kwa mgbe.
Onye
Nke a bụ mbụ a na-edobe iwu onye nọrọ n'ụlọ zuru oke kamgbe e bidoro
Ọtụtụ mmadụ apụtaghị n'Ebonyi steeti maka iwu 'sit-at-home'
Ọtụtụ mmadụ apụtaghị n'Ebonyi steeti maka iwu onye nọrọ n'ụlọ Ipob tinyere taa bụ May 31st, 2021.
Ụlọahịa nakwa ụlọ akwụkwọ emepeghị.
Lee etu okporoụzọ Azugwu/Waterworks dị ugbua.
Nkọwa foto, Okporoụzọ Azugwu/Waterworks
Nkọwa foto, Okporoụzọ Azugwu/Waterworks
Ebe niile kpọchiri akpọchị n'Imo steeti n'ihi 'sit-at-home'
Nkọwa foto, Ebe niile tọgbọrọ chakoo n'Imo steeti
Iwu nọrọ n'ụlọ nke ndị otu IPOB tinyere na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ mịtara mkpụrụ n'Owere, isi obodo Imo steeti.
Onye ntaakụkọ BBC kpagharịrị n'ọtụtụ ogbe n'Owere hụrụ na elu na ala tọgbọrọ chakoo.
Mpaghara Mbonu Ojike dị n'Ikenegbu gbara chakoo, otu a ka ọ dịkwa na Okwu Uratta, Tetlow, nakwa Onitsha Owerri road.
Ọ bụ eziokwu na nnukwu mmiri ozuzo na-ezo n'Owere n'ụtụtụ Mọnde a, mana o kwesịghị ime ka okporoụzọ tọgbọ chakoo otu a.
Ụfọdụ ndị chọrọ ịpụta zụrụ achịcha maọbụ ihe nri ndị ọzọ ahụghị ebe ha ga-azụta ihe n'ihi na ọtụtụ ụlọahịa kpọchiri akpọchi.
Ụbọchị 30 nke ọnwa May afọ ọbụla bụ ụbọchị ncheta Biafra; ọ bụ n'ụbọchị ahụ, n'afọ 1967 ka Odumegwu Ojukwu kwuru na Biafra esila n'ime Naịjirịa pụọ.
Ndị Ipob na-etinye mmachi mkpagharị n'ụbọchị May 30 ọbụla, mana n'ihi na May 30 nke afọ a bụ n'ụbọchị Sọnde, Nnamdi Kanu kwuru na ọ bụ n'ụbọchị taa bụ May 31, ka onye ọbụla ga-anọ n'ụlọ.
Ebe niile dere duu n'Awka Anambra steeti
Nkọwa foto, Ifite, Awka
Ndị Awka dị n'Anambra steeti apụtabeghị na bee ha ruo ugbua bụ May 31,2021 dịka Indigenous People of Biafra hibere iwu onye nọrọ n'ụlọ.
O nweghị ụlọakwụkwọ maọbụ ụlọ ahịa mepere emepe n'Awka.
Ndị mmadụ ekweghị apụta maka ụjọ ihe nwerike ime ha ma pụta na bee ha.
Cheta na Nnamdi Kanu bụ onyeisi Ipob kwuru ka ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ maka ncheta Biafra e mere ụnyahụ bụ
Lee ka ịhụ na anya dị ufọdụ akụkụ Umuahia na May 31st sit-at-home
Nkọwa foto, Health Centre Road, Umuahia
Iwu onye nọrọ n'ụlọ ndị otu Indigenous People of Biafra tinyere na maghara ọwụwaanyanwụ pụtara ihe n'Umuahia.
Onye natakụkọ BBC nọ ebe ahu kwuru na onweghị ụgbọala na-agbanụ n'ezi maọbụ ahịa na-azụ ugbua n'Umuahia.
Ụfọdụ mmadụ pụtara n'ezi na-ezi isi ha ka ha na-aga n'ụzọ.
Ndị agha Naịjirịa nakwa ndị uweojii nọcha n'ụfọdụ akụkụ ebe dịka Nigeria Correctional Centre dị n' 'Aba road', Federal Medical Centre nakwa okporoụzọ gawara obi gọọmenti Abia steeti.
E mechirichara ụlọ ọrụ gọọmenti dịka ebe niile dere duu.
Ụmụakwụkwọ agaghị ụlọakwụkwọ ha makana nne na nna ekweghị ka ha pụta ezi.
'Onweghị iwu sị na ndị mmadụ ga-agarịrị ahịa ma ha achọghị' - Ikpeazu
Ebe foto si, Okezie Ikeazu/Facebook
Gọvanọ Abia steeti bụ Okezie Ikpeazụ ekwuola na ya agaghaị amanye ndị mmadụ ịpụapụ maọbụ ịga ọrụ taa dịka ndị otu Ipob na-asị ndị Igbo, ọkachasị ndị otu ha apụlaapụ taa bụ Mọnde maka ncheta ndị nwụrụ n'agha Bịafra.
Na mkparịta ụka ya na ndị channels TV ụbọchị ụka, ikpeazụ sị na ọnweghị ebe akwụkwọ iwu kwadoro ịmanye mmadụ ka ọ pụọapụ maọbụ gaa ahịa maọbụ ọrụ.
Ọ sị na "ọbụrụ na ndị mmadụ achọghị ịga ọrụ ụbọchị ọrụ, nke ahụ gbasara ha. Ị gaghị amanye ha gawa ọrụ".
Ọ sị na nke ya ma bụ na ụlọọrụ gọọmentị ga-emepe.
Na ya nwere ndị ya kwesiri ihu taa.
"Ndị ọrụ m ga-abịakwa ọrụ, mana ọbụrụ na onyeghị onye ha hụrụ bịara ka arụọrọ ha ọrụ, iwu ejighị onye ọbụla."
Ọ sị na o doro ya anya na ọtụtụ mmadụ ga-aga mkpa ha taa mana ụfọdụ nwekwara ike ha agaghị apụta maka egwu imeru ahụ maọbụ na ha achọghị ịpụta.
Ndị omeiwu ala Igbo etiela mkpu maka oke ogbugbu mmadụ na-eme na Ọwụwa anyanwụ.
Ebe foto si, Getty Images
Ndị omeiwu ukwu na-anọchite anya steeti dị icheiche na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ etiela mkpu maka oke ogbugbu mmadụ na-aga n'ihu na mpaghara ahụ ugbua.
Ndị otu a ruru mmadụ iri na ise tinyere aka n'akwụkwọ ozi ha biputara ụbọchị ụka bụ nke na-ekwu ka ogbugbu mmadụ si arị ibe ya elu n'ala Igbo amabu dịka ebe udo.
Ha kwuru na ha ji ike na ohere ha nwere dịka ndị omeiwu ịme ka gọomenti etiti mata mmegbu na mkpagbu dị n'ala Igbo.
"Anyị nwere olileanya na ha ga anụ maka ọdịmma na ịdị n'otu Naịjirịa", dịka ha dere.
Ha sị na obi adịghị ha mma maka oke nsogbu na mkpa mkpa dị n'ala Igbo ugbua bụ nke butere ọgbaaghara n'ebe ahụ.
Ha sị na Ihe e ji mara ndị Igbo abụghị Igbu mmadụ maọbụ ịkwafụ ọbara.
Ha kwukwere na uche ha dị na mkpu ndị mmadụ na-eti gbasara ịhazigharị mba Naịjirịa nakwa nke ndị mnwereonwe na-eti bụ nke oke mmegbu na mkpagbu butere.
"Anyi na-ekwu na usoro niile ndị mmadụ ga-eso n'ịnwete ihe ndị a ga-abụ ụzọ nke udo nke iwu kwadoro nke agaghị ebute ọgbaghara n'obodo.
Ha jikwa otu aka ahụ eti ndị ya bụ ọgbaghara metutere n'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ ka ha kara obi maka ọnwụ ndị nke ha ma na-ekpe ekpere na Naịjria na-agabiga ọnwụnwa a.
Ha na-akatọkwa ajọ agwa niile nakwa ogbugbu mmadụ n'ụzọ ọbụla ma na-ekwusi ike na ha agaghị anabata ụdị agwa a, ụzọ ọbụla.
Ha na-arịọ onyeisi ndị uweojii ka ọ gbaa mbọ chọpụta ndị bụ ndị "unknown Gummen" a na-akpa ike n'ala Igbo.
Ha na-ekwu na ọ dị mkpa ịme ya bụ nchọpụta maka ọtụtụ mwakpo awakporola n'ala Igbo nso nso a.
