Ngalaba National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) e jichiela ọgwụ ike Cocaine ọnụego ya ruru uIjeri naira iri atọ(₦30 billion) n'ọdọụgbọelu Murtala Muhammed International Airport, Ikeja, Lagos.
E jichiri ọgwụ ike ruru etu ahụ n'otu izu ụka díka Gen.Mohammed Buba Marwa bụ onyeisi ọhụrụ ngalaba ahụ batachara oche ahụ ọhụrụ a.
Etu e si jichie ndị bu ọgwụ ike ndị a ruru 30 billion naira
Onye ụlọ ọrụ ngalaba ahụ kwuru na n'ụbọchị iri abụọ na asaa nke ọnwa January,2021 ka anwụchiri nwaanyị na-eme njem aha ya bụ Onyejegbu Ifesinachi Jennifer dị afọ iri atọ na atọ si mba Sao Paulo, Brazil 'via' Addis Ababa bata Naịjirịa.
Mgbe ndị ọrụ Ndlea degidere nwaanyị ahụ, dete ya, ha kpọrọ ya gaa ebe ha mere ezigbo nyocha wee chọpụta ihe na-acha ọcha ezomiri n'akwa ruru isii n'ime akpa ya abụọ.
Ha gara n'ihu nwalee ma chọpụta na ihe ahụ bụ ọgwụ ike ndị bekee kpọrọ 'Cocaine' na-anyị arụ ruru 26.850kg bụ nke o kwuru kachasị kamgbe afọ iri na ise ha jichiwere ndị na-ebu ọgwụ.
O kwuru na ọnụego 26.850kg ruru 21 billion naira ebe nwaanyị ahụ bụ onye na-eme isi gwara ha na ọ bụ 2 million naira ka a ga-enye ya maka wefete ya bụ ọgwụ ike na Naịjirịa. Nwaanyị ahụ ekweghị akpọpụta ndị ya na ya so arụkọ ọrụ ibufete ọgwụ ike dịka ụlọ ọrụ Channels si depụta.