'Inconclusive', 'Run off' na etu ndị ọzọ ntuliaka 2023 nwereike isi gaa
- Onye dere ya, Makuochi Okafor
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist
- Ebeg o si, Lagos
Ntuliaka 2023 abịaruola, e nwere ọtụtụ ọnọdụ nwereike ịdapụta n’ime ntuliaka a, kpụkete nso ka m kọwara gị ya.
Ọnọdụ mbụ:
Ọ bụrụ ụlọọrụ nhazi ntuliaka Naịjirịa bụ Inec kwupụta na ntuliaka e mere na-emerughị ya n’isi nke a na-akpọ ‘inconculsive’ na Bekee Inec ga-ahazị ntuliaka ọzọ ngwa ngwa n’ebe ndị e meghị ya bụ ntuliaka. Ọ ga-abụ site na ntuliaka ọhụrụ ahụ ka a ga-esi nweta onye mmerị. Nke a so na ohere iwu ọhụrụ ntuliaka Naịjirịa nyere.
Ihe nke a pụtara bụ na ọtụtụ ndị mmadụ nwere akwụkwọ ikike ịtụ vootu ma chọrọ ịtụ vootu atụghị ya n’ihi ihe ọdachị dị iche ich.

Gịnị nwereike ime a sị na ntuliaka dị ‘inconclusive’?
Ọtụtụ ọnọdụ dịka enweghị nchekwa, mgbochi ndị ọrụ Inec ibughari ngwa e ji atụ vootu, ọ bụrụ na akụrụ ngwa e ji atụ vootu arụghị ọrụ nakwa ihe ndị ọzọ nwereike imetụta ọtụtụ mpaghara nke ga-eme Inec ekpebia na ntuliaka e mere dị ‘inconclusive’.
Marakwa na Inec ga-ekwupụta nke a ma ọ bụrụ na ọnụọgụgụ nchịkọta ndị nakwa ebe ndị ana-atụghị vootu buo oke ibu nke bụ na ọ metụtara mpụtara ntuliaka onye nke mbụ ebe onye nke abụọ ahụghị azụ ya anya maọbụ na akụrụ ngwa arụrgụ ọrụ nke mere onye meriri jiri ọtụtụ vootu gafee onye nke ọzọ n’ihi na vootu a kagburu dị nnukwu.

Ọnọdụ nke abụọ:
Iji nweta mmeri ọkwa onyeisiala, onye na-azọ ọkwa ga-enwetarịrị vootu kacha elu na Naịjrịa niile, nakwa nweta opekatempe vootu pasentị iri abụọ na anọ n’ime steeti iri na anọ na Naịjirịa tinyere Abuja.
Ọ bụrụ na e nweghị onye n'ime ndị a na-azọ ọkwa a nwetere nke a, Inec ga-ahazi ntuliaka ọzọ n'ime abalị iri abụọ na otu n'etiti ndị abụọ kacha nweta vootu.
Ya bụ na a ga-eyigharị ntuliaka ọkwa gọvanọ ma nke a mee.

Ọnọdụ nke atọ:
Ọ bụrụ na ọgbaghara dapụta n’akụkụ Naịjirịa dị iche iche nke bụ na ya bụ ihe metụtara ntuliaka, Inec ga-ahazịgharị ntuliaka ngwa ngwa n’akụkụ ebe ndị ahụ niile iji hụ na ndị mmadụ tụrụ vootu tupu ha ewepụta ozi mpụtara ntuliaka ahụ,.
Ọnọdụ nke anọ:
Ọ bụrụ na Inec kpọpụta mpụtara ntuliaka ma onye nke abụọ na mpụtara ahụ jụụ ikwenyere ya, ohere iwu nyere bụ na ọ ga-eburu okwu ahụ gaa ụlọikpe, mana atụmatụ ọbụla na-abụghị ibuga ya ụlọikpe bụ ihe a ga-ahụta dịka ịgba mgba okpuru nke ndị Bekee na-akpọ ‘Mutiny’.
Agbanyeghi nke a, onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola ugboro ugboro n'oge ọchịchị ya a, na ntuliaka afọ a ga-aga siriri werere ma nwee mpụtara dọrọ anya.




