"Aga m abụ onye odibo nye ndị Enugwu ma m bụrụ Gọvanọ" - Ụkọchukwu Obi-Ozoemena

"Aga m abụ onye odibo nye ndị Enugwu ma m bụrụ Gọvanọ" - Ụkọchukwu Obi-Ozoemena

Onye ụkọchukwu, Obi Ozoemena, ji otu 'African Democratic Congress' (ADC) azọ ọkwa gọvanọ Enugwu steeti ekwela ndị Enugwu nkwa ihe ọ ga-emere ha ma ha họrọ ya dịka gọvanọ ha.

Ọ rụtụrụ aka n'ihe niile na-anaghị aga ọfụma ma kwuo na n'ihi ahụmihe ya dịka onye birila mba ofesi ọtụtụ oge, na ya ga-eweta ọdachi ndị a n'isi njedebe.

O kwuru maka etu ndị ojiegbe si wakpo ya ma gbakasịa ụgbọala nke ya na ezinaụlọ ya nọ n'ime ya, mana Chukwu zọrọ ha.

Ozoemena sị na ọ macha mkpagbu ndị Enugwu na-agabiga nakwa na ihe ọ ga-eme iji tụgharịa ya ka ọnọdụ Enugwu dịkwa mma.

O kwuru na ọ hapụrụ ezigbo ọrụ ọ na-arụ na mba Amerịka bịawa ịzọ ọkwa gọvanọ na Naịjria n'ihi ịhụnanya o nwere maka ndị obodo ya bụ Enugwu.

Matakwo na...

Pati African Democratic Congress (ADC) bụ otu n'ime ndọrọndọrọ ọchịchị na-azọ ọkwa dị icheiche na Naịjirịa.

Naịjirịa malitere ọchịchị onyekwuouche ya ọzọ n'afọ 1999 dka ndị ọchịagha chịchara n'afọ 14.

Na Naịjirịa, patị abụọ a kacha mara bụ All Progressives Congress (APC) na People's Democratic Party (PDP).

Mana n'ọdị nso a, 'Labour Pati esorola na pati ndị ama ama, n'ihi onye na-azọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa na pati ahụ, Peter Obi, onye ọtụtụ ndị ntorobịa na-enye nkwado pụrụ iche.