Africa Eye Migrants: Ihe anya anyị na-ahụ dịka anyị n'esi ọzara agbaga mba ọzọ
Kwa afọ ọbụla, ndị Ethiopia ruru puku kwuru puku na-eji ụkwụ agbaga Saudi Arabia.
Ọ bụ kilomita puku abụọ (2,000) ka ọ dị i si Ethiopia ruo Saudi Arabia.
Ụfọdụ ndị na-eme njem a kwuru na n'ọtụtụ mmadụ na-anwụ tụpụ ha gaa njem ahụ ọkara.
Ha na-elikwa ha ozigbo n'ebe ha dara na njem ahụ e si ime ọzara aga.
Ndị mbiarambiara kwuputere ọtụtụ ihe ndị zoro ezo anaghị agwa mmadụ tupu ọ malite ya bụ njem ka ha wee gbara udiri njem ahụ ọsọ.