Arochukwu tourist attraction: Lee ogogo 79 ndị ohu ruru ihe kariri afọ narị anọ gara aga n'Arochukwu

Arochukwu dị agbata oke Akwa Ibom na Abia steeti mana ọ dị n’ime Abia steeti nke Naịjirịa.

Arochukwu nwere otutu ihe nwereike ịrata ndị na-eme njem nleta.

Ihe ọtụtụ jiri mara ya bụ maka arụ ndị Igbo a na-akpọ Ibin Ukpabi bụ nke Bekee “Long Juju”.

Mana e nwekwara ọtụtụ ihe ndị ọzọ nwereike ịrata ndị mmadụ n’obodo ahụ nke gụnyere Olụ nat okoroji bụ dike ama ama mgbe gboo maka ike ọ kpara mgbe ndị Aro gbara ohu.

Ihe ọzọ bụ ogogo iri asaa na itoolu bụ ebe ndị ohu ruru ihe karịrị narị afọ anọ (400 years).

I ru ya bụ ogogo bụ ihe e jiri taa ụfọdụ ndị ohu na-enupuisi ahụhụ mgbe ahụ.

Agbanyeghị na ana ekwu na ọnweghị ụzọ e si gawa Aro di nso, enwere ọtụtụ ihe agbaochie nwereike ịrata mmadụ ebe ahụ.