Etu ndị omekome si wakpoo ụlọ onye enyemaka Buhari
Ụlọọrụ onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola etu ndị omekome si wakpoo ụlọ onye enyemaka Buhari a na-akpọ ọkammụta Ibrahim Gambari.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Chioma Obianinwa and Chimamaka Ihenacho
Manchester United ji mmeri ha kụọrọ Manchester City ọru
Ebe foto si, Getty Images
N’egwuregwu, Manchester United ewerela ọkpụ goolu atọ charaacha
asatara otu nyụọ Aston Villa Ịkpakwụ n’asọmpi Premier League agbara ụbọchị
Sọnde.
Bruno Fernandez, Mason Greenwood na Edinson Cavani nyere goolu
ndị Man Utd ji nweta mmeri.
Mmeri a mere ka aghara ikpuwe Manchester City Okpu Premier League n'izu a.
N'otu aka ahụ West Bromwich Albion agbaala oke ọnyn̄ụpa maka ọkpụ atọ asatara otu Arsenal ji merie ha.
Ahụhụ ya na ya bụ mmeri so bụ na West Bromwich Albion agaghịzị anọ Premier League na sizin na-abịa.
Ndị agha mba Chad enwetala mmerị n'agha ha busoro ndị nnupuisi
Ebe foto si, AFP
N’Afrịka, ndị agha mba Chad enwetela mmeri n’ọgụ ha na ndị agha
nnupuisi sị mpaghara ugwu mba ahụ dịka ha lụsagoro ha ọgụ ọtụtụ izuụka.
Ya bụ agha malitere kemgbe onyeisiala mba ahụ bụ Idriss Deby
nwụchara n’ihuagha ebe ha na-ebuso ndị isiekweọnwụ ahụ ọgụ.
Onwu otu onye ọkada butere ọgbaagha na Karu dị n'Abuja
E nwere ọgbaghara na Karu dị n’Abuja n’ụtụtụ Sọnde a dịka e
gburu otu onye ọkada n’ebe ahụ.
Anyị nụrụ na ndị ọkada gbachiri ụzọ niile ebe ahụ na ebe ha na
ndị uweojii bịara ịchụsa ha na-arụkọrịta onwe ha aka n’ọnụ dịka udo họchitegoro
ebe ahụ ugbua.
Akụkọ anyị nụrụ na-ekwu na-onwu ma amabeghị ihe gburu ya bụ onye ọkada, kama na ọnwụ ya nwutere ha nke mere ha jiri buru iwe pụta ezi.
E kwukwara na ha tụwara ndị uweojii na ndị agha bịara ịgbasa ha iche.
Ọgbaaghara mere ụlọụka dị na mpaghara ahụ ka ha gasaa n'oge.
Emume akwamozu Oluwadamilare Adeboye bụ nwa ụkọchukwu Enoch Adeboye, onyeisi ụka 'Redeemed Christian Church of God' amalitela.
Dare Adeboye, onye bụkwa ụkọchukwu n'ụlọụka Redeem dị na Eket, Akwa Ibom Steeti, nwụrụ na mberede n'ụbọchị Wenezde, abalị ise nke ọnwa Mee afọ 2021.
Iji kwanyere ya ugwu ikpeazụ, ọtụtụ ndị ntorobịa ụka ahụ n'akụkụ ụwa niile kpụchapụrụ ntutu isi ha niile iji gosi na ha nọ n'iru uju.
Leke Adebayo, onye bụ nwanne Dare Adeboye lara mmụọ, bu ụzọ kpụchaa isi nke ya, nke mere ka ndị ọzọ soro ya mee etu ahụ.
Ndụ Dare Adeboye
Ebe foto si, Pastor Adeboye/Twitter
Nkọwa foto, Ụkọchukwu Enoch Adeboye, onyeisi ụlọụka Redeemed Christian Church of God
Ọnwụ Dare Adeboye gbawara ọtụtụ mmadụ obi n'ihi na ndị mmadụ kọwara ya dịka ezigbo onye ndu.
Ọtụtụ kwuru na ọ bụ onye na-enye ndị ntorobịa ohere ka ha gosipụta ihe ha nwere ike imenwu.
N'afọ 2020, a kpọpụtara aha Dare Adeboye dịka ụkọchukwu ihe ya kacha amasị ndị ntorobịa n'ụlọụka Redeem niile.
Onye bụ Dare Adeboye?
Ebe foto si, Leke Adeboye/Instagra
Nkọwa foto, Ndị ụka Redeem n'Akwa Ibom nwere ọgbakọ ekpere na ukwe n'ụbọchị Sọnde iji kwanyere Dare Adeboye ugwu.
Dare Adeboye bụ nwa nke anọ nke ụkọchukwu Enoch Adeboye na nwunye ya bụ Folu Adeboye mụtara.
A mụrụ na n'ụbọchị itoolu nke ọnwa June afọ 1978.
Nne na nna ya kwuru na ọmụmụ Dare bụ nnukwu ihe ọrụ ebube.
Dare bụ ụkọchukwu na-elekọta ngalaba ụlọụka Redeem nke dị na Eket.
Ọ bụkwa onye na-ekwu okwu njalite mmụọ nke pụtara 'motivational speaker' na bekee.
Emume akwamozu ya
Ebe foto si, TWITTER/ DARE ADEBOYE
Nkọwa foto, Dare Adeboye
Sọnday Mee 9: Ọgbakọ ukwe na ekpere n'ụlọụka 'City of David Youth Church' dị na Eket, Akwa Ibom, ebe Dare Adeboye rụrụ ọrụ ruo oge ọnwụ ya.
Mọnde, Mee 10: Ekpere na abụ n'isi ụlọụka ndị Redeem a kpọrọ 'Redemption Camp', nke dị n'okporo ụzọ si Legọs gawa Ibadan.
Tuzde, Mee 11: Ụka akwamozu n'isi ụlọụka ndị Redeem a kpọrọ 'Redemption Camp'. Nke a gachaa, e lie ya
Ndị oji egbe amaghị ndị ha bụ agbaala otu ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ n'Umuahia
Ụlọọrụ ndị uweojii dị na aghịa Ubani dị n'Okpuruọchịchị Umuahia, isiobodo Abia steeti abụrụla ebe gbara ọkụ ka ọ dị ugbua.
Ọ bụ n'isiụtụtụ Sọnde ka ndị oji egbe amaghị ndị ha bụ gbara ya bụ ụlọọrụ ọkụ.
Onweghị onye nwụrụ na ya bụ ọgbaaghara dịka ndị ọrụ nọbu ebe ahụ gaziri n'ụlọọrụ ndị uweojiiTradeMoore Housing Estate.
Ndị uweojii Abia steeti enwebeghị ike ịza ekwentị ha ikwu ka nke a si metuta ha mana onye ọrụọrụ anyị gara ebe ahụ sị na ebe niile juru oyi n'ogbe ahụ.
Ọ sịkwa na ndị bi ebe ahụ nso sị na ndị kpara ike ahụ dị iri na ise kwawara mgbo aghara agbara ebe ahụ, gbaa ụgbọala abụọ dị ebe ahụ ọkụ ma merukwa otu onye ụweojii ahụ.
Onye ahụ agbara ajụjụ ọnụ sị na ha amaghị ụlọọgwụ ebugere ya bụ onye uweojii emeruru ahụ.
Anyị ga-ewetere unu akụkọ dịka ọ na-apụta ihe.
Etu ọkụ 'candle' e ji eme ekpere si gbuo nwoke biara ịnara ekpere
Ebe foto si, Celestial Church of Christ Instagram/Getty Images
Otu nwoke na-eme
azụmahịa akpọrọ Kayode Badru anwụọla n’ụka Celestial Church of Christ dị na
Legọs.
Ọdachị a mere n’ụbọchị
Mee 3,2021 n’emume ekpere emere n’ụlọụka ahụ.
Otebeghị aka Badru
sicha Dubai bata NaỊjirịa maka emume ekpere ahụ.
Ojo Imolemitan bụ ọn
u na-ekwuru ụlọụka ahụ na Legọs kwuru na ọnwụ nwaamadi ahụ metụtara ha ma
kelekwa Badru nwụrụlanụ maka etu o si mụnye ọkụ asaa tupu ọ lawa mmụọ.
O kwukwara ụkọchukwu
ụlọụka ebe ihe a mere bụ Ebony Felix na Badru dị na-ezigbo mma dịka ọ na-ekpere
ya ekpere mgbe ọbụla.
O kwuru na mgbe ọkụ
gbachara Badru, e bugara ya n’ụlọọgwụ ebe ọ nọ na-anata ọgwụgwọ ma mechaa nwụọ.
Ka ọ dị ugbua,
ụkọchukwu ụlọụka ahụ nakwa ndị nọ mgbe ihe a mere nọ na ụlọọrụ ndị uweojii dị
na Panti, Lagos steeti.
Nke a mekwara ka ndị isi ụlọụka Celestial Church Of Christ kwuo ka ndị ụkọchụkwụ na-akụ parfum e ji eme ezigbo mmiri tupu e jiri ya mewe ekpere.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of Instagram post, 2
Nkeji BBC Igbo nke ehihie
Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji.
A gaghị m adara atụmaatụ ndị chọrọ nwereonwe
Ebe foto si, Wike Social Media
Ngalaba nchekwa nke Rivers
state akpọrọ “securiy council” agwaala ndị mmadụ ka obi ghara imapụ ha maka
mwakpo ndị uweojii mere na steeti ahụ ụnyahụ .
Governor Nyesom Wike bụ onye nọ n’isi ọgbakọ ahụ mere ụnyahụ bụ
Mee 8.2021 n’ọbi gọọmentị na Port
Harcourt katọrọ mwakpo ahụ ndị ji egbe mere n’ogbe ndị uweojii.
O kwuru na onweghị udiri iyi egwu ga-eme ka steeti ya dara ndị
na-achọ nwereonwe gbadosiri anya ihụ na ha tinyere Naịjirịa na nnukwu ọgbaghara
ọzọ.
Ọ rịọrọ ndị bi na Rivers steeti ka ha dere duu makana na ngalaba
nchekwa ateeti ahụ na-eme ihe niile ha kwesiri iji hụ na steeti ahụ nwere ezi
nchekwa.
Gọvanọ Wike gwara ndị bi na steeti ya ka ha mụrụ anya ka azụ ma
kpesara ndị ọrụ nchekwa ihe ọbụla na-edochaghị anya metụtara nchekwa n’akụkụ
ha.
A tọhapụla nwata akwụkwọ mahadum Abia State dị n’Uturu bụ nwata akwụkwọ
ka fọrọ n’aka ndị ntọrị tọọrọ ndị na-eme njem n’okporoụzọ si Okigwe gawa Uturu.
Gọvanọ Okezie Ikpeazu kwupụtara nke a n’akara twitter ya n’abalị Satọde
bụ ụbọchị asatọ nke ọnwa Mee.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post, 2
Rọketị ndị Chaịna e chere ga-ada n'ụwa mechara daa n'osimiri India
Ebe foto si, Getty Images
Mpekere ụgbọelu roketị ndị Chaịna a na-atụ ga-esi n’ohere eluigwe daa n’ụwa
mechara daa n’ime oke osimiri India dịka ndị Chaịna si kwuo.
Akụkụ ụgbọelu rọketị ahụ mebichara dịka ọ na-ada mana mpekere ya bụ ihe
dara n’ebe dị nso na mba Maldives.
Mba Amerịka na Yurope nọ kamgbe na-atụle rọketị a kpọrọ "long march-5b" iji maara ebe ọ ga-ada.
Ụlọọrụ mgbasaozi ndị Chaịna sị na a malịtere ịhụ ya anya n'ihu eluigwe dịka o ji nkeji iri abụọ na anọ gafee elekere iri n'oge ndị Beijing.
Mba Amerịka sị na rọketị a dara na mpaghara Arabia Peninsula, mana ọ maghị ma mpekere ya ọ dara n'elu ala ka ọ bụ n'ime mmiri.
Tupu rọketị a ada, ụjọ ji ndị mmadụ na mpekere ya nwereike ịda n'ebe ndị mmadụ bi.
Odeakwụkwọ ndịagha Amerịka sị na Chaịna kpara agwa ọjọọ site n'ileghara rọketị a anya ka o si n'okpokoro ya daa.
Mana ndị ọkachamara sị na ohere na o nwereike ịdakwasị ndị mmadụ dị obere maka na ihu ụwa jupụtara na mmiri karịa.
BBC Nkeji nke ụtụtụ
Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji.
Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla
A tọghapụla nwata akwụkwọ ABSU fọrọ n'aka ndị ntọ
Ebe foto si, Ikpeazu twitter
A tọghapụla nwata akwụkwọ Abia State University (ABSU),
Uturu, kafọrọ n’aka ndị ntọ tọrọ ụfọdụ
ndị na-eme njem n’okporoụzọ gawara Okigwe-Uturu.
Gọvanọ Okezie Ikpeazu kwuputere nke a n’akara twitter ya n’abalị
ụnyahụ bụ satọde Mee asatọ.
O kelere ndị ọrụ nchekwa nakwa ndị isioche mahadum ABSU ma
kwe nkwa na aka ga-akpara ndị niile aka ha dị na ntọ a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.
End of X post
Ụtụtụọma ụmụ Igbo
Anyị amalitela iwetere ụnụ akụkọ dị mkpa na-eme n'ala Igbo nakwa mba ụwa nile.
