Gịnị mere Iran ji awakpo ndị agbata obi ha bụ ndị Alakụba?

Esemokwu nke malitere site na mwakpo mba Amerịka na Izrel jikọtara ọnụ mee n'ime Iran na-akpata ọgbaghara n'ofe 'Middle East'
Tehran kwere nkwa na ha ga-akwụghachi mwakpo e mere ha, mana kama ịtụ ogbunigwe naanị n' Izrel, ogbunigwe Iran emeela ka obodo dị iche iche maa jijiji site na Doha ruo Abu Dhabi, Dubai, obodo Kuwait ruo Manama na Riyadh.
UAE kwuru na otu onye nwụrụ n' Abu Dhabi mgbe ngwo ngwo na ngwo ngwo ebe a tụrụ ogbunigwe daara dịka e gbochiri ogbunigwe ahụ a tụrụ
Akụkọ kwuru na Qatar gbaturu ogbunigwe mana a na-anụ ụda ihe gbara na mba dị iche iche na 'Middle East'.
Ndị a abụghị mwakpo mberede. Na ngụkọ,mba Amerịka nwere ogige nchekwa dị iche iche uru opekata mpe ebe 19(iri na itoolu), ebe asatọ n'ime ha bụ ebe tọọrọ atọ dị na mba ndị ijipt, Baren, Iraq, Izrel,Sirịa, Jọdan, Kuweti, Kata, Saụdi Arabia nakwa 'United Arab Emirates'.
Ogige Al Udeid dị na Qatar nke nọ nso isiobodo Qatar bụ Doha bụ ogige ndịagha ụgbọelu mba Amerịka kachasị na 'Middle East'. Ọtụtụ ndịagha Amerịka nọ ebe ahụ. Ebe ahụ bụ isiụlọọrụ 'US central Command'.
Ụgbọmmiri agha mba Amerịka (Fifth Fleet)nke na-eche nche n' mmiri 'Gulf, 'Red Sea' na 'Arabian Sea', dị na Bahrain.
Tehran adọọla aka na ntị ugboro ugboro na ọ bụrụ na Amerịka gaa n'ihu na-awakpo ha, ogige nchekwa Amerịka nile nọ na mpaghara 'Middle East' ga abụ nke ebumnuche ha ga-awakpo n'agbanyeghị mba ebe ọnọ.
Mba UAE akpọọla mwakpo Iran mere ha 'nkawanye njọ were ike " ibute nnukwu nsogbu", na-ekwu na ha nwere ikike izaghachi ya.



