World Water Day 2021: Ihe na-acha ọbara ọbara ma n'esi isi agbarụọla mmiri Nvụna na Nomeh, Enugwu Steeti

Aha onyonyo, Ihe na-acha ọbara ọbara ma n'esi isi agbarụọla mmiri Nvụna n'Nomeh Enugwu Steeti

Ndị Nomeh na Nkanu East dị n'Enugwu Steeti nọ na nsogbu ịta nkịkịrị eze ugbua n'ihi na nanị otu mmiri ha na-aṅụ bụ Nvụna na-achazị ọbara ọbara ma n'esi isi.

Ihe izizi onye ọbụla bịara na mmiri Nvụna ahụ ga-achọpụta bụ na ya bụ nnukwu mmiri na achazị ọbara ọbara, ụfọdụ ebe na-acha oji oji, ọ na esi isi nke ukwuu, ebe anụmanụ niile nọ na ya dịka azụ na agụ iyi, nwụrụ anwụ.

Ndị Nomeh tiri nkpu gwa BBC na ha nọzị na nnukwu ụkọ mmiri, n'ihi na ya bụ mmiri Nvuna bụ ebe ha si aṅụ mmiri, asa akwa, esi nri, nakwa ihe niile eji mmiri eme n'ihi na ha enweghị mmiri tapụ na be ha.

Ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị gwara anyị okwu kwuru na ya bụ mkpa mkpa mere na ụbọchị tuzde 15th Marchị 2021 oge ha pụtara n'ụtụtụ ikuta mmiri were hụ na mmiri ha adịghịzị ọcha, kama ọ na achazị ọbara ọbara ma na esi ajọ isi.

Onye ọbụla jiri ọsọ gbapụ ebe ahụ. Ka ọ dị ugbua, ya bụ mmiri na achazị oji oji ma ka na esikwa isi.

Oti nwoke Nomeh kwuru na ha na eche ma onwere ka esiri wunye kemịkalụ adịghị mma na ya bụ mmiri. Ha kwukwara na ha ezipụla ọtụtụ mmadụ ka ha gaa n'obodo bụ agbata obi ha dịka Ituku iji mara ebe odachi ahụ siri bido.

Ha na-ayọkwa gọọmenti la ọhnatar ha ọsọ enyemaka makana ka mgbe mmiri Nvuna mebiri ha na azụzị 'pure water” nke otu akpa mmiri bụzị N20, nnukwu akpa N200.

BBC gakwara na ụlọ Igwe ndị Nomeh bụ Rtd.It. Col. ION Mbachukwu mana ọnọghị n'ụlọ ya. Anyị agbaala mbọ ịnweta ya bụ onye eze n'ekwe ntị ya mana ọmịtaghị mkpụrụ.

Onye mere akụkọ a bụ Ebere Ekeopara