You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Professor Charles Chukwuma Soludo: Ihe i kwesịrị ịma maka onye ga-achị Anambra steeti
Charles Chukwuma Soludo bụ onye na-azọ ọkwa gọvanọ Anambra steeti n'okpuru pati APGA.
A mụrụ ya n'ụbọchị 28 nke ọnwa Julaị 1960, n'ezinaụlọ Nze Nwankwo Simeon Soludo na Oriakụ Mgbafọ Soludo, nke obodo Ụmụeze dị n'Isuọfịa, n'okpuru ọchịchị Agụata dị n'Anambra steeti.
Ọkammụta Soludo kọwarala anyị ihe dị n'ime aha otutu ya bụ 'Charley Nwa Mgbafọ'.
Soludo gụtara asambodo ọkammụta n'ihe gbasara Akụnaụba obodo (Economics) na mahadum Naịjiria dị na Nsukka ma na mahadum ndị dị na mba ofesi, chịrị ụlọakụ kachasị na Naịjiria bụ Central Bank of Nigeria site n’afọ 2004 ruo 2009.
Ya na nwunye ya bụ Nonye Queen Frances Soludo mụtara ụmụ isii.
Ka ọ dị ugbua, Soludo na-emeri n'okpuru ọchịchị iri na otu (11) n'ime iri abụọ na otu (21) dị n'Anambra steeti ugbua, dịka ụlọọrụ Inec si kpọpụta.
Nke a abụghị mbụ ọ na-apụta ịzọ ọkwa gọvanọ n’Anambra steeti dịka ọ nwara n’afọ 2010 n’okpuru PDP, mana Peter Obi meriri ya.
Ọ nwakwara n’afọ 2013 n’okpuru APGA, mana ndị nnyocha otu pati ahụ kwuru na o tozughi.