You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

Nigeria Independence Day: 'O nweghi ihe ọṅụ dị na ncheta nnwereonwe Naịjịrịa'- Ipob

Ndị be anyị ndewonu o! Anyị ga-ewetere ụnụ emume niile na-kpọtụ taa maka ịcheta ụbọchị nwereonwe nke Naịjirịa.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Chioma Obianinwa, Jessica Nwankwo, Chris Sanctus Okereke and Ikechukwu Kalu

  1. Onyeisiala Buhari na ndị otu ya na-awa achịcha Bekee nke emume nnwereonwe Naịjirịa

    Ka emume nchteta nnweronwe Naịjirịa bịara na mmechi taa, onyeisiala Muhammadu Buharị sị na ya ga-agba mbọ rụcha akwa mmiri ọsimiri Naịjia n'afọ 2022.

    N'otu aka ahụ Chukwuma Soludo sị na ịhazigharị obodo Naịjirịa bụ ihe ga-eme ka obodo a dị mma.

    N.okwu ya, Willy Obiano nke Anambra steeti na-arịọ ndị steet ahụ ka ha nwee ndidi ka mmiri zobie nke ga-enyere ya ohere imezi ụzọ niile mebiri emebi.

  2. Ndị awụsa amụrụ n'Alaigbo na-ekwu uche ha.

  3. Gee akụkọ ndị a n'otu nkeji

  4. Ebonyi steeti

  5. Ebonyi steeti

  6. Ebonyi steeti

  7. 'O nweghị ihe na-enye obi ụtọ na Naịjirịa' - Paul Achara, Ipob ekwuola nke ha maka emume mnwereonwe Naịjịrịa

    Ọkaiwu ndị Ipob na London bụ Paul Achala etinyela onụ n'okwu gbasara emume mnwereonwe Naịjirịa nke afọ a.

    Achala sị na ọ nweghị ihe na-enye obi ụtọ na Naịjirịa nke ga-eme ka e me emume ncheta mnwereonwe. Ọ sị na ọ nweghị ihe a ga-eme Naịjirịa mete ya maka "ya bụ isi akwụ dara n'ala emetula aja".

    Achala sị na tupu a malite itu aro ihe a ga-eme ka Naịjirịa dị mma, na e kwesiri ị dị mbụ kweta na ndị Naịjirịa agaghịela ụzọ.

    N'onu ya, " ọ bụrụ na ha ekweteghị, aghụghọ dị na ya".

  8. Gee nkeji BBC nke ụtụtụ

    Nkeji mgbede ga-abịa mgbe adịghị anya.

  9. Leekwa ndị ha na Naịjirịa bụ ọgbọ 😀😀

  10. Ka ụmụakwụkwọ sị mee ya n'Anambra

  11. Ngozi Okonjo-Iweala sị na Naịjirịa ka dị ụtọ, agbanyeghị

  12. Lee ihe Atiku Abubakar kwuru

  13. "Gịnịdị ka a na-aṅụrị taa?"

    Ọ dị ka ọṅụ ụbọchị ncheta mwereonwe ezuteghị ebe niile na Naịjirịa.

    Ụfọdụ mmadụ na Kano kwuru na o nweghi ihe dị mma ịṅụrị taa.

    Mana ndị obodo Pọtakọt nakwa Ibadan jisike eme mmemme ebe ha nọ.

  14. Sanwo-Olu ga-eji teknụzụ chọọ Legọs mma

    Gọvanọ na-achị Legọs steeti bụ Babajide Sanwo-Olu ekwuola ihe o bu n'uche gbasara ya.

    Na mmemme "The Platform" nke ụlọụka Covenant Place hibere ka o kwuru nke a.

    N'ihe gbasara oke ịkwụ n'ahịrị nke na-achụ ndị Legọs ụra, Sanwo- Olu kọwara na ọ ga-ahazi njem ọgbatumtum nakwa njem ụgbọala site na teknụzụ.

    N'agụmakwụkwọ, o kwuru na ya na ụlọọrụ bụ BridgeHouse ga-etikọta aka ọnụ wụlite nkuzi ndị nkuzi, nkuzi ndị ụmụakwụkwọ nakwa agụmakwụkwọ ụmụaka kwa ụbọchị.

    Ndị ọzọ pụtara ịkwu okwu na ya bụ Peter Obi nakwa Charles Soludo.

  15. Obodo Ethiopia gbakara 'neti' nwereonwe

  16. Peter Obi ewepụtala 'busu' n'akpa

    N'emume Platform Peter Obi bụ otu onye na-ekwu okwu na ya, lee ihe ise anyị ji aka n'ihe ndị ọ gbọpụtara.

    1.Anyị bụ otu obodo na-ebite ego mana anaghị afụ ihe eji ya eme.

    2. Obodo Naịjirịa bụ nke na-enyekarị ndị mmadụ ọbara mgbali elu.

    3.Otu nkeji ọbụla, otu, ndị Naịjrịa ruru isi na-abanye ubiam

    4. Naịjịrịa bụ obodo kachasị na-abịa na-enweghị nhataha

    5.Ihe atọ Naịjiịa kwesiri iji gbata gbata lebaa anya bụ nchekwa, agụmaakwụkwọ na nwulite akụ na ụba obodo site n'ime ka ọrụ bawanye n'obodo.

    Ihe ndị Naịjịrịa na-agwa ya na Twitter:

  17. Charly Boy emela ihe e ji mara ya, Lee ụzọ pụrụiche nke ya o ji kelee Naịjirịa

  18. Ndị Anambra agbaghị 'last'

    Ndị Anambra pụtara n'uju icheta ụbọchị a.

    Obiano sị na Anambra anaghị agba ọnyụpaa na ihe gbasara mmepe obodo Naịjrịa.

    O ji mbọ Innoson, Allen Onyema na Cosmos Maduka bụ onye ọ ga-agbape ugbo osikapa ya echi bụ Tọzde.

    Obiano chetakwara mbọ Nnamdi Azikiwe gbara na ị napụta ndị ọcha ikike maka nnwere onwe Naịjirịa n’afọ 1960. Ọ kpọkuru gọọmenti Muhammadu Buhari ka ọ nye ụbọchị ncheta ọmụmụ Zik bụ 16 Nọvemba dịka ụbọchị ezumike na Naịjirịa dịka ọ dị na nke Nkuruma, Nyerere nakwa Agustino Neto.

    Obiano kwere nkwa na gọomentị ya ga-ewepụta amụma pụrụiche maka ọrụ nchekwa na ụbọchị iri na otu nke ọnwa Ọktoba bụ nke ga-eme ka nchekwa bụrụ ịgba na steeti ahụ.

    Ọ kwekwara nkwa na gọọmentị ya ga-emezi ụzọ niile mebiri emebi ma mmiri ozuzo kwụsị bụ nke ga-eme ga okporoụzọ Anambra niile bụru sịrịrị werere.

  19. Soludo nwere ozi dimkpa ga-eme ka Naịjịrịa ga n'ihu

    Aka chiburu ụlọakụ etiti Naịjịrịa bụ Charles Soludo ekwuola na ọ bụrụ na Naịjịrịa ga-ekesa ikike ka ọ ghara ịbụ sọsọ n'ogo etiti ka o si abịa, obodo a ga-achake ọzọ.

    Ọ rụtụrụ aka na nhazịgarị iwu ala, ngalaba ikpe zuruoke nakwa ime ka ụmụ Naịjịrịa na-aghọta etu ọchịchị si aga

    Nke a so n'okwu o nyere n'emume akpọrọ "The Platform" si n'aka ụlọ mgbasaozi Channels.

  20. Ndị Igbo na-ekwu ka ọ dị ha taa n'elu soshal midia