Igbaegwuregwu Masquerade: Etu mmọnwụ Igbaegwuregwu si egbochi ụmụokoroọbịa ime mpụ n'obodo

Aha onyonyo, Igboegwuregwu Masquerade: Etu mmọnwụ Igboegwuregwu si egbochi ụmụokoroọbịa ime mpụ n'obodo

Mmọnwụ Igbaegwuregwu e hiwere n'ọgbọ afọ 1940 bụ maka iji nye ndị mmadụ obi aṅụrị nakwa ime ka ndị ntoroọbịa sepu aka na mpụ dị iche iche.

Ọ bụ otu mmọnwụ na-agbakaarị egwu n'oge emume dị iche iche n'Anambra Steetị.

Mana ugbua, ọ dị ka a ga-asị na ọgbara ọhụrụ ewerela ọnọdụ nke mere ka ọ bụrụ naanị otu ọgbọ n'obodo Umuchu dị n'Anambra Steetị na-eti ya bụ mmọnwụ.

Ụfọdụ ndị so n'otu mmụnwọ a kọwaara BBC Igbo ihe Igbaegwuregwu bụ nye ha nakwa etu o si akpalite mmụọ ha.

Ha gosikwara etu e si eti ya bụ mmọnwụ Igbaegwuregwu site n'iti ịgba nakwa ite egwu ọdịnala na-eso ya.

Otu onye okenye so n'otu ahụ kọwakwara etu mmọnwụ Igbaegwuregwu si malite nakwa uru ọ bara n'obodo nke gụnyere ime ka ndị ntoroọbịa sepu aka n'ime mpụ.

Gịnị bụ Igbaegwuregwu?

Otu onye okenye so n'otu Igbaegwuregwu bụ Nze Pius, sị na ọ bụ mmọnwụ a malitere iti n'afọ 1943, n'obodo Nise dị n'Anambra Steetị ma gbasawa n'obodo ndị ọzọ.

Ọ sị na mgbe ndị nna nna ya tiri mmọnwụ Igbaegwuregwu na ọ dị mmọnwụ asaa dị n'obodo dị iche iche dịka Nise, Umuchu, Awkuzu na ndị ọzọ.

Nze Pius sị na aha e ji maara onye na-eyi mmọnwụ ahụ n'onwe ya bụ 'Chinelo' "Mgbe ọbụla e tiri mmọnwụ a, ihe a na-ele anya bụ ma Chinelo ọ pụtala n'ọgbọ?"

Ọ sị n'ime obodo asaa ahụ na ọ bụ naanị Umuchu ka na-eti mmọnwụ Igbaegwuregwu.

"Mgbe m gara Awkuzu iti mmọnwụ Igbaegwuregwu, a sị m na ọ dịghịzi ugbua".

Ọ kọwara na ọ bụ naanị ndị nwoke na-eti mmọnwụ a dịka ha si mụta n'aka ndị nna nna ha ochie.

Otu nwokoroọbịa a kpọrọ Nze Ogbuefi so n'otu a sị na mmọnwụ Igbaegwuregwu na-eme ha obi ụtọ, ịdị n'otu nakwa ịmụta ihe n'aka ndị okenye.

Kirie ihe ha kwuru n'uju;