Etu m si tụọ ime mụọ nwa na-agbanyeghi ọrịa PCOS - Stephanie Coker Aderinokun

Aha onyonyo, Etu m si tụọ ime mụọ nwa na-agbanyeghi ọrịa PCOS - Stephanie Coker Aderinokun
Etu m si tụọ ime mụọ nwa na-agbanyeghi ọrịa PCOS - Stephanie Coker Aderinokun
    • Onye dere ya, Kelechi Anozie
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
    • Ebeg o si, Lagos

Onye a ma ama na-eme ihe nkiri bụ Stephanie Coker Aderinokun n'ajụjụ ọnụ a ya na BBC Igbo nwere na-akọwa njem amụghị nwa na ahụmịhe ya gbasara ọrịa Polycistic Ovary Syndrome (PCOS).

Ọ na-agwakwa anyị ka ahụmahụ ya siri mee ka ọ malite ịkwado ndị inyom na-emekọ ihe na PCOS na ime Ihe onyonyo 'Where The Heck is My Period?' si na ihe ndị ọ gabigara nakwa mkpebi ya ime mkpọtụ maka PCOS nakwa ịkwụsị amaghị ihe so ya

Gịnị bụ PCOS?

World Health Organization (WHO) kọwaara na Polycystic ovarian syndrome bụ PCOS n’ịchafụ bụ ọrịa na-emetụta kemịkalụ dị n’ime ahụ nwaanyị.

Ọ na-ebute kemịkalụ adịghị nhatanha, nsọ abịaghị kwa ọnwa, androgen ịrị elu nakwa mkpụrụ n’ime ngalaba akụkụ ọmụmụ nwaanyị.

Ọ na-emetụta ihe ruru site na pasentị asatọ rue pasentị iri na atọ ụmụnwaanyị tozuru ọmụmụ.

“Dịka nwaanyị lụrụ di, ọ siri ezigbo ike ịtụrụ ime...mgbe ọbụla m banyere n'ime ụlọ mposi ji lelee ma m dị ime wee hụ na-adịghị m... ọ na-ewute m nke ukwuu’’

PCOS nwere ọtụtụ mgbaama mana Stephanie Coker gwara anyị na nke kachasi na-egosi na ahụ ya bu igba oke ajị na etutu n’ihu, o kwuru na ọrịa eweghị ọgwụgwọ.