Nigeria's inflation 2021: Etu 'inflation' si akpa mụ na gị eze

Na nsonso a, ngalaba ngụkọ Naijiria bụ National Bureau of Statistics(NBS) wepụtara ozi nchọpụta ha mere nke kwuru na ọnụahịa(inflation) e jirila pasent iri na asatọ na ụma(18.17%) rịa elu.

Nke a bụ mgbali kachasị kemgbe afọ anọ gara aga.

Dịka nchọpụta NBS mere siri kwuo, ihe ndị kachasị tinye ego bụ ngwanri(23%) ọkachasị, anụ,azụ, ji,nduku,bredị,mmanụ akwụkwọnri na mkpụrụosisi.

Ọkachamara n'okwu nchọpụta metụtara iji ego achụego jiri osikapa kọwaa ihe ọ pụtara inwe 'inflation' site na ịgbakọ ihe ọ na-eri isi osikapa jelọf ga-ezuru otu ezinaụlọ mmadụ anọ n'afọ 2021 nakwa ihe o riri ime nke a n'afọ anọ gara aga.

Ha kwụkwara ihe e nwere ike ime iji gboo ya bụ ọgụ mgbalielu ọnụahịa.

Lee ya n'uju n'elu:

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: