Chibuike Napoleon: Amalitere m ọrụ idugharị ndị ọbịa n'ogige ụmụanụmanụ ka m dị afọ isii

Aha onyonyo, Nwatakịrị na-arụ na 'zoo'
Chibuike Napoleon: Amalitere m ọrụ idugharị ndị ọbịa n'ogige ụmụanụmanụ ka m dị afọ isii
Nwatakịrị

Otu nwata nwere mmasị n'ụmụanụmanụ a kpọrọ Chibuike Napoleon akọwaala etu o si malite ịrụ ọrụ dịka onye na-edugharị ndị ọbịa bịara n'ọgịge anụmanụ.

Nwatakịrị a dị afọ 11 kwuru na mkparịtaụka na ọ bụ ka ọ gbara afọ isii ka ọ malitere ọrụ a.

O siri, "M gacha ụlọakwụkwọ lọta, mecha ihe m na-eme n'ụlọ, a gawa m ogige ụmụanụmanụ."

O kwụrụ na ọ ga-amasị ya ịgụ akwụkwọ maka dọkịta ụmụanụmanụ, iji nye ya ohere ịna-eleta ha ma ha daa n'ọrịa.

Kirie ihe onyonyo a n'ụju: