Lee nwaanyị ji ịgba egwu agbanwe ndụ ụmụaka enweghi ebe obibi

Ihe ruru ụmụaka nde iri na ụma ise anaghị agụ akwụkwọ na Naịjirịa maka ụbịam, nke so n’ọnụọgụgụ kachasị na mbaụwa niile, dịka ụlọọrụ World Bank si kwuo.
Ụbịam anapụla ọtụtụ ụmụaka na-awụgharị n’ụzọ ohere ịbụ ihe ha kwesịrị ịbụ na ndụ ha.
World Bank kwuru na nke a sokwa n'ihe na-eme ka mpụ, ohi na ihe ọjọọ ndị ọzọ na-arị elu n’obodo.
Ihuoma Harrison bụbu otu nwata ndị a ụbịam metụtara n’ụzọ ọjọọ mana ugbua, ọ tụgharịala malite inye ụmụaka dị ka ya enyemaka, ịgbanwe ndụ ha site n’ikuziri ha egwu na nka.
Nne na nna Harrison nwụrụ mgbe ọ ka bụ obere nwa mana ọ gbara mbọ zụlite onwe ya ruo na ngwụcha Mahadum ma zụkwaa ụmụnne nke ya site n'aka ọrụ ya.
Ọ kọwara etu o si laghachi n'ime obodo inye ụmụaka enweghi ebe obibi enyemaka nakwa ịkwụ ụgwọ akwụkwọ ha site n'otu nka ahụ ọ na-eme.
Gee ihe o kwuru n'uju ebe a.:




