You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
BBC Africa Eye: Ihe ụmụnwaanyị na-agba odibo na-agabiga n'Afrịka
Nnyocha ngalaba BBC Africa Eye gosiri ihe ụfọdụ ụmụnwaanyị na-agba odibo na mpaghara Afrịka na-agabiga.
Nke a metụtara otu nwagbọghọ aha ya bụ Mercy Mwake bi na mba Kenya bụ onye na-agba odibo n'aka otu ezinaụlọ mana ọ sị na ha na-emekpa ya.
Ọ gara mee mkpesa n'ụlọọrụ ndị uweojii banyere mmekpa ahụ, nke e mechara buga n'ụlọikpe.
Ezinaụlọ ndị Mercy gbaara odibo gọnarịrị ebubo mmegbu ahụ n'ụlọikpe nke mere na ikpe ahụ agaghị etu Mercy siri chọọ.
Mercy mechara gaa n'ụlọ ebe a na-elekọta ndị nwere nsogbu a ma malite ịmụ etu e ji esi nri bụ ebumnobi ya kemgbe.
Kirie n'uju ihe niile BBC Africa Eye chọpụtara na nyocha a: