Festus Keyamo: 'Onye atala Tinubu ụta maka foto Donald Duke, ọ maghị maka ya'

Festus Keyamo: 'Onye atala Tinubu ụta maka foto Donald Duke, ọ maghị maka ya'

Ọnụ na-ekwuchitere pati 'All Progressives Congress' (APC) bụ Festus Keyamo ekwuola ka ndị mmadụ ghara ịta Bola Ahmed Tinubu ụta maka foto Donald Duke nke ndị ntaakụkọ TVC tinyere na-ekwu na ọ bụ Tinubu, n'ihi na Tinubu n'onwe ya amaghị maka ya.

Bola Ahmed Tinubu bụ aka chịburu Legọs steeti, ma bụrụkwa onye na-azọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa na pati APC.

Keyamo kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ọdị nso a na Legọs.

Keyamo sị na Bola Tinubu nwere foto nke aka nke ya, na ọ gaghị asị ka a maama jiri foto onye ọzọ mere foto nke ya.

Ọ sị na o nwereike bụrụ na ndị nkwado ya jiri aka ha mepụta ya bụ ihe onyoonyo, na ọ bụ na Bola Tinubu onwe ya eleghị ya bụ ihe onyoonyo anya.

Ọ sị na ndị mmadụ emerela vidio karịrị narị atọ na ọ bụghị meghie a maama mee.

Keyamo si na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-eji okwu ụka akpọkọta isi ndị nsonso iji megharịa ha wee nweta ihe ha chọrọ.

N'okwu gbasara okpukperechi na-ewu ewu maka etu Bola Tinubu bụ onye okpukperechi Islam jiri wee họrọ onye okpukperechi Islam, mere ndị mmadụ kpụ n'ọnụ Festus Keyamo si na ya bụ ihe egbochighị ọrụ ha ga-arụ maọbụrụ na ha merie.

Onye bụ Bola Ahmed Tinubu?

Ọtụtụ ihe gbasara ebe ọ gara ụlọakwụkwọ dịka nwanta edochabeghị anya mana lee ihe anyị ma maka Bola Ahmed Tinubu:

  • Ọ bụbu Gọvanọ Legọs site 1999 ruo 2007.
  • Tupu oge ahụ a marala ya dịka onye na-esokarị Moshood Kahimawo Olawale Abiola, onye e jiri MKO Abiola mara.
  • N'oge ntuliaka 1993 mgbe Naịjirịa họrọla MKO Abiola dịka Onyeisiala na ntuliaka e mere n'oge ọchịchị onyeisiagha Ibrahim Badamosi Babangida (a maama dịka IBB), Bola Tinubu meriri ọkwa Sineto Legọs na ntuliaka ahụ, Mgbe Ọchịagha IBB kagburu ntuliaka June 12, 1993, Sinetọ Bola Tinubu soro ndị nsonso MKO gbara ọsọndụ pụọ na Naịjirịa.
  • Ọ bụ onye ji ọkọlọtọ APC azọ ọkwa Onyeisiala na Naịjirịa na ntuliaka Naịjirịa n'afọ 2023.
  • Osote ọ họrọla bụ Sinetọ Kassim Shettima bụbu Gọvanọ Bọrnu steeti n'oge awakporo ụmụakwụkwọ na Chibọk, Bọrnọ.
  • Nwunye Bola Tinubu bụ Remi Tiinubu, bụ Sinetọ na Naịjirịa site 2015 ruo ugbua, ọ bụkwa onye Delta Steeti na Naịjirịa.

Onye bụ Festus Keyamo?

Festus Keyamo bụ onye ọkaiwu amaama na Naịjirịa gbagotere ọkwa SAN na Naịjirịa bụ ihe e jiri mara Senior Advocate of Naijiria.

  • Ọ gara ụlọakwụkwọ Gọọment n'Ugheli a kpọrọ Government College Ughelli.
  • Ọ bụ onye nsonso Gani Fawehinmi.

Cheta na n'ọdịnso a, ụlọ ntaakụkọ TVC mere akụkọ maka ndụ Tinubu nakwa etu o si tolite.

N'ime akụkọ ahụ, ha gosiri foto otu nwata nwoke, nke ha kwuru na ọ bụ mgbe Tinubu dị na nwata.

Mana aka chịburu Cross River steeti bụ Donald Duke pụtara kwuo na foto ahụ bụ foto ya onwe ya bụ Duke oge ọ dị afọ iri na abụọ.

Nke a mere ka ndị mmadụ na-akatọ Tinubu maka itinye foto mmadụ dịka nke ya.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo, Festus Keyamo kọwara na ọ bụghị Tinubu ka ụta dịịrị kama ọ bụ onye ntaakụkọ mere akụkọ ahụ.