Onye bụ onyeịsị otu alaka nke otu ndọrọndọrọ ọchịchị Labour patị bụ Lamido Apapa ekwụola na ebubo ndị mmadụ na-ebo na ya na-arụrụ onyeisiala Bola Tinubu ọrụ abụghị eziokwu ma ncha.
Apapa kwuru nke a na mkparịtauka ya na BBC Yoruba nwere n'ọdị nso a, ebe ọ nọkwara kọwaa ịhe ọ sị bụ ịwe ya n’ebe Peter Obi nọ, bụ onye zọrọ ọkwa onyeisiala na Labour pati.
Cheta na e boro Lamido ebubo na ọ na-akwado onyeisiala Bola Tinubu iji buso Peter Obi agha.
"Ụlọ ntaakụkọ dị ịcheịche jụrụ m ajuju gbasara ịrụrụ Tinubu ọrụ, mana ekwuola m na ihe ndị ahụ bụ okwu ugha, onye nwere akaebe wepụta ya, kamgbe ọnwa ịse o nwebeghị onye pụtara kwụọ na ọ nwere akaebe," Apapa kwuru.
"Ana m ekwusi ike na enweghị m aka ọbụla na mmerị Tinubu meriri n’ụlọịkpe 'tribunal'. Ụfọdu ndị ntaakụkọ jụru m na ọ buru na onyeisiala Tinubu kpọọ mụ oku, ma m ga-aza ya? Asara m ha na Tinubu bụ Onyeisiala obodo anyi, ọ bụrụ na pati m zịga m ka m ga hụ ya, aga m aga hụ ya. Anaghị m aga ịhu Tinubu maka na ọ bụ Tinubu kama aga m aga za ya maka na ọ bụ onyeịsịala Niajịrịa."
Gbasara esemokwu ya na Peter Obi, Lamido Apapa kwuru na ya na-ekpere Peter Obi ka ọ dịrị ya mma, mana iwe ya n'ebe ọ nọ bụ etu o si akwanyere Julius Abure aja n'ukwu.
Cheta na Julius Abure bụkwa onyeisi otu alaka nke Labour Pati, dịka ikpe gbasara onye bụ onyeisi pati ahụ kpọmkwem ka na-aga n'ihu.
"Nani ebe ịwe sị ewe anyi n'ebe Peter Obi nọ bụ ịhe banyere nchekwa o nyere Abure, bụ onye ụlọikpe nyere ịwụ sị ya egosizịna onwe ya ka onyeisi Labour Pati, ya ka Obi na-agaghari na-akwado ya ka onye nke ya," Abure kwuru.
Ọ gara n'ihu kọwaa ihe mere n'ụlọikpe mkpegharị oge a na-ekpe ikpe dị n-etiti Peter Obi na onyeisiala Bola Tinubu gbasara onye meriri ntuliaka 2023.
O kwuru na ya bịara n'ụlọikpe n'ụbọchị ahụ dịkaonyeisi Labour Pati, mana oge ọkaikpe jụrụ onye ga-anọchite anya Labour Pati, "otu nwaanyị onye ọkwa ya dị nta kwụụrụ ọtọ kwuo na ọ bụ ya ga-anọchite Labour Pati".
"Ajụrụ m ajụ. Ekwuru m na onweghị onye ọzọ ga-anọchite anya Labour Pti ebe m nọ n'ụlọikpe ahụ."
"Oge e kpechara ikpe nke ụbọchị ahụ, m si n'ụlọikpe na-apụta, ndị ntaakụkọ chọrọ ịjụ m ajụjụ, mana dịka m na-agwa ha okwu ụfọdụ ndị omekome, ndị m na-eche na ọ bụ Abure maọbụ Peter Obi zitere ha, bịara kwụsị m ịgwa ndị ntaakụkọ okwu."
"Ọ fọrọ ntakịrị ihe ka ha merụọ m ahụ mana ndi uweojii zọpụtara m ma kpọrọ m gaa n’ụlọọrụ ha’’.