"Anaghị m ahụ onwe ka onye nwere nkwarụ" - Ọkpọ ụbọ na-enweghị mkpịsị aka

"Anaghị m ahụ onwe ka onye nwere nkwarụ" - Ọkpọ ụbọ na-enweghị mkpịsị aka

Djagbo Bishop bụ onye oti egwu; ịkpọ ụbọ nke bekee na-akpọ 'bass guitar'.

Ihe nke ya ji atụ onye ọbụla n'anya bụ na o nweghị mkpịsị aka, mana onye nwere mkpịsị aka anaghị akpọ ụbọ karịa ya.

Ọ bụghị naanị ụbọ ka Djagbo Bishop na-akpọ; ọ na-akụ ịgba, ọ na-akpọ 'keyboard'.

Abịa n'ịgụ akwụkwọ, Bishop nwere nzere B.sc nakwa nke 'Masters'.

Aka ya abụọ, nke mkpịsịaka na-adịghị, ka o ji dee ule ya niile na Mahadum Delta Steeti dị n'Abaraka, iji nweta nzere ndị a.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Djagbo Bishop kwuru na ọ bụ etu ahụ ka nne ya si mụọ ya.

Mana ọzụzụ nne na nna ya nyere ya bụ ka ọ ghara ịhụta onwe ya dịka onye nkwarụ, maọbụ onye pụrụ iche n'ebe ụmụnne ya ndị ọzọ nọ.

Nke a mere na oge o toruru ịmalite agụmakwụkwọ, nne na nna ya gbara mbọ chọtara ya ụlọakwụkwọ, dịka ọtụtụ ụlọakwụkwọ jụrụ ịnabata ya.

Ọ bụ n'ụlọụka ka Bishop si malite njem ys n'iti egwu.

"Oge m hụtara na egwu na-amasị m, abanyere m otu ndị na-agụ egwu n'ụlọụka, wee tinye uche m n'ịmụta 'keyboard'," Djagbo kwuru.

"Mana otu ụbọchị ka m hụrụ ebe otu nwata nwaanyị na-amụ 'bass guitar', m na-ele ya anya etu aka ya si emegharị na 'guitar' ahụ, m wee kwuo n'obi m na ihe a bụ ihe m ga-emeli."

"Oge o debere 'guitar' ahụ, agara m bulie ya, malite ịkpọ ihe ahụ m nụrụ ọ na-akpọ. Nke a wee tụọ ndị niile nọ ebe ahụ n'anya."

Bishop kwuru na ịkpọ ụbọ eweterela ya ọtụtụ ihe ọme na ndụ ya, "mụ na ọtụtụ ndị egwu a ma ama dịka Sinach, Frank Edwards, Buchi, etikọọla egwu".

    • Onye dere ya, Vining Ogu
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
    • Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist