AMAA Award: 'Nollywood tinyere Naịjiria n'ihu mba ụwa' - Peace Anyiam-Osigwe

Aha onyonyo, AMA AAward: Nollywood tinyere Naigeria n'ihu mba ụwa

Peace Anyiam-Osigwe bụ nwaada Igbo a ma ama n'ime ejije nke Nollywood kọwara BBC Igbo ka ya na ije siri malita na ọrụ ejije.

Peace si na nne ya tụrụ anya na ya ga-abụ ọkaikpe, mana uche ya niile dị na ịme ejije, o kwukwara na nna ya kwadoro ya bụ atụmatụ.

Ọ sị na ka ya malitechara ịrụ ọrụ ejije, na ya gachiri azụ n'ụlọakwụkwọ ịga mụọ maka ịbụ ọkaikpe.

Ọ gwara BBC Igbo ka o si hibe emume nturuugo bụ AMAA Awards.

Gee ya ntị n'uju.