You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
'Nwunye nna m boro m na m bụ amoosu gburu nwa ya nwoke'
'Nwunye nna m boro m na m bụ amoosu gburu nwa ya nwoke'
- Onye dere ya, Amaka Bassey
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
N’Akwa-Ibom steeti dị na Ndịda Anyanwụ Naijiria, e nwere ọtụtụ ụmụaka e boro ebubo na ha bụ amọọsu.
Nke a kachasị njọ n’okpuru ọchịchị Oron dị na steeti ahụ.
Gọọmentị steeti ahụ wepụtara iwu n ‘afọ 2012 machiri ịkpọ ụmụaka amọọsu.
Mana nke a egbochighị ndị mmadụ ịkpachapụ ụmụaka ma na-ebu ha ebubo na ha bụ amoosu.
A na-emekpakwa ụmụaka ndị a ahụ, tie ha ihe, gba ha ọtọ ma gbahapụ ụfọdụ ka ha nwụfuo.
Otu n’ime ha a zọtara ndụ ya bụ Udeme bụ onye nwunye nna ya boro ebubo ịbụ amoosu gburu nwa ya nwoke, kọọrọ BBC ihe ọ gabigara: