'Ọtụtụ mmadụ sị na ha chọrọ ịmụta ejima yiri onwe ha dịka anyị'
- Onye dere ya, Ebere Ekeopara
- Ndị mere akụkọ a, Reporter
- Onye dere ya, Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
Ụmụ ejima a ma ama na-eme ejije bụ Chidimma na Chidiebere Aneke enyela ndị ntoroọbịa chọrọ ịbata Nollywood ndụmọdụ ka ha mara na ọ bụghị mmadụ niile ga-apụta na ọnyonyoo.
Kama ka ha mara na o nwere ngalaba ndị na-ede ejije, ndị nhazị ejije, ndị na-esi nri, ndị na-emezi ihu nakwa ọtụtụ ndị ọzọ.
"Onye ọbụla kwesịrị ịmata ebe akaraaka ya dabara, iji gbanahụ mmegbu ọbụla".
Ejima Aneke kwupụtara nke a oge ha na BBC Igbo nwere mkparịtaụka pụrụiche n'Enugwu.
"Kemgbe anyị batara Nollywood, o nwebeghị onye gwara anyị ka o dinaa anyị tupu enye anyị ohere isonye n'ejije".
"Ọ dị mkpa ka onye ọbụla mara ebe bụ akaraaka ya ma ọ bata Nollywood," ka ụmụ ejima ahụ kwuru.

Ha kọrọ ka ha siri malite na Nollywood kemgbe afọ iri na ise gara aga, oge ha gụchara akwụkwọ na mahadum.
Chidiebere na Chidimma Aneka gụkwara akwụkwọ na New York Film Academy, bụ ebe ha tuuru ugo.
Taa ha nwere ụlọọrụ a kpọrọ Aneke Twins Productuon na YouTube, nweekwa A&T Designs nakwa ụlọọrụ ndị ọzọ.