Ndị uweojii Anambra adọọla ndị nwere ụgbọala aka na ntị ọzọ
Ndị uweojii n’Anambara
steeti ekwuola na ụdị ụgbọala ndị anaghị ekwe ka ahụchaa onye nọ n’ime ya nke ọma, a
kpọrọ tinted vehicles na bekee, ka bụkwa ihe a machiri amachi na steeti ahụ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uwojii Anambra bụ Ikenga Tochukwu kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o zipuru na Satọde.
O kwuru na ndị uweojii machiburu ụdị ụgbọala a n'ọnwa Maachị, mana ha chọkwara ichetara ndị mmadụ na ya bụ mmachi ka dịkwa ire.
Ikenga kwuru na ha machikwara mmadụ ikpuchi
akara ụgbọala ya, bụ nke a na-akpọ 'plate number' na bekee.
"Onye ọbụla dara iwu a, ụgbọala ya alaala kanaị," nke a bụ ihe Ikenga kwuru.
Ndị Igbo ji aka anyị ebute agha n'ala Igbo - David Umahi
Ebe foto si, Facebook/David Nweze Umahi
Gọvanọ Ebonyi Steeti bụ David Umahi ekwuola na ọ bụ ndị Igbo ji aka ha ebute agha n'ala Igbo.
Umahi kwuru nke a n'ọgbakọ iji mechie ekpere abalị asaa bụ nke ndị otu 'Christian Association of Nigeria' kanyere n'Ebonyi steeti iji rịọ Chukwu maka ezi nchekwa na steeti ahụ.
N'okwu ya, Umahi kwara arịrị etu izu ohi, iwakpo ndị uweojii, ịtọrọ mmadụ otu nzuzo si arị ibe ya elu na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.
Ebe foto si, Facebook/David Nweze Umahi
O kwuru sị: "Gịnị kpatara anyị ji egbusi ndị uweojii? Gịnị kpatara anyị ji amụnye ogige ndị uweojii ọkụ?"
"Gịnị mere anyị ji ebo ebubo na ọ bụ ndị si n'iro na-eme ihe niile ndị a?"
"Ọ bụghị ndị iro, ọ bụ ndị be anyị na-awakpo ndị ọrụ nchekwa na-egbusịsị ha, na-anara ha egbe ha, na-ezu ohi."
"Enweghị ndị ọbụla nwere uche ga-agbachị nkịtị ka ihe na-eme n'ala Igbo ugbua na-aga n'ihu."
"Anyị ejirila aka anyị butere onwe anyị agha."
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, David Umahi kwuru na onweghị onye ọchịehi ga-egbukwa mmadụ ọzọ n'ala Igbo
Mana Umahi gakwara n'ihu kwuo na oge agaala mgbe ndị ọchịehi ga-awakpo ala Igbo ma laa na nkịtị.
O kwuru na onye ọchịehi ọbụla wakporo ala Igbo ọzọ ga-eji anya ya hụ ntị ya.
"O nweghị onye ọchịehi ọbụla n'Ọwụwa Anyanwụ ga-anwa anwa gbuo mmadụ ọzọ," Umahi kwuru.
"Ụfọdụ ndị ọchịehi na-amaja na ha ga-abịa mee nke a mee nke ọzọ, ya bụ ihe abịala n'isi njedebe. Mmegheri ahụ ebeela."
Chelsea egosila Man City ihe nwere ike ime na Champions League
Ebe foto si, Getty Images
Chelsea egosila ụwa ihe nwere ike ime oge ha na Manchester City ga-ezute onwe ha n'asọmpi ikpeazụ nke iko Champions League na May 29.
Cheta na Chelsea emeribuola Man City n'iko FA ọnwa olemole gara aga.
Mana oge oge ha na Manchester City zutere n'asọmpi EPL na mgbede Satọde a, ọkpụ goolu abụọ asatara otu ka Chelsea ji nweta mmeri.
Manchester City gaara ibuli iko EPL ma ọ bụrụ na ha meriri Chelsea taa, mana Chelsea gosiri ihe ha ji bụrụ anụ ngangampi.
Raheem Sterling bu ụzọ nyetere Man City goolu n'agba nke mbụ, mana Sergio Aguero tara penariti nke gaara ime ya goolu abụọ.
N'agba nke abụọ, Hakeem Ziyech nyeteere Chelsea goolu, ebe Marcus Alonso nyere goolu na ngwụcha asọmpi ahụ iji nye Chelsea mmeri.
Mpụtara asọmpi a mere na Man City agaghị ebuli iko EPL taa, ha ga-eche ruo ụbọchị Sọnde iji mata ihe ga-eme n'asọmpi ga-adị n'etiti Manchester United na Aston Villa.
Ọ bụrụ na Villa merie Man Utd, Manchester United ga-ebuli iko EPL.
Mana ọ bụrụ na Man Utd merie, maọbụ ha abụọ gbaa nhatanha, Man City ga-eche ruo izuụka ọzọ iji mara ma ha a ga-ebu ya bụ iko.
Etu mgbọ egbe a gbara n'Orlu si gbuo otu nwaanyị 'civil defence'
Ebe foto si, @officialNSCDC
Otu nwaanyị a kpọrọ Glory Nkwocha ezutele ọnwụ ya n'ike dịka mgbọ egbe tụrụ ya n'oge ndị ọrụ nchekwa na ndị o ji egbe na-alụ ọgụ n'Orlu nke Imo Steetị.
Nwaanyị a bụ onye ọrụ ndị 'civil defence' ma bụrụkwa otu n'ime ndị na-ekwe ukwe n'ụlọụka Winners Chapel dị n'Owerre Ebeiri dị n'Orlu.
Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ 'civil defence' bụ Lowell Chimeziri sị na nke a bụ eziokwu.
Ọ sị na ụlọọrụ ha amalitela ime nyocha ịchọpụta ebe mgbọ egbe gburu nwaanyị si pụta.
Chimeziri sị na a ga-eme ka ọha mata mpụtara nyocha ahụ n'ụbọchị ole na ole na-abịa abịa.
Cheta na ndị ọrụ nchekwa gụnyere ndị uweojii, ndịagha na DSS gbakọtara aka ọnụ kwasuo ndị o ji egbe bịara ịwakpo ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Orlu, Imo Steetị.
Nke a mere n'ụbọchị 6 nke ọnwa Mee a, dịka ndị uweojii kwuru na ha gburu ọtụtụ ndị o ji egbe a wa bukọrọ ụgbọala ha ji bịa njem ahụ.
BBC Nkeji nke ehihie
Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji.
Gọvanọ Umahi akpọhachịla ndị ji ọkwa gọọmentị n'obodo Effium/Ezza n'ọrụ
Ebe foto si, Ebonyi State Government
Gọvanọ David Umahi nke Ebonyi Steetị ebuliela mmachi ọrụ ọ machiri mmadụ iri anọ ji ọkwa gọọmentị n'obodo Effium na Ezza bụ obodo abụọ nọ n’ọgụ.
Nke a dị n'akwụkwọ ozi kọmishọna mgbasaozi na Steetị ahụ bụ Uchenna Orji wepụtaara ndị ntaakụkọ n'Abakiliki n'ụbọchị Fraịde.
Orji sị na Gọvanọ Umahi mere nke a maka na udo na-alọghachite n’obodo ndị a ugbua.
Cheta na Umahi kwụsịrị mmadụ iri anọ a ọrụ maka ọgbaghara, tigbuo na zọgbuo nọ na-arị elu n'okpuruọchịchị ha.
E nyere ndị iwu ka ha malitekwa ngwa ngwa n'ụbọchị nke ọnwa Mee, afọ 2021.
Ụfọdụ n'ime ndị a gụnyere;
Frank Onwe, Emmanuel Uzor, Nichodemus Omenka, Uzim Bernard, Ogwale Eucharia, Agbo Sunday, Ignatius Una Nwokporo, Obeh Chukwuemeka, Akpu Collins, Orogwu Sunday, Ogbuefi Peter N, Aleke Matthew, Ekpe Christiana Ada, Ugo Igolo, Nwali Eucharia na ndị ọzọ.
Gọọmentị Naịjirịa amalitela idekọ aha ndị na-akwa iyi ndụ egwu maka ikpe ha ikpe
Ebe foto si, Abubakar Malami/Facebook
Gọọmentị
etiti ekwuola na ha amalitela idekọ aha ndị Naịjirịa a na-enyo enyo na aka dị
n’ịkwado iyi ndụ egwu ka e nwee ike kpee ha ikpe.
Mgbe ọ na-agwa ndị ntaakụkọ n'Abujia n'ụbọchị Fraịde, ọkaịwu ukwu gọọmentị etiti bụ Abubakar Malami sị na anwuchiri ndị a site na nyocha na anwuchị ụmụafọ Naịjirịa na mba UAE n'ogere gara aga n'ihi iyi ndụ egwu.
Malami kwuru na nyocha gosiri ihe akaebe na ọtụtụ ndị nwere
agba na Naịjirịa na-akwado Boko Haram.
Na-agbanyeghi na Malami akpọghị aha ndị a ọ sị na aka ha dị n'ịkwado Boko Haram, ọ sị na ọtụtụ mmadụ so na ya kama na o nweghi ikike ịkpọpụta aha ha ndị a dịka a ka na-eme nyocha.