Onye bụ Godswill Obot Akpabio?

Aha onyonyo, Onye bụ Godswill Obot Akpabio?
Onye bụ Godswill Obot Akpabio?

Godswil Obot Akpabio bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị a ma ama na Naịjirịa.

A mụrụ ya n’abalị itoolu nke ọnwa Dismeba 1962 n’obodo Ukana, Ikot Ntuen dị n’okpuru ọchịchị Essien Udim n’Akwa Ibom steeti.

Njem ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya malitere n'afọ 2002 oge a họpụtara ya dịka Kọmịshọna na-ahụ maka mmanụ agbidi na ihe ọnatarachi n'Akwa Ibom steeti.

Ọ rụkwara ọrụ dịka kọmịshọna na-ahụ maka okpuru ọchịchị nakwa kọmịshọna na-ahụ maka ala na ụlọ na steeti ahụ.

Ọ gakwara n'ihu chịa Akwa Ibom steeti dịka Gọvanọ malite n'afọ 2007 ruo afọ 2015.

Akpabio arụọla ọrụ dịka mịnịsta na-ahụ maka ihe gbasara Niger Delta.

Ugbua, Godswill Akpabio bụ onyeisi ụlọomeiwu Sineti Naịjirịa.

Foto Godswill Akpabio ebe o kpu okpu na-acha ọbara ọbara ma na-achị ọchị