Ọnụ na-ekwuchitere ụlọọrụ Nigeria Airforce bụ Ibikunle Daramola ekwuputela na mmadụ asaa nọ n'ime ụgbọelu ndị agha kpọkasiri taa bụ ụbọchị Februwarị 21 n'Abuja enweghị onye pụtara na ndụ.
O kwukwara na ndị ọrụ gbata gbata eruola ebe ahụ.
Daramola depụtara nke a na twitter ya ma na-ekwukwa na onyeisi ndị agha ụgbọelu enyela iwu ka e nyocha ihe kpatara ya bụ ọdachị.
Etu ụgbọelu ndị agha si kpọkasịa n'Abuja
Minista na-ahụ maka njem ụgbọelu na Naịjirịa bụ Hadi Sirika edepụtala na ụgbọelu ndị agha Naịjiria akpọrọ aircraft King Air 350 akpọkasiala dịka o kwuputechara na ingin ya kụrụ ka ọ si Minna abata ọdọụgbọelu dị n'Abuja.
O kwuru na ọ kpọkasiri nke ọjọ ya.
Sirika depụtara n'akara twitter ya ka onye ọbụla ka nọrọ jụụ dịka a na-eche mpụtara nyocha ndị agha na-eme.
O kwuru na etu ọ dị ugbua amabeghị ma mmadụ a ka dị ndụ maọbụ nwụrụ anwụ na ya bụ ọdachị.
Nkechi Ugochukwu hụrụ mgbe ihe mberede a mere
Otu nwaagbọghọ aha ya bụ Nkechi Ugochukwu gwara BBC Igbo na ụlọ ya dị na mpaghara Bassa, nke dị nso n'ọdọụgbọelu Abuja.
O kwuru sị: "Ana m anọ n'ime ụlọ m anụ oge ọbụla ụgbọelu na-efeli maọbụ efetu."
"Mana mkpọtụ nke a m bụrụ taa abụghị ụdị mkpọtụ m na-anụbu."
"Oge m pụtara, ahụrụ m na ụgbọelu ahụ amalitela ịgba ọkụ, mana ụgbọala abụọ na-agbanyụ ọkụ bịara malite ịgbanyụ ọkụ ahụ."
"Onweghị onye m hụrụ si n'ime ya pụta."