You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Gbam ụkwụ n'eze: Ihe mere m ji malite 'Bleaching'
BBC Igbo na-amalite nzipụta ozi ngere na ntị nke mbụ nke Bekee na-akpọ 'Podcast'.
N'ihe ngere nke mbụ a, BBC Igbo natara ozi n'aka ụfọdụ ndị gbanwere anụ ahụ, ha kọwara ihe mere ha jiri mee nke ebe otu dọkịnta tinyekwara ọnụ na ya bụ okwu.
Dịka ala Naijiria bụ ala ndị isi ojii, agwa akpụkpọ ahụ ndị mmadụ dị ịcheịche.
E nwere ndị na-acha ọcha nke ukwu, nwekwaa ndị dị ezigbo ojii, nwee ndị agwa elu ahụ ha nọ n'etiti ịdị ọcha na ịdị ojii.
Mana, ọ dị ka ọtụtụ mmadụ ugbua, ọkacha n'agbara ọhụrụ na-agba mbọ igbanwe agwa akpụkpọ ahụ ha, ọkachasi ndị isi ojii.
Ufọdụ n'ime ndị a na-ekwu na ọ bụ ihe ha gabigara mere ha ji banye n'ụdịrị omume a.
Ọtụtụ n'ime ha na-ekwu na ọ bụ etu e siri kpasị ha agwa butere atụmatụ a.
Akparamagwaa na-akpa omume metụtara ihe Bekee na-akpọ "Colourism" nke bụ ụdị ịkpa ókè na-akwado ndị nwere akpụkpọ ahụ ka dị ọcha karịa ibe ha agbanyeghi na ha si n'otu agbụrụ.
Gere ihe ha kpara n'uju n'elu akụkọ a.