You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Etu ụmụafọ Imo Steeti si ata ahụhụ n'ihi enweghi ọkụ latrik kamgbe NLC gbara abụbụọrụ
Ụmụafọ Imo steeti na-azụ ma na-eme ihe ndị ọzọ dị iche iche akwaala arịrị maka nsogbu enweghi ọkụ latrik kamgbe ihe karịrị otu izuụka otu jikọtara ndị ọrụ Bekee bụ NLC malitere abụbụọrụ na steeti ahụ.
Nke na-abịa dịka ndị NLC were iwe maka etu e si tie onyeisi ha bụ Joe Ajaero ihe n’Owerri mgbe ọ ga-ara ịkwado ndị otu ka ha mee ngagharịiwe na abụbụọrụ megide gọọmentị Imo steeti.
Ụmụafọ Imo kwuru na ọ dịghị mma ka ndị nkịtị na-ata ahụhụ n’ihi esemokwu dị n’etiti gọọmentị na ndị ọrụ.
Ụfọdụ ha kwuru na nke ka ọjọọ bụ na ọnụego mmanụ ụgbọala e ji amụ ọkụ latrik arịala elu orji, nke bụ ha na-azụta otu lita mmanụ ụgbọala n’ọnụego N750.
Otu onye na-akwa uwe kwuru na ọ na-emefu ego karịrị puku naịra ise (N5000) kwa ụbọchị n’ịzụta mmanụ o ji amụ ọkụ latrik iji rụpụtara ndị mmadụ uwe ha.
“Ọ bụrụ na ị gbakọọ ego ahụ kwa izuụka, ị ga-ama ego ole ọ bụ. Ana m akwazi akwa ego ole?”
Ndị a gara n’ihu rịọ ndị NLC arịrịọ ka ha biko kwụsị abụbụọrụ a maka na ọ bụ ndị nkịtị na-ata ahụhụ ya.
“Mgbe enyi abụọ na-alụ ọgụ, ọ bụ ụmụ ahịhịa na-ata ahụhụ ya”.
Emmanuel Ugboaja bụ odeakwụkwọ NLC kwuru na kamgbe ihe a mere na gọọmentị Imo nakwa nke etiti ekwubeghi ihe ọbụla banyere ya.
“Ọ bụ ihe ihere na gọọmentị Imo na ndị uweojii ga-agbakọta aka tie onyeisi ndị ọrụ na Naịjirịa ihe.”
O kwuru na ihe ndị mmadụ kwesịrị ịna-ekwu maka ya bụ etu a ga-esi nwete ikpe ziri ezi nye onyeisi ha bụ Ajaero.
N’aka nke ọzọ, gọọmentị Imo steeti kwuru na ha ndị ọrụ Bekee enweghi esemokwu ọbụla na steeti ha na o nweghi onye ọrụ ọbụla e ji ụgwọ.