A mụtara m asụsụ ndị Chịana n’Anambra tupu m apụọ Naịjriịa - Ifeoma Amuche

Aha onyonyo, A mụtara m asụsụ ndị Chịana n’Anambra tupu m apụọ Naịjriịa - Ifeoma Amuche
A mụtara m asụsụ ndị Chịana n’Anambra tupu m apụọ Naịjriịa - Ifeoma Amuche

Ifeoma Amuche bụ nwada aha ya wuru ewu na soshal midia na nso nso a maka ịsụ asụsụ mba Chaịna akọwaala etu o siri mụta ya bụ asụsụ.

Na mkparịtaụka ya na BBC nwere, Amuche kwuru na o so n’ime ndị kachasị mee nke ọma n’otu ndị gụchara n’ụlọakwụkwọ ya dị na Chongqing, Chaịna.

Amuche kwuru na ọ mụtara ya bụ asụsụ na mahadum Oko Polytechnic dị n'Anambra steeti. Ụlọakwụkwọ a nwere ngalaba na-akụzi asụsụ Chaịna dịka o siri kwuo.

Ifeoma Amuche

Ebe foto si, Ifeoma Amuche

O kwuru na ọ dịghịrị ya mfe mana obi dị ya mma na otu onye nkuzi ya gbara isi akwara hụụ na ọ mụtara ya bụ asụsụ.

O kwukwara etu o siri gbaa ezigbo mbọ n’ịgụ akwụkwọ na mba ahụ nke mere o jiri soro na ndị kachasị me nke ọma n’ime ndị gụchara n’ụlọakwụkwọ ya n'afọ 2023.

O kwuru na ọ bụ ihe ọṅụ nye ya etu ọha siri nabata ihe o ritere.

Ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa gụnyere onye zọrọ ọkwa onyeisiala 2023 n’aha Labour Party bụ Peter Obi toro ya na soshal midia maka ihe o mere.

Kirie onyonyo dị n'elu akụkọ a ka ị gere ihe ọ gwara BBC Igbo ebe a.

Skip X post

Content is not available

View content on XBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of X post