Imo State Security: Udo, azụmaahịa na ịkụ ngwọrị alọghachịla n'Owere - Komishọna Uweojii

Kọmishọna ndị uweojii n'Imo Steetị bụ Abutu Yaro sị ndị ọrụ nchekwa eweghachịla udo n'Owere nakwa mpaghara Imo Steetị niile.

O kwuru nke a na-agbarịta ụka ya na BBC Igbo nwere n'Owere.

Ọ sị na ndị omekome ọgbara ọhụrụ nwere ngalaba dị iche iche ha na-eji akparụ ha, nke gụnyere ndị oti mkpu na ndị ọkaiwu.

Na ọ bụ etu a ka o si kwụrụ na ndị omekome na-akpa ike n'Imo kama na ọ bụ ihe ezigbo ụmụafọ Imo Steetị chọrọ.

Yaro sị na dịka ọ dị ugbua na udo, azụmaahịa, ịkụ ngwọrị alọghachịla n'Owere.

Ọ gaara n'ihu kwuo na ya onwe ya gakwara kụọ ngwọrị bụ ebe ọ tara ngwọcha iji gosi na udo alọghachịla.

Kirie ihe o kwuru n'uju: