Afọ ise agaala kemgbe etiri mkpu mmetọ ụmụnwaanyị na mba Sierra Leone. Ọ gbanweela?

Afọ ise agaala kemgbe etiri mkpu mmetọ ụmụnwaanyị na mba Sierra Leone. Ọ gbanweela?

Ọ bụ n'afọ 2019 ka aka na-achị mba Sierra Leone bụ Julius Mada Bio kwuputara ọnọdụ gbatagbata n'ala ya maka ihe gbasara ịmetọ na iwakpo ụmụnwaanyị ọ kachasị ndị dị na nwata.

Ihe ndị so ọnọdụ ahụ pụta bụ ụfọdụ iwu ọhụrụ nakwa iwu ndị dị adị iji kwu ihe ga-eme onye ọbụla ikpe mara na mmegide iwu a.

Iwu ahụ bụ Sexual Offences Act manyere nga afọ 15 maka onye ọbụla wakoporo nwaanyị nakwa ngwa mkpụrụ ọka maka onye ọbụla metọrọ maọbụ wakpoo nwatakịrị. BBC Africa eye alaghachila mba ahụ ugbua ịhụ ma o nweela ihe gbanwere n'ọnọdụ ahụ.

Njem ha gosiri na okwu ahụ nwere ọgbatauhie dị icheiche mere ịrụ ọrụ ahụ ka ọ raa ahụ.

Ndị uweojii n'otu ụlọọrụ nke dị n'obodo Makeni dị na mba ahụ sị na ndị mmadụ na-ekpesara ha ihe ruru okwu anọ metụtara ya bụ ihe kwa izu.

"O nwere ụfọdụ mgbe ị ga-anụ maka ndị kpara mkpamkpa a mana n'ihi enweghi ụgbọala, ị gaghị enweike ịga nwụchi onye ahụ" ka Abu Bakarr Kanu bụ onyeisi ndị uweojii n'ebe ahụ kwuru.

Ọ dịka iwu ahụ amịtara mkpụrụ n'ịbelata mmetọ na mwakpo ụmụ nwaanyị na ụmụaka. iji ma atụ, mkpesa ụdịrị mpụ ejirila pasentị 17 gbadaa.

Ya bụ na o si na 12,000 n'afọ 2018 gbadarue 10,000 n'afọ 2023 dịka ngụkọ ndị uweojii si gosi.

Lee ihe onyonyo ahụ n'uju ebe a.