Emume akwamozu Oluwadamilare Adeboye bụ nwa ụkọchukwu Enoch Adeboye, onyeisi ụka 'Redeemed Christian Church of God' amalitela.
Dare Adeboye, onye bụkwa ụkọchukwu n'ụlọụka Redeem dị na Eket, Akwa Ibom Steeti, nwụrụ na mberede n'ụbọchị Wenezde, abalị ise nke ọnwa Mee afọ 2021.
Iji kwanyere ya ugwu ikpeazụ, ọtụtụ ndị ntorobịa ụka ahụ n'akụkụ ụwa niile kpụchapụrụ ntutu isi ha niile iji gosi na ha nọ n'iru uju.
Leke Adebayo, onye bụ nwanne Dare Adeboye lara mmụọ, bu ụzọ kpụchaa isi nke ya, nke mere ka ndị ọzọ soro ya mee etu ahụ.
Ọnwụ Dare Adeboye gbawara ọtụtụ mmadụ obi n'ihi na ndị mmadụ kọwara ya dịka ezigbo onye ndu.
Ọtụtụ kwuru na ọ bụ onye na-enye ndị ntorobịa ohere ka ha gosipụta ihe ha nwere ike imenwu.
N'afọ 2020, a kpọpụtara aha Dare Adeboye dịka ụkọchukwu ihe ya kacha amasị ndị ntorobịa n'ụlọụka Redeem niile.
Dare Adeboye bụ nwa nke anọ nke ụkọchukwu Enoch Adeboye na nwunye ya bụ Folu Adeboye mụtara.
A mụrụ na n'ụbọchị itoolu nke ọnwa June afọ 1978.
Nne na nna ya kwuru na ọmụmụ Dare bụ nnukwu ihe ọrụ ebube.
Dare bụ ụkọchukwu na-elekọta ngalaba ụlọụka Redeem nke dị na Eket.
Ọ bụkwa onye na-ekwu okwu njalite mmụọ nke pụtara 'motivational speaker' na bekee.
Sọnday Mee 9: Ọgbakọ ukwe na ekpere n'ụlọụka 'City of David Youth Church' dị na Eket, Akwa Ibom, ebe Dare Adeboye rụrụ ọrụ ruo oge ọnwụ ya.
Mọnde, Mee 10: Ekpere na abụ n'isi ụlọụka ndị Redeem a kpọrọ 'Redemption Camp', nke dị n'okporo ụzọ si Legọs gawa Ibadan.
Tuzde, Mee 11: Ụka akwamozu n'isi ụlọụka ndị Redeem a kpọrọ 'Redemption Camp'. Nke a gachaa, e lie ya