Celine Dion: Gịnị bụ 'Stiff Person Syndrome'?
Ọtụtụ ndị otiegwu a ma ama bụ ndị egwu Celine Dion na-amasị, ezigarala ya ozi nkwado na iti aka n’obi dịka ọ gbara ama na ọ na-arịa ọrịa enweghị ngwọta.
N’ozi Dion bụ onye Kanada e ji efere egwu “Where Does My Heart Beat Now” mara, Dion kwuru na nso nso a n’ọbaozi ya n'Instagram ya na ya agaghị enwe ike ịme njem ịgagharị n’ụwa ebe o kwesịrị iti egwu malite n’afọ 2023 n’ihi nsogbu ahụike ya.
“ Ọ sịrị, “Mụ na ọrịa na-alụ kemgbe ogologo oge, m na-adọga na-ebu ya.”
“Ọ na-ewute m na agaghị m enwe ike mee njem m kwadoburu ime na Yurop malite na Febụwari afọ 2023.”
O kwuru na ọrịa ahụ enweghị ngwọta ugbua dịka ndị ọrụ ahụike ka na eme mmụta banyere ya bụ ọrịa nke naanị otu onye n'ime otu nde mmadụ na-arịa n'ụwa.
Dion kwuru na a hụrụ ọrịa a kpọrọ ‘Stiff Person Syndrome’ n’ahụ ya ma kọwa na ọ nwereike kpọnwụọ ya ahụ n’ọdịnihu.
Gịnị bụ ọnọdụ ahụike a? Kirie ihe onyonyo a n’uju ka ị ghọta ya.

Ebe foto si, Getty Images
Content is not available
View content on XBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of X post



