You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ọrịa Psoriasis mere ka m mepụtawa ude na-edozi ahụ m nakwa nke ndị mmadụ - Udoka Nwosu
Ọrịa Psorịasis mere ka ndị mmadụ gbawara m ọsọ dịka onye bu ekpenta.
Nke a bụ okwu si n'ọnụ Udoka Ahubelem Nwosu pụta dịka ọ na-akọ maka etu o si malite iji akụrụngwa si n'ihe chi kere mepụtawa ude na ihe ndị na-edozi ahụ.
O kwuru na ọ bụ ude ahụ ọ na-emepụta ugbua ka o ji ebelata nsogbu Psoriasis ma nyekwa ndị mmadụ udiri ude ga-edozi ahụ ha ma nwee nsogbu anụ ahụ.
Udoka kwuru na ugbua, o nwetala ikike n'aka ngalaba dịka National Agency for Food and Drug Administration and Control, imepụta ude, ncha na ihe ndị ọzọ na-enye aka idozi ahụ ndị mmadụ.
O kwuru na nsogbu ahụ ọrịa ahụ nyere ya mere ka o ga-amụọ ihe gbasara idozi anụ ahụ na ụlọakwụkwọ.
N'ọnụ ya, "ebumnuche m bụ ka m nwee ebe ndị mmadụ ga na-abịakụte m a nata ndụmọdụ na usoro e si edozi ahụ maọbụ nweta ogbugbo gbasara nsogbu anụ ahụ."
O kwuru na otu nsogbu ọ na-enwe dịka o mepere ebe ọ na-emepụta ude na ncha e ji edozi ahụ bụ na inweta akụrụngwa ndị ahụ nke chi kere na-ara ahụ.
Udoka kwuru na etu ọnụ ego ihe ndị dị n'ahịa si agbago elu bụkwa ọgbata uhie dịrị azụmahịa a ọ maliterela ugbua.
Mana o kwuru na otu ihe na-akasi ya obi bụ nkwado ezinụlọ ya na-enye ya n'azụmahịa a tụmadị di ya.
Otu ndụmọdụ Udoka na-enye ndị ntoọrọbịa bụ ka ghara ikwe ka ihe ọbụla butuo mmụọ ha n'imepụta ihe dị mma ga-abara onwe ha nakwa ndị nọ n'akụkụ ha uru.
Ihe National Health Services kwuru maka Psoriasis
Ngalaba National Health Services nke England ekuwola na ọ bụ mbelata ka a na-ebelata ọrịa Psoriasis n'aka dọkịnta.
Ha depụtara n'akara websaiti ha na enwetabeghị ọgwụgwọ ọrịa ahụ kpọmkwem.
Ọ bụrụ na ọrịa Psoriasisi ji gị na njọ nke bụ na ịnaghị anatali ọgwụgwọ, dọkịnta gị nwerike ịziga gị n'aka ọkaibe n'ọrịa gbasara akpụkpụ ahụ, bụ ihe NHS dere na websaiti ha.
Ọ dịkwa mma ka ị gwa dọkịnta gị maọbụrụ na ọgwụgwọ nke ị na-anata anaghị enye gị ihe ịchọrọ maọbụ na-enye gị nsogbu.
NHS kwuru na ọgwụgwọ nwerike ịdanye n'ogo atọ a:
- Nke e ji ude na mmanụ agwọ
- Nke e ji utraviolet light agwọ
- Nke e ji ntutu a na-agba agba agwọ
- Ụfọdụ oge a na-ebukọ ọgwụgwọ ndị a ọnụ
- E kwesiri ị na-ahazigharị ọgwụgwọ Psoriasis ka e wee mata nke kacha arụrụ ọrụ n'ahụ gị.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: