You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Etu mmachi otu jikọtara ndị keke si emetụta ndị Anambra steeti
Ndị bi n'Anambra steeti gwara BBC Igbo etu mmachi gọọmentị steeti ahụ machiri keke na bọọsụ si emetụta ha.
Ha kwuru na kemgbe a machiri ụgbọala ndị a, na ịgara mkpa ha na-arazị ahụ.
Ebe ụfọdụ kwuru na iji naanị ụkwụ agagharị na-egbuzi ha mgbu n'ahụ, ndị ọzọ kwuru na ọ bụ ha bụ "ụmụogbenye" na-enweghi ụgbọala nke ha ka ọ kacha emetụta.
Ndị na-anya keke ji ohere ahụ gwa gọọmentị ka ha mee ebere ma butuo ego ole gọọmentị na-ana ha n'ụtụisi.
Cheta na Gọọmentị Anambra steetị depụtaburu akwụkwọ maka mmachị a na steeti ahụ, ebe ha nọ kọwaa na ihe kpatara ya bụ mmachi bụ maka etu ụfọdụ ndị otu a sị azọ ọkwa onyeisioche ga na-anakọta ego n'ọgbọ (park) ha.
Nke a mere ka gọọmentị steetị ahụ machie ha ọnwa isii ruo mgbe gọọmentị ga-enyochacha ihe butere nsogbu n'etiti ha.
Gọọmentị kwukwara na ndị otu a na-ebute ọgbaaghara n'obodo, ma kwuo na machi a ga-enyere ndị otu ahụ aka ịhazigharị onwe ha, họpụta ndị isi bụ nke gọomentị ga-amata dịka ndị isi ha.
Gọọmentị na ndị otu a kwekọrịtaburu na ha ga-amailte ịna ụtụisi dị icheiche ma hibekwa ụsọrọ enyemaka ga-enyere ndị ọkwọụgbọala aka, ọkachasị n'ahụike ha.
Na ya bụ nkwekọrịta, ndị keke ga-amalịte ịkwụ N4,000 n'izuụka maọbụ N15,000 n'ọnwa.
Ndị Keke nọ n'okpuruọchịchị asatọ ebe e nwere ọnọdụ onye apụla ezi n'abalị, ga-akwụ N3000 n'izụụka maọbụ N12,000 n'ọnwa.
Ndị dị etu a ga-amalitekwa ịkwụ N4000 kwa izuụka nakwa N15,000 kwa ọnwa mgbe e wepuru ọnọdụ onye apụla ezi n'ogbe ha.
Ndị bọọsụ ga-akwụwa N5000 kwa izu na N20,000 kwa ọnwa.
Ndị bọọsụ ASUU ga-akwụwa N2500 kwa izu maọbụ N10,000 kwa ọnwa rụọ mgbe e mepere ụlọakwụkwọ, bụ mgbe ha ga-amalite ịkwụ N5,000 nakwa N20,000.