Ha na-arịọkwa ndị ọrụ nchekwa ka ha welata aka ka ha sị awakpo ndị mmadụ n'ọnọdụ ịweghachite udo n'ala Igbo.
Ha cheta na ndị Igbo achọghị ọgụ maọbụ mmekpe ahụ ọbụla n'ọnọdụ iweta udo n'ala a.
Ndị uweojii Enugwu steeti amalitela nnyocha maka otu
nwoke ndị ekperima gbagburu n’Ebeano Tunnel na mgbede ụbọchị Sọnde.
Ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia nke gosiri ebe ndị ekperima jichiri otu nwoke bu ụgbọala Mercedes ma gbaa ya egbe.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Daniel Ndukwe kwuru na e buru nwoke ahụ gaa ụlọọgwụ ebe ndị dọkịta nọ kwuo na ọ nwụọla, tupu e buru ya tinye n'ụlọ ozu.
Ndukwe kwukwara na ndị uweojii
amalitela ịchọ ndị kpara arụ a, ma ṅụọ iyi na aka ga-akpara ha n’oge na-adịghị
anya.
Kọmishọna ndị uweojii n'Enugwu bụ Mohammed Ndatsu Aliyu gwara ndị mmadụ ka ha ghara ịtụ egwu ndụ, ma rịọkwa onye ọbụla ma etu ndị uweojii ga-esi jide ndị ekperima a ka ha biko wetara ha ozi.
'Geenụ ndị iwe dị n'obi n'ala Igbo ugbua nti, mara ihe ha na-achọ '- Okezie Ikpeazu
Ebe foto si, Ikpeazu's twitter page
Nkọwa foto, "i nwere ike imachị otu, mmadụ maọbụ ngalaba mana ọ hịaraahụ imachị nkwenye mmadụ"- Ikpeazu
Aka na-achị Abia steeti bụ gọvanọ Okezie Ikpeazu kwuru na
ihe butere mkpa mkpa na-akpa n’ala Igbo nwerike ịbụ maka ihe ụfọdụ ndị bi n’ala
Igbo na-ekwu maka ya kamgbe.
O kwuru na ihe ndị a gụnyere mmegbu site n’aka gọọmenti
etiti, enweghị nhataha, egeghị ha ntị nakwa enweghị ezi nchekwa.
Gọvanọ Ikpeazu kwuru na "onye ọbụla, ma gọọmenti etiti ma mụ
onwem kwesiri ị gee ndị otu Ipob ntị, mara ihe ha na-achọ".
O kwuru na ọ bụrụ na ndị otu Ipob nwere ihe na-amasịghị ha n’ọchịchị
ya, na ọ ga-ege ha ntị mara ihe ha chọrọ, ọ bụrụ na ọ bụ nke ọ ga-emeli, ọ mee
ya ma ọ gaghị emeli ya, ọ gwaa ha.
O kwuru na o na-ekwu uche ya mgbe ọ bụla gbasara etu ndị
Ipob si achọ Biafra, na ọ bụghị site n’igba egbe makana ọ hụrụ agha Biafra n’afọ
1967.
Ọ bụrụ na Biafra bụ maka nkwupute maka mkpagbu a na-akpabụ
ndị Igbo, mara na Biafra dị n’obi ọtụtụ ụmụ Naịjirịa.
Onye ga-akpọkọba ndị otu Ipob maka mkparịtaụka?
O kwuru na enweghị ihe dịka Ipob na Abia steeti mana e nwere
Eastern Security Network(ESN).
N'ọnụ ya, ọ bụ ọrụ goọmenti etiti ikpokoba ụmụ Naịjirịa ma gee nti
mara ihe na-akpa ndị agbụrụ ha.
N’okwu ya, "i nwere ike imachị otu, mmadụ maọbụ ngalaba mana ọ
hịaraahụ imachị nkwenye mmadụ".
O kwuru na oke mwakpo na-eme n’ala Igbo ugbua bụ itinye ụjọ
n’ahụ ndị mmadụ nakwa iweghara ngwa agha.
Igbo ndị ọma ụtụtụ ọma!
Anyị ji ọṅụ anabata ụnu taa dịka ị na-esonyere anyị ịmata akụkọ kachasị dị mkpa n'ala Igbo nakwa mba ụwa.