Nnamdi Kanu: A gaghị akpọta ya n'ụlọikpe oge eyigharịrị ya bụ Nọvemba 10 - Aloy Ejimakor

Aha onyonyo, Mkparịtaụka: Nnamdi Kanu: Ihe mere mba Briten ahụbeghị ya na mkpọrọ DSS - Aloy Ejimakor

Dịka ha gachara ulọikpe n'ụbọchị 21 nke ọnwa Ọktoba 2021, ọkaiwu Aloy Ejimakor na BBC Igbo nwere mkparịtaụka pụrụiche.

Na mkparịtaụka ahụ, ọ kọwaara ihe mere o Ji kwuo na ndị ọ na-anọchịte anya ha n'ụlọikpe na-eyi ndụ ya egwu, ma kwukwaa na ha amatala ndị na-eme ya.

Ọ bụrụ na Kanu nụ ka na aka ndị a dị na ya, obi agaghị adị ya mma.

O tinyekwara ọnụ n'ọnọdụ ịga hụ Nnamdị Kanu n'ebe ọ nọ n'aka ndị "Department of State Services" (DSS).

Ọ sị: "Onye obụla chọrọ ịga nwere ohere ịga hụ Nnamdi Kanu ugbua, dika ọkaikpe Binta Nyako siri kwuo, mana onye ahụ ga-abịa tinye akwụkwọ n'aka anyị."

Ihe ọzọ o kwuru metụtara atụmatụ mba Briten nwere ịga hụ Kanu.

Kirie ihe o kwuru n'uju;