Etu m si eji ụkara nsibidi, uli na Mbarị akọ akụkọ omenala ndị Igbo - Chinwendu Kelechi

Etu m si eji ụkara nsibidi, uli na Mbarị akọ akụkọ omenala ndị Igbo - Chinwendu Kelechi

Chinwendu Kelechi bụ nwada Igbo na-eji ụkara Igbo ese nka pụrụiche akọwaala ihe kpalitere mmụọ ya o jiri banyere n'ụdịrị nke ahụ.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, ọ sị na o nwere nnukwu mmasị n'ichekwa akụkọ na omenala ndị Igbo ka ha ghara ịnwụ.

N'okwu ya "site n'ihe ndị a m na-ese nakwa n'ikuziri ya ụmụaka, akụkọ na omenala ndị Igbo agaghị anwụ kama ha gaa na-agbasa ebe niile.

Chinwendu sị na ụdịrị nka a ọ na-ese na o nweghi onye kuziiri ya, na ọ bụ ihe ndị ọ chọpụtara site n'ụkara nsidi, uli, ekpe, mbarị nakwa ụkara ọhụrụ nke o ya onwe ya wepụtara.

O kwuru na e bipụtala nka ya n'ihu akwụkwọ nakwa ihe onyonyo dị iche iche, gụnyere ihe onyonyo kọrọ akụkọ banyere nwafọ Igbo e rere n'ohu mgbe gboo aha ya bụ Oluda Ikwuano.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ na-enwete ego site n'ihe ndị a ọ na-ese.

Kirie ihe o kwuru n'uju ebe a: