Chioma Ajunwa Olympics: E nye m ohere ịzụ ndị Naịjirịa maka Olympics, ihere agaraghị eme ha
Chioma Ajunwa bụ nwafọ Naịjirịa mbụ ritere ọlaedo n'ịgba ọsọ Olympiks etinyela ọnụ n'ihe ndị na-agbara Naịjirịa ọsọ na-agabiga ugbua.
Ọ sị na ihe butere mmechu ihu a ọkachasị n'egwuregwu Tokyo Olympiks nke 2020 na-eme ugbua na mba Japan bụ maka e nweghi ezi ndị nchịkọta.
Ajunwa gaara n'ihu kọwaa ihe e nwere ike ime ka e weghachite Naịjirịa n'ogogo mbụ n'egwuregwu.
Kirie ihe o kwuru n'uju.
Ndị mere akụkọ a bụ Chiagozie Nwonwu na Nnamdi Agbanelo

