Ime onyonyo na soshal media na-enye m mbada ego ugbua - Justin Ug

Ime onyonyo na soshal media na-enye m mbada ego ugbua - Justin Ug

Otu nwaamadị a ma ama na soshal midia dịka Justin Ug nke ezigbo aha ya bụ Chukwudi Justin Ugonna gwara BBC Igbo etu o siri malite ọrụ a nke na-enye oke ego ma na-abara ya uru ugbua.

Ugonna bụ onye ntorobịa kọwara na ọ malitere ime ihe onyonyo ndị a ka ihe egwu, ọ maghị na ya bụ ihe ga-eduru ya gaa ebe ndị ọ na-eduba ya ugbua.

O kọwara na ebumnobi ya bụ itolite n’ọrụ ruo oge ọ ga-abanye ọrụ ime ejije na Nollywood.

N’okwu ya, ọ sị ‘Ịmepụta ihe onyonyo adịghị mfe ma ncha’

“Agbara m oke mbọ mụtachaa ọrụ ndị a nke gụnyere isete ihe onyonyo, idepụta akụkọ ndị m ga-eme n’onyonyo, ihazị ya bụ ọrụ ka ọ dị mma.’

Ugonna kọwara na ndị ezinaụlọ ya, ọkachasị nne ya na-akwadosi ya ike n’ọrụ a dịka ọ bụ ihe na-enye ha obi ụtọ na aha ya nakwa ọrụ ọma ya na-efesa ụwa niile.

Ọ kọwara na ọ na-eṅọmị ọtụtụ ndị malitere ọrụ a na Naịjirịa ma tinye ntọọala ya dịka o jila anya ya hụ na ya bụ ihe abụghị egwu ụmụaka.

Na mkparịtaụka, ọ kọwara na ọ gụụrụ akwụkwọ na mba Amerịka dịka ọ bụghị naanị mmepụta ihe onyonyo ka ọ na-eme.

Ọ gụrụ ‘Infomation technology’ bụ ọrụ gbasara nhazị ozi ndị teknụzụ.

O kwukwara na o nwere ụlọọrụ na-emepụta uwe ndị mmadụ na-eyi ijikwa gosi na ọ na-agbasiri onwe ya mbọ nke.

Ugonna onye e ji mmepụta onyonyo banyere ihe ndị mere n’oge ụlọakwụkwọ Sekọndịrị kwuru na ọ gụrụ akwụkwọ n’ọkwa Sekọndịrị na Naịjirịa tupu ọ gafee mba ofesi.

Nke a mere o jiri kwuo na ihe ndị ọ na-eme n’onyoyo ya bụ ihe ndị echiche ya chepụtara site n’ihe ndị mere na ndụ ya, maọbụ ndị nọ n’akụkụ ya.

Ọ dụrụ ndị ntorobịa chọrọ ịbanye ụdịrị ọrụ ọdụ kwuo na ya bụ ihe na-enye ezigbo ego mana onye ọbụla chọrọ ibanye ya ga-enwe ndidi ma dịkwa ụchụ imepụta ya bụ ihe ugboro ugboro.

N’okwu ya, ọ kọwara hoo haa:

“E si n’ịgba egwu wụba ime onyonyo na soshal media nke na-enye m mbada ego ugbua"

Kirie ihe ndị o kwuru na mkparịtaụka a n’uju ebe a.