Chioma Jazmine Okafor: Etu m si mata di m na Tik Tok, anyị agbaa akwụkwọ n'ime ọnwa abụọ - Ada Mr Ibu

Ọbịbịa soshal midia emeela ka ụwa niile dịzie ka otu obere obodo, maka na mkparịtaụka mmadụ na ibe ya adịwanyela mfe.

Ọ dịzi mfe mmadụ ịnọ na Naịjirịa mete enyi onye mba ofesi ha abụọ esi otu ahụ bụrụ nnu na mmanụ.

Otu a ka ihu ọma si kpọọ Chioma Jasmine Okafor, bụ ada John Okafor (Mr Ibu), onye e ji ejije Nollywood mara.

N'ọnwa Disemba afọ 2021 ka Jasmine Okafor zutere otu nwaokorobịa aha ya bụ David Mounds n'ọgbakọ soshal midia a kpọrọ Tik Tok, o ruo n'ọnwa Febrụwarị afọ 2022, ha abụọ abụrụ di na nwunye.

Ihe tụrụ ọtụtụ mmadụ n'anya banyere akụkọ a bụ na David Moundz bụ nwaafọ mba Amerịka, onye na-akpabeghị ụkwụ mbụ na mpaghara Afrịka.

Jasmine na di ya bụ David agbaalarị akwụkwọ n'ụlọikpe, ma na-echezi ka ha gbaa nkwụ ma gbakwaa akwụkwọ nke ụlọụka.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo, Jasmine David Mound gwara BBC Igbo ihe mere o ji lụọ nwoke ọ hụrụ na Tik Tok n'ime ọnwa abụọ.

"Ọtụtụ na-ekwu na ọnwa abụọ ezughị iji mata mmadụ nke ọma tupu e kwuwe okwu ọlụlụ, mana ọ bụghị ogologo oge mmadụ abụọ matara onwe ha bụ isiokwu," Jasmine kwuru.

"Ihe mere m ji kweta ịlụ David Moundz bụ maka na ọ hụrụ m n'anya nke ukwuu."

"Ọ na-enye m oge ya, ma mgbe ọ nọ n'ụlọ, ma mgbe ọ nọ n'ọrụ, oge niile mụ na ya na-akpa n'ekwentị."

"Ya kpatara m ji sị na nwoke a na-enye m oge ya niile kwesịkwara ka m nye ya oge m."

Jasmine kwuru na nna ya bụ Mr Ibu, na ndị ezinụlọ ya niile nabatara David Moundz dịka di ya.

"Ihe ka ha mkpa bụ ịhụ na m na-enwe obi aṅụrị oge niile. Ebe ha ma na nwoke a na-enye m obi ọma, ha kwadoro mụ na ya."

Chioma kwuru na ya anaghị egosi ihu di ya na soshal midia, maka na ọ chọghị ka ihe niile gbasara ya dịrị n'ọba ịntaneetị.

Mana ọtụtụ malitere ikwu na o nwereike ịbụ na nwoke ahụ alụbuola nwaanyị mbụ, nke mere o ji ezo ihu ya ezo.

"Alụghị m di mmadụ, maọbụ enyi nwoke mmadụ," Chioma kọwara.

"Di m alụbeghị nwaanyị mbụ na ndụ ya."

"Kama ọ bụ m kpebiri na achọghị m itinye ihu ya na soshal midia."

"Mana enyela m BBC Igbo ikike ka ha gosi ihu ya n'onyonyo a."

Oge akụkọ a wuru na soshal midia n'ọnwa Febrụwarị 2022, ọtụtụ kwuru na Jasmine na-alụ nwoke a n'ihi ego ya, maọbụ n'ihi na ọ chọrọ inweta akwụkwọ iji gafee mba Amerịka.

Ọtụtụ kwukwara na ọgaghị ete aka mmadụ abụọ a ekewaa.

Mana Jasmine kwuru na ịhụnanya ya na di ya siri ike nke ukwuu.

"Onweghị ihe ga-adị ka obi mgbawa na ọlụlụ di na nwunye anyị, naanị obi aṅụrị na ihe ọma ka anyị ga na-enwe," ka o kwuru.

Ndị mere akụkọ a bụ Nnamdi Agbanelo na Chukwunaeme Obiejesi.