Anya mmiri na iru uju juputara na Nkpor dị n'Anambra steeti ugbua dịka ndị amaghị ndị ha bụ gburu ụmụ okorobia atọ ebe ha na-eme nzụkọ obodo.
'President General' Obodo Nkpor bụ ichie Emeka Mbagha ji obi nwute kọọrọ BBC Igbo etu ya bụ ọdachi siri mee n'ụbọchị Wenezde, abalị iri nke ọnwa February 2021.
Mbagha kwuru na ọ bụ nzukọ ha jiri họpụta ndị ohụrụ ga na-anakọta ụtụ n'obodo Nkpor ka ha mechara, were duo ndị ọhụrụ ha họpụtara n'iyi ọrụ.
Oge e mechara ọgbakọ a, ụmụ okorobịa nọdụzịrị na-aṅụ mmanya oge otu ụgbọala gbapụtara ebe ahụ, ụmụ nwoke abụọ mapụtara n'ime ya malite ịgba egbe, nke gburu mmadụ atọ.
Mbagha kwuru na ya bụ ihe gbagwojuru ya anya n'ihi na onweghị onye ya na ibe ya na-ese okwu ma ya fọdụzịa ịzọ ọchịchị.
Ka ọ dị ugbua, ndị uwe ojii Anambra Steeti akpọpụtala aha mmadụ atọ ahụ lara mmụọ.
Ha bụ Izuchukwu Idemmili - 32 years; Chidi Oforma - 31 years; na Bobgo Muoghalu 45 years.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra bụ Haruna Mohammed kwere nkwa na aka ga-akpara ndị ọṅụ ọbara ahụ n'oge adịghị anya.
Mazi Mbagha kwuru na Nkopr amalitegokwa zụwa ahịa, mewe njem ma kwukwaa na egwu ka ji ndị mmadụ.
Mbagha kọwakwara na ọbụ iji kwanyere ndị nwụrụ anwụ ugwu mere ya na ndị obodo jiri were igodo kpochie ya bụ ụlọ Nkpor Civic center.